You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nkwado Ndigbo: Peter Obi asaala Oshiomhole
Peter Obi sị na Oshiomhole tụrụ asị
Peter Obi ekwuola na okwu onyeisioche APC bụ Adams Oshiomole kwuru na na ndigbo anabataghị ya dịka onye ga-esote Atiku Abụbakar n ọsọ ndọrọndọro ọkwa onyeisiala nke PDP na 2019 bụ ụgha.
Obi, onye kwuru nke site n'onu ojeozi mgbasaozi ya bụ Valentine Obienyem kwuru na naani nsogbu e nweburu bụ a kpaghị ụka ahụ akpa.
Ụlọikpe ukwu atụufiola akwụkwọ ndị otu ụmụnwoke na-alụ onye ha
Ulọikpe ukwu atụpụla akwụkwọ ndị otu chọrọ ka nwoke lụwa ibe ya maọbụ nwaanyị lụwa ibe ya ha gbara Corporate Affairs Commission bụ ngalaba gọọmenti na-edebe aha ụlọọrụ dị na Naịjirịa.
Ụlọọrụ CAC jụrụ ịdebe aha ndị otu a dịka otu tozuru ịrụ ọrụ na Naịjirịa.
Emmanuel Macron akpọọla oku ka mba dị dị n'Uropu jikọọ ọnụ
N'ofesi, Onyeisiala mba France bụ Emmanuel Macron akpọọla oku ka otu jikọtara mba Urope gbaa mbọ jikọọ ọnụ maka igbochi ọgbaaghara n'ụwa.
Macron kwuru nke a na Berlin mgbe ọ gara emume maka ncheta ndị e gburu n'agha.