You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị uweojii akọwala ihe IGP ejighị za oku sịnetị kpọrọ ya
Ebe ndị ụlọomeiwu nke ukwu bụ Sineti na-ewe iwe ihe mere Ibrahim Idris jirị gba ha nkiti n'oku ha kpọrọ ya, ndị uweojii na-akọwa ihe mere.
Ha dere n'ụfọdụ ozi n'elu Twitter na Idris so onyeisiala mee njem ọrụ n'ụbọchị ha ziri ya ozi ya bịa ma na ọ gbara mbọ zi ga ndị nnọchịtere ya anya.
Lee nkọwa ha ebe a:
Cheta na ndị ụlọọrụ sineti akpọkuola onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris ugbo atọ mana Ibrahim abịaghị na onwe ya chacha, kama ọ na-ezite mmadụ.
Mana ndị sineti chọrọ ịhụ ya onwe ya ka ha na-abụghị onye ọ na-ezite nke mere na ha kpọrọ Ibrahim onye iro megide ọchịchị onye kwuo uche ya, were kwukwaa na o kwesighi ịnọ n'oche ọchịchị ahụ.
N'aka nke ya, onyeisiala ndị uweojii zaghachiri iwu ahụ ndị sineti tiri ma kwuo na ya emeghị ihe ọjọọ ọbụla ma ya adakwaghị iwu ọbụla.
Ọ kọwara na osote ya bụ AIG ndị uweojii nwere ikike nke akwụkwọ nyere ịnọchite ya ebe ọbụla nakwa n'ihe ọbụla a na-eme, ya bụ na ọbụghị iwu na ọ bụ ya gara zaa oku ahụ n'onwe ya.
Ndị sineti na-akpọ ya ka ọ bịa zaa ọnụ ya gbasara ihe na-eme otu onye n'ime ha bụ sinetọ Dino Melaye bụ onye ndị uweojii nwụchiri.
Mana o kwuru na ya emeghi ihe ọjọọ ọbụla maka ndị ụlọikpe kpebiri na Melaye adịla ike ịga ụlọikpe tupu ndị uweojii akpọrọ ya gawa Lokoja ebe a kpụpụrụ ya ụlọikpe.
Ibrahim kwuru na ihe ndị sineti na-eme bụ iji mee ka agharị ikpe ikpe kwụ ọtọ.
N'okwu ya, "Ihe ndị sineti na-eme bụ ịta m amusu na ịkpacha anya chọ ịkwụsị ikpe ziri ezi" n'ihi na ndị a na-enyocha bụ ndị omekome kpọrọ Melaye aha dịka onye so ha kpaa nkata ọjọọ ma jide ngwọagha ndị machibidoro iwu.
N'akwụkwọ ụlọọrụ ndị uweojii dere, o kwuru na, "Onyeisi ndị uweojii agaghị adara mbọ mmadụ ọbụla maọbụ otu onye maọbụ mmadụ abụọ na-agba ịhụ na e mebiri ikpe kwụ ọtọ.
"Nke a mere na ndị uweojii Naịjirịa enweghi onye ha ga-arịọ mgbaghara ọbụla maka na ha ana-ahụ na-akwalitere iwu Naịjirịa, ịgba mbọ na mmdụ niil rubere isii nye iwu obodo nke kas=chasị agbanyeghi ọnọdụ onye ahụ n'obodo."
Obi adịghị ndị sineti mma maka na otu onye n'ime ha bụ Dino Melaye na-agabiga mmegbu n'aka ndị uweojii nke kpatara ha ji akpọrọ onyeisi ndị uweojii ka ọ bịa zara ọnụ ya gbasara nsogbu Melaye mana o zigara mmadụ.
Akụkọ ga-amasị gị: