Ndị e chere na ha bụ Bọko Haram wakporo ụlọakwụkwọ ụmụnwaanyi dị na Dapchi,Yobe steeti na mpaghara ọwụwaanyawụ ugwu-awụsa, Naịjiria.

Ebe foto si, Reuters
Dịka mba ụwa mere mmemme ncheta ụmụnwaanyị taa, ụfọdụ nne na nna ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị ndị Boko Haram tọrọ na Dapchi wuchiri n'Abuja taa ebe ha mere ngaghari iwe gbasara ụmụ ha.
Ngaghari udo ahụ ha mere bụ iji chetere ndị gọọmenti etiti maka ihe ọdachi mere ha na ezinaụlọ ha ụbọchị Fubuwarị 19 oge ndị Boko Haram tọrọ ụmụ ha.
A tọrọ ụmụaka ahụ n'ụlọakwụkwọ ha dị na Dapchi dị na Yobe steeti.
Taa mere ya ụbọchị iri na asaa kemgbe a tọrọ ụmụakwụkwọ ahụ mana enwebeghi olileanya na a ga-achọta ha.
Ndị nne na nna ahụ yi akwa ojii iji gosi na ha na-eri uju. Ha ruru n'ọnụụzọ ụlọ omee iwu n'Abuja.
Ahụrụ ụfọdụ nime ha dịka ha na-ebe akwa ebe ndị ọzọ na-agụ egwu akwa. Ụfọdụ kọwara n'anyammiri etu ihe ọdachi si wezụga odịnihu ụmụ ha nke kpatara ha jiri gawa akwụkwọ na mbụ.
Ọtụtụ nime ha kwuru na olileanya ha na ndị gọọmenti ga-achọta ụmụ ha na-ada kwa ụbọchị.
Nke a bụkwa ka a na-azọtachabeghi ụmụakwụkwọ Chibok ndị Boko Haram tọrọ n'afọ 2013.
Ndị e chere na ha bụ Bọko Haram wakporo ụlọakwụkwọ ụmụnwaanyi dị na Dapchi,Yobe steeti na mpaghara ọwụwaanyawụ ugwu-awụsa, Naịjiria.
Gọọmenti Naijiria kwuru na ụmụaka ụmụnwaanyi otu nari na iri(110) na-efu
Gọọmenti Yobe steeti kwuru na azọpụtala ụmụaka ụmụnwaanyị n'aka ndị oyi ndụ egwu tọrọ ha, ma kwukwa na ha na ndị agha nọzị.
Gọọmentị Yobe steeti rịọrọ mgbaghara sị na ha duhiere ọha mmadụ sị na 'onweghị nwata azọpụtara'.
Onyeisiala bụ Buhari kwuru na mwakpo ụmụakwụkwọ Dapchi bụ 'ọdachi mere ala anyị nile'
Ndị agha ụgbọelu Naịjirịa kwuru na ha zipuru ụgbọelu na ndị agha ha ị ga chọọ ma gbapụta ụmụaka ahụ.
Ndị agha Naijiria gọọnarịrị ebubo Gọvanọ Yobe steeti bụ Ibrahim Gaidam boro na ha kpọpụrụ ndị agha n'obodo Dapchi tupu a tọrọ ụmụaka ahụ.Ndị agha kwetara na kpọpụrụ ndị otu ha maka na 'echekwara obodo ahụ'
Gọọmenti etiti hiwere kọmiti mmadụ iri na abụọ iji nyocha ọnọdụ ejiri ntọrọ ma wepụta ozi zuru oke gbasara 110 na-efu.
Odeakwụkwọ UN bụ Antonio Guterres "katọrọ ebe ọ dị ukwu mwakp na ntọrọ ahụ".
Akụkọ kwuru na onye na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye bụ Aisha Wakil, nke a ma dịka ‘Mama Boko Haram' kwuru na otu Boko Haram nke Barnawi gwara ya na ha ji ụmụaka ahụ.
Ụmụnwaanyị mere mgagharịiwe maka ntọrọ ahụ n'Abụja ka ọ gachara izuụka atọ.
Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari kwuru na a na-akwado inwe mkparitaụka maka mgbapụta ụmụaka ahụ a tọrọ. kama ji ike ndị agha tọpụta ha.
Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari mere njem ya nke mbụ na Dapchi, bụ ebe o kwere ndị nne na nna ụmụakwụkwọ ahụ nkwa na gọọmenti ga-azọpụta ụmụaka ahụ a tọrọ.
Otu Amnesty International kwuru na ndị agha Naịjirịa e geghị ntị n'ama a gbara ha otụtụ oge tupu ndị oyi ndụ egwu a awakpo obodo Dapchi.
Gọọmentị Naịjịria mara ọkwa na-atọhapụla ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị dị otu nari na anọ(104) n'ime otu nari na iri(110) bụ ndị a tọrọ
Akụkọ ọzọ ga-amasị gị:



















