Canada Immigration: Ị chọrọ 'ịgbaga' mba a?
Ebe foto si, Getty Images
Mba Kanada ekwuola na ha na-atụ anya ịnabata ihe ruru mmadụ otu nde na puku narị abụọ n'ime afọ atọ na-abịa.
Nke a emeela ka ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị Naịjiria na-achọ ma ohere ọ ga-adịrị ha.
Nke a abụghị mbụ ndị Naịjiria na-achọkwa etu ha si agafe mba Kanada.
Mgbe e yigharịrị ntuliaka e kwesịrị ime n'ụbọchị 16 nke Febrụwarị 2019, ụfọdụ ndị mmadụ malitekwara ịchọ ụzọ ha si agbaga Kanada.
O wuru ewu na soshal midia nke ọma, mere ka BBC wepụta ihe na-egosi etu ị ga-esinwu gaa (ma ike dịkwa gị o).
Isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available
{{rankTranslation}}