Ugo Ugochukwu: Ihe i kwesiri ima gbasara nwa Oluchi Onweagba-Orlandi

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ugo Ugochukwu bụ nwa onye ngosi(model) a ma ama bụ Oluchi Onweagba-Orlandi na di ya bụ Luca Orlandi.

Ọ bụ nwadịala malitere ịnya ụgbọala ọsọ n'ezigbo oge.

Ugo gbara sọsọ afọ iri na atọ abụrụla otu nwatakịrị n'ewu ewu ugbu a dika ụlọọrụ 'McLaren Racing' zụrụla yi ka onye ga na-agbara ha ọsọ ụgbọala.

Ugo nwetala nturugo mmeri na mba Amerika nakwa Europe site n'ima aka asọmụmpi FIA OKJ European Championship e mere n'afọ 2020.

Kedụ afọ mụrụ ugo a?

Nne ya Oluchi Onweagba bụ nwada Igbo mba ụwa ji eme ọnụ dika ọ chakere site na ime ihe onyonyo iga ije nganga 'modelling' bido mgbe ọ gbara afọ iri na isii.

Oluchi na-ere ahia mbugari na Leg os tupu akara aka ya chakee ka o sonyere n'asompi 'Nokia Face of Africa' n'afọ 1998 ebe o meriri were site ebe ahụ bụrụ onye a ma ama n'ụwa dum.

Di ya bụ Luca Orlandi bụ onye o zutere n'ọrụ ya bụ onye Italị a ma ama n'ọrụ ịdụ akwa ndị nwere agba, bụ ọrụ e jirila mara ezinaụlọ ha agbụrụ kwuru agbụrụ.

Ọ bụ ya nwe ụlọrụ na-adụ akwa azụrụ eyiri ụmụnwaanyị a kpọrọ Luca Luca' nke ọ malitere n'afọ 1991.

Nne ya bụ Oluchi kele Chukwu n'ụzọ pụrụ iche n'ihi isiọma nwa ya nwetara ste n'aka ụlọọrụ "Mclaren Racing':

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị ha: