Ipob Sit At Home: Etu Ebonyi, Umuahia, Owerri, Awka na ndị ọzọ dị taa

Nkọwa foto, Ụfọdụ ụlọahịa emepeghị n'Ebonyi steeti

Dịka ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) tinyere iwu onye ọbụla ịnọ n'ụlọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, ụfọdụ rubere isi ebe ndị ọzọ na-agara mkpa ha.

Obodo dị iche iche gụnyere Ọka na Owere nwere ndị kwere na ndị ekweghi.

Ọka

N'Ọka, ụfọdụ ụlọahịa mepere, ụfọdụ ụgbọala nakwa keke na-ebu ndị mmadụ na-agba na-enweghi nsogbu ọbụla.

Nkọwa foto, Onye na-ere ahịa ya n'Eke Ọka
Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị mmadụ na-agagharị n'Ọka
Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị agbapeghi ụlọahịa ha n'Ọka
Nkọwa foto, Etu Ọgbọ Olu (ọdọ ndị ọrụ aka) dị n'Ọka dị n'ụtụtụ Mọnde.
Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-agara mkpa ha n'Aroma Junction dị n'Ọka
Nkọwa foto, Keke na-agba n'ụzọ Zik Avenue nakwa Eke Ọka
Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị mmadụ na-agagharị n'Ọka
Nkọwa foto, Ahịa Nkwọ Amaenyi

Cheta na ndị Ipob sị na ha tinyere iwu ịnọ n'ụlọ a iji mee ka gọọmentị nụ olu ha ma tọhapụ Nnamdi Kanu bụ onyendu ha gọọmentị nwụchiri n'ọnwa Juun, 2021.

Owere

Nkọwa foto, Ụzọ Owere-Okigwe na-ekwokarị ekwo tọgbọ chakoo n'ụtụtụ Mọnde
Nkọwa foto, Etu ụzọ Dick Tiger dị nso MCC dị n'ụtụtụ Mọnde.

Ụmụahịa

Ndị Ụmụahịa na-agara mkpa ha na-enweghị nsogbu ọbụla.

Nkọwa foto, Ndị Ụmụahịa na-agara mkpa ha
Nkọwa foto, Ọdọ ụgbọala dị iche iche mepere n'Ụmụahịa dịka ndị mmadụ na-agara mkpa ha
Nkọwa foto, Ndị na-anya keke na-agara mkpa ha n'Ụmụahịa

Ebonyi

N'agbanyeghi ihe gọvanọ Dave Umahi kwuru maka ịta ndị ahịa na ndị ọrụ na-agaraghị mkpa ha ahụhụ taa, ụfọdụ ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ.

Nkọwa foto, Ndị ọdọụgbọala mechiri emechi n'Abakaliki, Ebonyi steeti

Ebe foto si, BBC Sport

Nkọwa foto, Ụfọdụ ọdọụgbọala emepeghi n'Abakaliki
Nkọwa foto, Ụfọdụ ụlọahịa mepere n'ọdọahịa Margaret Umahi, ebe ndị ọzọ mechiri emechi

Ihe Gọvanọ Umahi sị ọ ga-eme ndị gere ntị n'iwu 'sit at home'

Ebe foto si, EbonyiOnline

Dịka ndị mmadụ ka na-erube isi n'iwu ịnọ n'ụlọ (sit at home) nke Ipob tinyere n'Ọwụwa Anyanwụ, gọvanọ Dave Umahi bụ onyeisi ndị gọvanọ mpaghara ahụ agbarụọla ihu maka ya bụ iwu.

Umahi nyere iwu sị ka ndị ọrụ gọọmentị niile nọ na steetị ya bụ Ebonyi gaa ọrụ dịịrị ha, na a ga-achụ onye ọbụla gbajọrọ ọrụ ya.

Ọ gara n'ihu sị ka ndị isi ụlọọrụ gọọmentị na-edekọ aha ndị bịara ọrụ na ndị na-abịaghị ọrụ.

Umahi nyekwara iwu sị ka ndị na-ere ahịa na ndị ọrụ ụlọakụ gaa ahịa ha, ma ọ bụghị ya gọọmentị ga-anapụ ha ụlọahịa ha.

Ọ sị ka ọhaneze gaa mkpaa dịịrị ha na ndị ọrụ nchekwa ekeela nkwụcha ichekwa onye ọbụla.

Aha onyonyo, Ihe Simon Ekpa gwara BBC IGbo maka ọchụchụ nwere onwe Biafra