Nne Shekau: Ahụbeghị nwa m kemgbe afọ 15
Ebe foto si, Getty Images
Na mkparịtaụka mbụ ya na onye ntaakụkọ na-enwe, Falmata Abubakar gwara ụlọọrụ akụkọ "Voice of America" na ya amaghị ebe Shekau nọ maọbụ ọnọdụ ya.
"Amaghị ma ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ. naanị Chukwu ma. Ahụbeghị ya kemgbe afọ iri na ise."
Nne Shekau kwuru na onyeisi ndị otu oyi egwu bụ Boko Haram hapụrụ Maiduguri, isiobodo Borno steeti, oge ọ ka bụ nwata dịka "almajiri" - nwata na-achọ ị mụta nkuzi alakọba.
A mara Shekau dịka onye ndu otu kparala mkpamkpa ma gbuo puku kwuru puku ndị mmadụ na Naijiria, Kamerun, Chad na Nijia.
Shekau e jirila aka ya gbuo Otụtụ mmadụ ngụnyere ndị so n'otu ya. O mebikwara ọtụtụ obodo ma laa ọtụtụ ndụ n'iyi na mpaghatra ọdịda anyanwụ ugwu Naijiria.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available
{{rankTranslation}}