Nigerian Technovation: Ụmụaka ụmụnwaanyị sekọndịrị egosiputala akaọrụ ha na Teknụzụ

Asọmpị e ji ahọpụta ụmụaka ụmụ nwaanyị sekọdịrị rụpụtara ezigbo ihe na technụzụ na mpaghara ỌwụwaAnyanwụ Naijiria amalitela n'Ọnịcha, Anambra Steeti.

Ụmụaka secọndịrị karịrị narị abụọ n'ọnụ ọgụ si ọtụtụ ụlọakwụkwọ n'Ebonyi nakwa Anambra biakọtara ọnụ were gosi ma kwuputa ihe akụrụngwa teknụzụ ha rụpụtara nke a na-akpọ "App" na-arụ.

Onye chịkọbara ya bụ ihe bụ onyeisioche Edufun Fun Stem Hub bụ oriakụ Uche Onwuamaegbu Ugwu kọwara na ọ bụ site na nkwado ndị United Nations ka ha jiri guzobe ya bụ ihe ngosi.

Nkọwa foto, Uche Onwuamaegbu Ugwu na onye nkụzị

Ugwu kwuru na ụlọakwụkwọ ọbụla ahọrọ 'App' nke ha ga-aga n'ihu nọchite anya Ọwụwa-Anyawụ na Naijiria ebe a ga-ama ndị ga-anọchite anya mba ahụ na ụwa niile.

Anyị ga-echeta na ọ bụ Uche Onwuamaegbu Ugwu họpụtara ụmụ aka ise n'ụlọalwụkwọ Regina Pacis dị n'Ọnịcha ndị nke turu ugo n'Afrịka nakwa mba ụwa niile were site na Silicon Valley USA bulatara Naijiria iko ọla edo.

Ụmụakwụkwọ Regina Pacis, - nke Uche Onwuamaegbu kuziere ihe n'Edufun Stem Hub dị n'Ọnịcha - meriri obodo dị nari na iri use wee gbaa ndị nke mbụ n'ụwa.

Nkọwa foto, Ụmụ akwụkwọ Ado Girls secondary school Ọnịcha mepụtara "app" ha kpọrọ "Albina Sense App"

Ihe ha rụpụtara oge ahụ bụ 'app' e ji ama ọgwụ adigboroja.

Ụfọdụ na ndị ụlọakwụkwọ bịara ọhụrụ na Technovation nke 2019 rụpụtara 'App' na-egosi ụzọ, App na-echekwa ndị anyarị (Albino) nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

Ụmụakwụkwọ ahụ na ndị nkuzi ha kwupụtara obi ụtọ ha isonye wee kwalite ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị na ihe gbasara teknụzụ.

Nkọwa foto, Ụmụ akwụkwọ Urban Model Secondary School Abakaliki, Ebonyi Steeti mepụtara "app" n'achọpụta nri mebiri emebi
Nkọwa foto, Uche Onwuamaegbu Ugwu bụ onye haziri asọmpị a
Nkọwa foto, Ụmụakwụkwọ Ebonyi steeti wepụtara ihe a kpọrọ "Community Data Base App"