You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Yangy rape case: Ihe uweojii kwuru maka nwa akwụkwọ a sị wakporo ụmụnwaanyị 24
Kamgbe akụkọ Omozuwa Uwavera, nwagbọghọ Mahadum Benin a wakporo ma gbuo pụtachara ka akụkọ mwakpo malitere ịrị ibe elu na Naịjirịa.
Ọtụtụ ụmụnwaanyị na-apụtazi na soshia midia na-akọ nakwa akpọ aha onye wakpọrọ ha n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ.
N'ime mkpughie niile a, o nwere otu nwaokoroọbịa ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị a kpụ n'ọnụ na ọ wakporo ha n'ụzọ di iche iche.
Nke a mere aha na foto nwamadị a ji na-ewu na soshal midia dịka ụmụ Naịjirịa tinyere ọnụ n'okwu sị ka ndị uweojii gaa nwụchie ya.
Ụmụnwaanyị a dị iri abụọ na anọ boro ebubo na nwaokoroọbịa a kpọrọ Yangy wakporo ha n'otu n'otu.
Ha sị na ọ bụ nwata ụlọakwụkwọ Mahadum Babcock dị n'Ogun Steeti ma biri n'obodo Pọthacọt dị na Rivers Steeti.
Mana akụkọ pụtara n'Instagram ebe nwokoroọbịa a pụtara kwuo na aka ya adịghị n'ebubo ahụ.
BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Rivers Steeti bụ Nnamdi Omoni, onye kwuru na ha anụbeghi maka nke a.
Ọ sị na o nwebeghi onye bịara mee mkpesa banyere ya, na o nweghi ihe ọbụla ha ga-eme maọbụrụ na mkpesa abịaghị.
N'otu aka ahụ ọnụ na-ekwuru Mahadum Babcock bụ Joshua Suleiman gwara BBC Igbo sị na onweghi okwu ha nwere banyere nke ahụ ugbua.
Suleiman jụrụ ikwu ma nwaokoroọbịa (Yangy) ọ bụ nwata akwụkwọ ha kaọbụ na ọ bụghị.
Kama ọ sị na mgbe ọbụla ụlọakwụkwọ Babcock nwere okwu na ha ga-eme ka ọha mara.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: