Buhari in Japan: Ipob na-erugharị na Japan na-achọ Buhari

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị otu "Indigenous People of Biafra" (Ipob) na-ekwu na soshal midia na ha ahụbeghi onyisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari n'ọgbakọ a na-eme na Japan.

Nke a na-abịa dịka mba Japan na-ahazị ọgbakọ a kpọrọ 'Japan Tokyo International Conference on African Development' (TICAD) nke ugboro asaa ya.

Ndị otu Ipob bi na Japan gara na gburugburu ebe a na-eme ọgbakọ a na-ekwu n'ihe onyonyo na ha ahụghị onyeisiala Buhari n'ọgbakọ ahụ.

Mana onye enyemaka Buhari na mgbasa ozi bụ Bashir Ahmad gosiri foto na twitter ebe Buhari, Praịm Mịnịsta ndị Japan bụ Shinzo Abe nakwa ndị ọzọ nọ n'ime ọgbakọ ahụ.

N'ụbọchị 27 Ọgọst, 2019, ụfọdụ ndị otu Ipob gakwara n'ụlọ ebe onye nnọchiteanya Naịjirịa na mba Japan bi, ma mee ngagharịiwe.

Ha kwuru na ha chọrọ imebọ onyeisiala Buhari ma gosi ndị ụwa na ọ bụ Jubril Al Sudan na-achị Naịjirịa.

Cheta na onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu nyere ha iwu ka ha gbaa mbọ hụ na e mebọrọ onyeisiala Buhari na mba Japan ma ọ bịa ọgbakọ ahụ.

Buharị ga-ahapụ Japan lọtawa Naịjirịa n'ụbọchị Satọdee.

Lee foto etu TICAD7 si aga:

Akụkọ ndị ga-amasị gị: