You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Gini mere Germany ji chọọ ịkpọghachị ndị Naịjirịa 30,000
Mba Germany na-akwado ịkpọghachite umu Naịjirịa 30,000 na-enweghị akwụkwo nyere ha ikike ịnọ na obodo ahụ.
Onye na-ahu maka ihe gbasara mba ofesi na gọọmentị Naịjirịa bụ Geoffrey Onyeama kwuru nkea mgbe ya na onye ndụmọdụ onyesiala mba Germany bụ Jan Hecker zukọrọ n'Abuja.
Onyeama na-akọwa na onwere nhazi ndị Germany na-eme nke ga-eme ka ahazie ndị a ga-akpọlata ngangwa.
Onyeama kọwara n'ime afọ abụọ gara aga umu Naịjirịa 30,000 kwesiri ịlọta, mana ọ bu sọsọ 200 ka a kpọlatala.
Ka nke a na-eme, BBC Igbo gara otu nwaafọ NaịjiRịa bi na Germany akpọrọ Obinna Chinweokwu ajụjụ maka ihe ọhụrụ na mba ahụ.
Maazị Chinweokwu gwara anyị na ya na-agụ akwụkwọ na Mahadụm na Germany, ebe ọ na-achọ ị nweta akwụkwọ ọkachamara nke akpọrọ PHD na asụsu Bekee.
Ọ sị na ọ bụ ndị si ụzọ mmịri bata Germany ka ihe a kachasi metụta.
Gere ya ndị ebe a: