Ndị e chere na ha bụ Bọko Haram wakporo ụlọakwụkwọ ụmụnwaanyi dị na Dapchi,Yobe steeti na mpaghara ọwụwaanyawụ ugwu-awụsa, Naịjiria.

Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Lai Mohammed, kwuru na ọ bụ ndị ụmụaka ụmụakwụkwọ nwaanyị otu narị na ise na otu nwoke ha gbapụtara n'aka.
Ka ọ si dị onweghị onye ma ọnọdụ ụmụaka ise ndị e kwuru na ha nwụrụ 'ime ndị a tọrọ.
Aka ndị Boko Haram ka ji otu nwa nwanyị onye bụ onye otu Kraist nke jurụ ịgọnarị okwukwe n'ime Kraisti.
A tọrọ ụmụaka ndị a n'ụlọ akwụkwọ ha dị na Dapchi otu ọnwa gara aga.
Gọmentị na- ekwu na onweghị ụgwọisi ọbụla ha kwụrụ nke o ji enwe onye Boko Haram eji isi ha gbara ụmụaka ahụ.
Mana ndọrịtaụka sọ ihe gọọmentị na-ekwu na ọ nweghị ụgwọ a kwụrụ.

Ebe foto si, Reuters
Otu ụlọọrụ ntaakụkọ bụ Sahara Reporters kwuru na gọọmenti kwụrụ Boko Haram "nnukwu ego" ma werekwa isi ụfọdụ ndị Bokọ Haram nọ na mkpọrọ gbara isi ụmụaka ndị ahụ.
Ọnụ na-ekwuchiere onyeisiala bụ Garba Shehu gọrọ.
Ọ kwara BBC na ntọhapụ ụmụaka dapchi bụ "nkwekọrịta nwoke na ibe ya"nke butere 'gbanyọọkụ na mkparịta ụka ha na ndị aghaọlụọọla.
Ka ọ dị ugbua, otu PDP ekwuola na nntọrọ na mgbapụta ụmụaka Dapchị bụ ụzọ ha ji achọ inweta obi ndị mmadụ maka ntuliaka 2019.
Ndị e chere na ha bụ Bọko Haram wakporo ụlọakwụkwọ ụmụnwaanyi dị na Dapchi,Yobe steeti na mpaghara ọwụwaanyawụ ugwu-awụsa, Naịjiria.
Gọọmenti Naijiria kwuru na ụmụaka ụmụnwaanyi otu nari na iri(110) na-efu
Gọọmenti Yobe steeti kwuru na azọpụtala ụmụaka ụmụnwaanyị n'aka ndị oyi ndụ egwu tọrọ ha, ma kwukwa na ha na ndị agha nọzị.
Gọọmentị Yobe steeti rịọrọ mgbaghara sị na ha duhiere ọha mmadụ sị na 'onweghị nwata azọpụtara'.
Onyeisiala bụ Buhari kwuru na mwakpo ụmụakwụkwọ Dapchi bụ 'ọdachi mere ala anyị nile'
Ndị agha ụgbọelu Naịjirịa kwuru na ha zipuru ụgbọelu na ndị agha ha ị ga chọọ ma gbapụta ụmụaka ahụ.
Ndị agha Naijiria gọọnarịrị ebubo Gọvanọ Yobe steeti bụ Ibrahim Gaidam boro na ha kpọpụrụ ndị agha n'obodo Dapchi tupu a tọrọ ụmụaka ahụ.Ndị agha kwetara na kpọpụrụ ndị otu ha maka na 'echekwara obodo ahụ'
Gọọmenti etiti hiwere kọmiti mmadụ iri na abụọ iji nyocha ọnọdụ ejiri ntọrọ ma wepụta ozi zuru oke gbasara 110 na-efu.
Odeakwụkwọ UN bụ Antonio Guterres "katọrọ ebe ọ dị ukwu mwakp na ntọrọ ahụ".
Akụkọ kwuru na onye na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye bụ Aisha Wakil, nke a ma dịka ‘Mama Boko Haram' kwuru na otu Boko Haram nke Barnawi gwara ya na ha ji ụmụaka ahụ.
Ụmụnwaanyị mere mgagharịiwe maka ntọrọ ahụ n'Abụja ka ọ gachara izuụka atọ.
Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari kwuru na a na-akwado inwe mkparitaụka maka mgbapụta ụmụaka ahụ a tọrọ. kama ji ike ndị agha tọpụta ha.
Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari mere njem ya nke mbụ na Dapchi, bụ ebe o kwere ndị nne na nna ụmụakwụkwọ ahụ nkwa na gọọmenti ga-azọpụta ụmụaka ahụ a tọrọ.
Otu Amnesty International kwuru na ndị agha Naịjirịa e geghị ntị n'ama a gbara ha otụtụ oge tupu ndị oyi ndụ egwu a awakpo obodo Dapchi.
Gọọmentị Naịjịria mara ọkwa na-atọhapụla ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị dị otu nari na anọ(104) n'ime otu nari na iri(110) bụ ndị a tọrọ




















