Coronavirus in Nigeria: Lee azịza ajụjụ ndị na-anụ gị ọkụ n'obi

Akụkọ maka ọrịa Coronavirus ịbata na Naịjirịa abụghịzị akụkọ ọhụrụ, mana mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na Naịjirịa ekwuola ka obi ghara ịmapụ onye ọbụla.

Dịka ọrịa a na-efesa n'akụkụ ụwa niile, ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ya bụ ọrị na-agbasa n'ikuku, nke Bekee kpọrọ 'airborne disease'.

Mana nke a abụchaghị eziokwu. Lee azịza niile otu ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO) nyere gbasara ọrịa coronavirus.

Gịnị bụ coronavirus maọbụ COVID-19?

Ebe foto si, ROGER HARRIS/SCIENCE PHOTO LIBRARY

Coronavirus bụ ezinaụlọ nnukwu nje na-ebute ọrịa nke gụnyere oyi nkịti nakwa ọrịa ndị ọzọ.

Ọrịa ndị ọzọ si n'ezinaụlọ coronavirus a bụ Severe Acute Respiratory Syndrome bụ SARS n'ịchafụ (nke si na buusu malite) nakwa Middle East Respiratory Syndrome bụ MERS n'ịchafụ (si na Kamel), mana amabeghi ebe nke ọhụrụ a si malite.

COVID-19 bụ aha a gụrụ ọrịa coronavirus ọhụrụ nke si n'obodo Wuhan dị na mba Chaịna malite n'ọnwa Disemba 2019.

Kedụ etu COVID-19 si agbasa?

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Imetụ nje coronavirus aka na-amaghị ama, ma were aka ahụ hie n'anya gị, maọbụ metụ n'imi maọbụ ntị gị, ọrịa ahụ ga-efe gị

Ị nwere ike ibute ọrịa a site n'aka onye bu ya.

Ọ bụrụ na onye bu ọrịa a maa uzere maọbụ kwaa ụkwara, nje ahụ nwere ike ịdakwasị n'elu ihe ụfọdụ.

Onye ọzọ metụ ihe ndị ahụ nje dakwasara aka ma tinyekwa aka ahụ n'anya, n'ọnụ maọbụ n'imi ya, nje ahụ efeela ya.

Aha onyonyo, Olu onye Naịjirịa nọ na China na-ekwu maka ihe ha na-agabiga n'ihi Coronavirus

Mmadụ nwekwara ike ikute ọrịa a n'ume ma ọ bụrụ na o kuru ume onye bu ọrịa a mapụtara n'uzere maọbụ kwapụtara n'ụkwara.

Ya mere, ọ dị mkpa ka ị nọtee onye ọbụla na-arịa ọrịa aka ihe ruru nzọụkwụ atọ ma ị kwụrụ n'akụkụ ya.

Otu WHO ka na-emekwa nnyocha iji chọpụta ma o nwere ụzọ ọzọ ọrịa a si agbasa na-abụghị ụzọ ndị e depụtara ebe a.

Kedụ ihe ga-agba ama na mmadụ bu ọrịa a?

Ebe foto si, Getty Images

Ihe ndị kacha agba ama ọrịa a bụ ahụọkụ, ike ọgwụgwụ nakwa ụkwara nta.

Dịka WHO si kwuo, ụfọdụ ndị mmadụ na-enwekwa ahụ mgbu, azụzụ, ọnya akpịrị nakwa afọ ọsịsa, ụfọdụ bụkwa ndị ọ na-ara ahụ iku ume.

Ha kwukwara na ọ bụghị mmadụ niile bu ọrịa a na-egosiputa ihe mgbaama niile a, ebe ọ na-abụghị mmadụ niile na-anata ọgwụgwọ tupu ha agbakee.

Ha kwuru na ọrịa a kacha emekpa ndị agadị nakwa ndị nwere ọrịa dịka ọbara mgbalielu, ọrịa obi maọbụ ọrịa shuga, ahụ.

Kedụ etu m ga-esi echekwa onwe m ma gbochie mfesa ọrịa a?

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Were ncha na-akwọ aka gị oge niile

Gbado anya n'ihe ekwe na-akụ gbasara ọnọdụ ọrịa a site n'ọbaozi ndị kwesịrị ntụkwasị obi maka ntaakụkọ.

Ndị dịka WHO, mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na Naịjiria nakwa mịnịstrị ahụike nke ebe i bi.

Ihe ndị ọzọ ị ga-emenwu gụnyere:

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Were nkwọcha aka pụrụ iche a kpọrọ 'hand sanitizer' na-edebe aka gị ọcha
  • Kpuchie imi na ọnụ gị mgbe ị na-akwa ụkwara maọbụ na-ama uzere.
  • Gbado anya, mara etu gị na onye na-akwa ụkwara maọbụ na-ama uzere si emekọrịta
  • Jiri mmiri na ncha na-akwọ aka gị kwa mgbe kwa mgbe makana ọ ga-enyere aka igbu nje ndị nwereike ịdị gị n'aka.
  • Zụta ncha pụrụ iche e ji edobe aka ọcha bụ nke bekee kpọrọ 'hand sanitizer'.
  • Gbaa mbọ hụ na e siri akwa na anụ ị na-eri ọfụma tupu i rie ya.

Na gburugburu mbaụwa niile, ọrịa coronavirus egbuola ihe karịrị mmadụ puku abụọ na narị asatọ.

Ihe ruru mmadụ puku iri asatọ bukwa ya bụ ọrịa ugbua.

Mana oziọma dị na ya bụ na ihe ruru mmadụ puku iri atọ esila na ya bụ gbakee.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ọchịchị Jonathan chiri 'insecurity' Igwe na Naịjirịa - Mbaka