You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Anne Njemanze sị na ọ ga-amasị ya ịlụ di nke ugboro atọ ma mụọ nwa ọzọ
Nwaada Anne Njemanze bụ onye na-eme ejije na Nollywood ekwuola na ọ dị njikere ịnabata nwoke ọzọ na ndụ ya dịka di.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ụbọchị Fraịde, 23 Ọgọst, afọ 2019, Anne kọwara etu ije alụmdinanwunye ya si gaa.
O kwuru na o ji anya ụmụaka lụọ di mbụ ọ lụrụ bụ Segun Arinze, nke ha mechara gbasaa mgbe ha mụtara otu nwa nwaanyị.
Anne bụ onye e ji aha 'Domitila' mara kwuru na agbanyeghi na ọ mụọla ụmụ abụọ, na ọ dị njikere ịlụ di ma ọ hụ nwoke dị mma.
O kwuru na obi ga-adị ya mma nke ukwuu ma ọ bụrụ na ọ mụọ ụmụejima tinyere abụọ ndị ọ mụrụla amụ.
Anne gara n'ihu dọọ ndị na-achọ alụmdinanwunye aka na ntị ka ha saa anya ha mmiri n'ịhọrọ onye ha ga-alụ.
Anne malitere ime ejije n'ime ihe karịrị afọ 20 gara aga, ebe o mere ihe onyonyo dịka 'Rattle Snake', 'Domitila' dgz.
N'ime di abụọ ọ lụrụla, Anne mụtara ụmụaka abụọ; otu nwoke na otu nwaanyị.
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri a ga-amasị gị: