Commonwealth: Ihe asaa ị na maghị maka ya

Ebe foto si, PA

Ka ndị mba Commonwealth na-eme nzụkọ, lee ihe asaa ị maghị maka ọgbakọ a.

1) Otu ụzọ n'ụzọ atọ n'ime mmadụ niile nọ n'ụwa bi n'ime mba Commonwealth dị icheiche

Ihe ruru mmadụ ijeri 2.4 n'ime mmadụ ijeri 7.4 n'ụwa niile bi na mba ndị Commonwealth. Ụfọdụ ha erụbeghị afọ iri atọ.

Mba kachasị n'ọnụọgụgụ bụ mba India nke mezuru ọkara ọnụọgụgụ a.

2) Mba Britain achịghị ọtụtụ n'ime ha n'oge gaara aga

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Belgium na Germany chịrị Rwanda mana UK achịghị ha

Rwanda na Mozambique banyere n'afọ 2009 na 1995 ma o nweghị nke mba Britain chịburu.

O nwekwara ndị sị n'otu a pụọ: Robert Mugabe kpọpụrụ ala Zimbabwe n'afọ 2003, a chụpụrụ Pakistan n'afọ 1999 ma nabatakwa ha mgbe afọ anọ gachara. Mba South Afịrịka pụrụ mgbe a katọrọ oke ha na-akpa n'etiti ndị ọcha na ndị ojii

Mba ikpeazụ pụrụ na Commonwealth n'afọ 2016 bụ Maldives.

3) Ezenwaanyị Britain na-achị mba iri n'isii n'ime ọgbakọ a

Ọtụtụ mba Commonwealth bụ Repọblịk, sọsọ isii n'ime ha Lesotho, Swaziland, Brunei Darussalam, Malaysia, Samoa na Tonga nwere eze nke ha.

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Tonga nwere eze nke ya bụ Tupou VI (etiti)

4) O hiri nne

Mba ndị Commonwealth mezụrụ otu n'ime ọkara anọ ala dị n'ụwa niile.

Mba kachasị bụ Canada. India na Australia hịkwara nne mana ọtụtụ n'ime ha dị obere dịka Nauru, Samoa, Tuvalu na Vanuatu, na Dominica kwa.

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Canada riri nne

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nauru dị obere

5) Ọ gbanwela aha ya mbụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị ọchịchị Commonwealth nwekwara nzụkọ n'afọ 1969

Ọgbakọ Commonwealth a bụ nke ọhụrụ a gbanwere n'afọ 1949 mgbe e wepụrụ "British" na aha ya.

Sọsọ mmadụ abụọ chịrị otu Commonwealth ahụ mana ọ bụghị kwa ihe nna na-enye nwa ya mana a na-atụ anya na nwaeze Charles ga-arịgo ọkwa ọchịchị a mgbe ọ bụrụ eze.

Mba ndị bidoro otu na mbụ bụ Australia, Canada, India, New Zealand, Pakistan, South Africa, Sri Lanka na mba Britain.

6) Mba Britain ka nwe ahịa kachasị...

India nwereike ị gafe UK n'afọ a.

GDP achịkọtara ọnụ ndị mba 53 a ruru $10tn (£7tn). O fọdụrụ obere ihe ka ya na nke China ha nhata nha, ebe nke ha bụ ($11tn, £7.7tn).

7) Commonwealth dị karịa otu.

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Commonwealth nke mba nwere onwe nwere nzụkọ na Minsk, Belarus

Echezọna ngalaba ndị mba French na Commonwealth mba ndị nwereonweha a kpọrọ CIS na-aha ịchafụ mba ndị Soviet ochie bidoro n'afọ 1991.

Akụkọ ga-amasị gị: