Ipob sị ndị otu ha nọrọ n'ụlọ ụbọchị a ga-eme ntuliaka nke 2019
Ebe foto si, Getty Images
Ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) agwala ndị otu ha niile ha nọrọ n'ụlọ mgbe a ga-eme ntuliaka nke 2019.
Onye kwuru nke a bụ Ukochukwu Udochukwu Peace mgbe ya na BBC nwere mkparịta ụka ụtụtụ Satọde.
Peace sị na ọ bụ ụzọ ha ga sị mee ka onye ọbụla kpọro ọnwe ya nwa Biafra ghara iso ga ya bụ ntuliaka n'afọ ọzọ.
Ọ sị n'Ipob ekpebịelarị kemgbe na ha agaghị eso eme ntuliaka ahụ bụ nke ha sị na-onweghị isi.
Ebe foto si, Rev Peace
Na olụ ya, "ị na-eme ihe ị na-eme kwa afọ anọ na-atụ anya ịnwete mpụtara dị iche, onwe gị ka ị na-aghọgbụ."
Ọ sị na ihe a bụ ụzọ ndị ọbụla na-ebu agha mnwere onwe ga-eso ka ụwa mara na ha kpọrọ ya ihe.
Akụkọ ga-amasị gị
Isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available
{{rankTranslation}}