Marriage Secrets: Ihe ise nwaanyị ekwesịghị ịgwa di ya na-agbanyeghị ụdị ịhụnanya o nwere n'ebe ọ nọ

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Adedayo Owolabi
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist

Alụmdi na nwunye bụ ihe dị oke mkpa nye ndị Igbo, otu ihe e jiri mara ndị Igbo bụ na ha na-akwanyere alụm dị na nwunye ugwu.

Mana ihe a na-ahụ ugbu a bụ na ọtụtụ alụm di na nwunye na-agbasakaarị maka ọtụtụ ihe, gụnyere esemokwu na-enweghi isi.

Eeh! E kwesịghị inwe okwu zoro ezo n'etiti di na nwunye, mana e nwere ihe nwaanyị na-ekwesịghị ịgwa di ya n'agbanyeghị ka o si hụ di ya n'anya.

Aha onyonyo, Ama m na chim ga-enye m di nke m - Nwaanyị lụru di na nka

Ọ bụrụ na nwaanyị achọghị mmechu ihu, e nwere ọtụtụ ihe o kwesịrị ime. Ha bụ:

1. Mmadụ ole ya na ha dinara tupu ya na di ya amara onwe ha.

I kwesighi ịgwa di gị mmadụ ole gị na ha dinara tupu unu amata onwe unu.

Nke a bụ maka na unu nwee nsogbu ọbụla n'etiti unu, o nwereike ji maka ya kọọ gị ọnụ.

Ebe foto si, Getty Images

Ọ jụọ gị mmadụ ole gị na ha yiri, jiri ọchị chịtuo akụkọ ahụ ma lefere anya ma sị ya "O nwere ihe ọ ga-emere anyị n'ije ihunanya anyị".

Aha onyonyo, O nwere ihe o mere ma nwaanyị jụọ nwoke ọlụlụ?

2. Ihe nzuzo ị ma maka di maọbụ onye gị na ya yiri na mbụ:

Agwachala ya ihe niile ị ma maka di gị maọbụ ọyị gị nwoke gị na ha kpaburu tupu ị mata ya.

Emekwala eme gwa di gị ihe ga-eme ka obi dị ya ka ọ bụ onye njọ maọbụ otozughị ịbụrụ di gị ma ọbụ enyi gị nwoke.

Ekwukwala maka ụdị ego ị chọrọ ka o nwe maọbụ ikikere ya n'elu akwa.

Aha onyonyo, Aeroplane House: Nwoke ji maka ịhụnanya rụọ ụlọ ụgbọelu

3. Agwakwala di gị maka ụdị ihunanya i nwere ebe enyi ya nwoke maọbụ nwanne ya nọ.

Ọ bụrụ na nwunye hụ nwanne di ya maọbụ enyi di ya n'anya, ọ baghị ya uru ka ọ gwa di ya.

Nke a bụ ihe ọzọ o kwesighị ịgwa di ya, o kwesịrị i kwanyere onwe ya ugwu, wepụ anya ebe ha nọ, tinye obi ya na ihunanya niile ebe di ya nọ. Na-emeghị etu a nwereike ibute nsogbu n'etiti di na nwunye.

4. Agwakwala di gị na ị kpọrọ nne ya maọbụ ezinụlọ ya asị na-agbanyegi ihe ị gabigara n'aka ha.

Na-agbanyegị ka nne di gị kpasuoro gị agwa, emekatala eme gwa di gị na ị kpọrọ ya asị. Etu a ka i ga-emekwa ụmụ nne ya na-agbanyeghị ihe ị hụrụ n'aka ha, maọbụ etu iwe si juo gị n'obi. Ị ga-akwanyere ha ugwu dịịrị ha.

Esemokwu dapụta n'etiti gị na ndị be di gị, jiri nwaayọọ kọwara di gị, ọ ga-aghọta mwute gị n'esemokwu ahụ.

Di gị ga-enyekwa gị aka ị gbomkpaa.

5. Ejikwala ọnụ gị kwuo maka ịgbara di gị alụkwaghịm

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Di na nwunye irikọ nri na egosi ihunanya

Dịka ndị ọkachamara n'ihe gbasara alụmdi na nwunye kwuru, ụbọchị ọbụla i kwuru maka mgbasa n'etiti gị na di gị bụ ụbọchị i jiri aka gị tọọ ntọala mgbasa unu. Alụmdi unu ga-esi ụbọchị ahụ gbawa ụka.

Ikwupụta maka mgbasa unu pụtara na obi gị apụọla n'alụmdi unu. Ọ bụrụ na ọ bụ alụmdi ọgụ na mgba, biko emekwala eme chere. Mana ọ bụghị etu a, gbaa mbọ lee ka unu naabọ nwereike iji kpee ezi udo n'etiti onwe unu.