Nigeria Customs: Lee nwoke Kọstọm e buliri elu n'ihi na ọ jụrụ ịnara akaazụ
Ebe foto si, Nigeria Customs Service/Facebook
Kọstọms ebuliela otu onye ọrụ ha a kpọrọ Bashir Abubakar maka ịkwụwa aka ọtọ.
Hameed Ali bụ onyeisi ngalaba Customs kwuru na ịgbajọ ego akazụ ahụ gosiri na ihe ga-abara oha mmadụ uru dị Abụbakar mkpa.
Abubakar gbajọrọ ihe ruru puku narị naira anọ n'ọma ndị na-ezobata ahịa chọrọ inye ya iji kwe ka ngwa ahịa ha gafere.
Ha gwakwara Abubakar na ọ bụrụ na ọ mee nke a, ha ga-enye ya ego karịrị nke a.
Abubakar jụrụ ego ahụ ma jichie igbe ahịa riri iri anọ bụ ọgwụ Tramadol abata na Naịjirịa.
Isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available
{{rankTranslation}}