Onye ntọ ṅụrụ ọgwụ ike anwụọla ka ụbọchị itoolu gachara

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Dọkịta BBC gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ya bụ onye ntọ kwesiri ịnata ọgwụgwọ

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Ondo bụ Femi Joseph agwala ndị ntaakụkọ na onye ntọ ṅụrụ ọgwụ ike anwụfụola dika "News agency of Nigeria" si depụta.

Cheta na ọ na-arahụ ụra kamgbe ndị uweojii nwụchichara ya n'Ọgọstụ 5 ebe a na-ere ọgwụ.

Joseph kwuru na onye ntọ a nwurụ n'ụlọọgwụ dị na steeti ahụ ebe ndị dọkita Bekee nọ na-agba mbọ ịgwọ ya.

N'ọnụ ya, "Onye ntọ a a na-enyocha nwụrụ ka abalị itoolu anyị jiri nwụchie ya gachara. Anyị chere na anyị ga-agwọnwu ya ka o wee nyere anyị aka na nyocha anyị na-eme, mana ọ nwụrụ ụnyaahụ.''

"Ihe a nwere ike si n'ọgwU ike ọ ṅụrụ. "Anyị ji ohere a adụ ndị nne na nna ọdụ ka ha mara ụdịrị enyi ha na-enwe."

Akukọ kwuru na onye ntọ a gara ịtọ onye na-ere ọgwụ mana onye ahụ riri mbombo ọsọ.

Ya na ndị otu ya mechara nara otu onye bụ Daudu Wale ọgbatumtum ya, ebe ọ gara ịzụta ọgwụ ebe e nwudere otu onye n'ime ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: