Nigerian Passport: Lee ebe ị nwereike gaa nata 'Passport' ọhụrụ gị n'ala Igbo
Ebe foto si, Twitter/Nigeria Immigration Service
Dika onyeisi ngalaba na-ahu maka njem na Naijiria bụ Nigeria Immigration Service kwuru, emepeela websaịt eji akwụ ụgwọ ndị chọrọ akwụkwọ njem ọhụrụ. Ime mkepsa nara akwụkwọ njem a ga-ebido n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Juun, 2021.
Lee kwa ebe nịịle n'ọwụwa anyanwụ Naijiria ebe ị nwere ikike ịga nwete akwụkwọ njem ọhụrụ gi:
- Abia Passport Office - 72 School Road, Umuahia
- Anambra Passport - Command Headquaters, Awka
- Ebonyi Passport Office - 2 Afor Ezuna Road Abakaliki
- Enugu Passport Office - Federal Secretariat, Ogui Layout Enugu
- Imo Passport Office - Onitsha Road, Federal Secretariat Owerri
Lee kwa usoro eji anara akwụkwọ njem ọhụrụ na Naijiria:
- Onye ọbula chọrọ ịnara akwụkwọ njem ga-aga na websaịt ndị ngalaba na-ahụ maka njem
- Onye ahụ ga-etinye aha ya, foto ya nakwa akara ndi ozo di mkpa maka nyocha. Etinyekwa teknzu eji anara ozi makwa zaa ajụjụ obula onye chọrọ inara akwụkwọ nwere na websaịt ahu
- Akwụkwọ gi na akara gi gafecha nyocha, ị nwezikwara ikike iga na websaịt ahụ kwuputa ubochị n'ebe ị ga-acho ime ajụjụ ọnụ nke kachasi diri gị mfe
- Oge nara akwụkwọ njem ga-abuzikwa izu ise maka onye chọrọ inara akwụkwọ njem ahụrụ makwa izu atọ maka onye chọrọ igbanwe akwụkwọ njem ya
- Agaghi ekwe onye obula na agabeghi na websaịt ndi ngalaba na-ahu maka njem tinye akara ya banye na oba nnara akwụkwọ obula n'ala Naijiria
- Mgbe ejiri mechaa akwụkwọ njem gi, ndị ụlọọrụ Nigeria Immigration Service ga-ezitere gị ozi sịte n'akara ekwentị gị maobụkwanu akara ozi-e nke bekee na akpọ 'email'
- Obukwura na ikwere mkpesa obula maka usoro naara akwụkwọ njem gị, inwere ikiki izigara ndị ulo oru NIS n'ichafụ ozi sịte na akara ekwe ntị ha.
Isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available
{{rankTranslation}}