Awaala Sir Alex Ferguson chịkọtaburu Manchester United ụbụrụ
Ebe foto si, Getty Images
Sir Alex Ferguson bụ onye chịkọburu otu Manchester United, na-ezu ike n'ụlọọgwụ ka a wachara ya ụbụrụ maka ọbara na-agba ya n'isi.
Ndị otu Manchester United depụtara akụkọ kwuru na ịwa ụbụrụ ahụ gara nke ọma mana Ferguson "kwesịrị ịnọ n'ime ebe nlekọta pụrụiche (intensive care) nke ga-enyere ya aka ịgbake ọfụma".
Cheta na Ferguson mere ndị na-akwado Man Utd obi aṅụrị ọtụtụ oge site n'iko iri atọ na asatọ (38) o buteere ha n'ime afọ iri abụọ na isii (26) ọ nọ dịka onye nchịkọta ha.
Ferguson rituru n'ọchịchị ma laa ezumiike nka n'ọnwa Mee nke afọ 2013.
Tupu ọ banye n'ọrịa a mere ka e buga ya ụlọọgwụ, Ferguson pụtara n'ihu igwe mmadụ n'izuụka gara aga oge o nyere onye nchịkọta otu Arsenal bụ Arsene Wenger, ihe nrite iji jaa ya mma ka o kwuru na ọ ga-akwụsị ịchịkọta Arsenal n'afọ ka ọ chịchara ha afọ iri abụọ na abụọ (22).
Ihe e kwuru maka Ferguson
Ndị United dere na soshal midia na ekpere ha bụ na ọ ga-agbake ọsịsọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 1
Ụfọdụ ndị ọ chịkọburu oge ọ nọ na Manchester United, tinyere ọnụ na ikpere ya ekpere ka ọ gbakee.
David Beckham na Cristiano Ronaldo so na ndị kwuru okwu. Lee ihe ha dere:
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 2

End of Instagram post, 3
Ferguson bụ onye nchịkọta kacha mee ọfụma n'ime egwuregwu ndị Britain kemgbe e ji bido ya.
O buliri iko Premier League ugboro iri na atọ (13), iko Champions League ugboro abụọ, iko FA ugboro ise na iko League ugboro anọ.
Isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available