You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Okwu atọ Buhari ji 'wụọ Naịjirịa n'ala' na mba ofesi
Kwa mgbe kwa mgbe, onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari na-eme ihe ndị Naịjirịa na-eji akpụ ya n'ọnụ.
Ụfọdụ oge, a na-akpụ ya n'ọnụ maka ihe dị mma, ebe ụfọdụ oge ọ bụ maka okwu na-edoghị ndị mmadụ anya ka eji akọ maka ya.
Ndị mmadụ kwuru na ọ na-ebutere ndị Naịjirịa mkparị ụfọdụ oge site n'ụfọdụ ihe ndị a ọ na-ekwu ma agbaa ya ajụjụ ọnụ maọbụ o kwuo okwu na nzukọ ndị mba ofesi.
BBC Igbo na-ewetara gị ugboro atọ Buhari kwuru ụdịrị okwu a.
Ndị ntorobịa Naijirịa gosiri iwe ha n'ihe onyeisiala bụ Muhammadu Buhari kwuru n'ọgbakọ Commonwealth e nwere na Westminister, Lọndọn, ụbọchị Wenesde ebe o kwuru na ndị ntorobịa Naijiria adịghị ike ọrụ.
Ihe ndị Buhari kwuru
- Ndị ntorobịa Naịjirịa dị umengwụ
Ka Buhari gara London maka nzukọ ndị ọchịchị mba ndị nọ n'okpuru Commonwealth, O kwuru na ndị ntorobịa Naịjirịa dị umengwụ.
O kwuru na "Pasentị iri isii n'ime mmadụ dị nde 180 n'ọnụọgụgụ, erubeghị afọ iri atọ ọtụtụ n'ime ha agabeghị akwụkwọ, mana ha na-ekwu na Naịjirịa bụ mba na-emeputa mmanụ, n'ihi ya, ha achọghị ime ihe ọbụla, mana ha chọrọ ịnweta ụlọ, nletaahụike na agụmakwụkwọ na-etufughi ego ọbụla."
2. Ọnọdụ nwunye m bụ n'usekwu
Ọtụtụ ndị mmadụ agaghị echefu oge Buhari kwuru na nwunye ya bụ Aisha enweghị ọnụ n'ime ihe na-eme n'otu pati APC.
O kwuru nke a oge ọ gara njem nleta na Germany n'afọ 2016.
O kwuru na "o nwere ọnụ naanị n'usekwu m, n'obi m na ọnụụlọ nke ọzọ"
3. Mpụ juru na Naịjirịa
Oge David Cameron bụ praịm minista ndị Britain n'afọ 2016, o kwuru na "mpụ na nrụrụaka juru na Naịjirịa nke ukwuu".
Ihe a kpasuru ndị Naịjirịa iwe, mana nke kacha wee ndị mmadụ iwe bụ na Buhari gwara ndị ntaakụkọ na o kwenyere n'ihe Cameron kwuru.