Babcock University: Nwoke kwuru okwu asị megide Ndigbo abụghị onye ọrụ anyị

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụmụ Igbo na-ewe iwe okwu asị megidere ha
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọnụ na-ekwuru mahadum Babcock bụ Joshua Suleman, depụtara nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'aha mahadum sị na nwoke ahụ abụghị onye ọrụ mahadum ha.

Alaba Ajibola, onye kpọrọ onwe ya onye ọrụ Babcock n'igwe okwu Facebook, bidoro iwu na soshal midia ka ọ depụtachara okwu asị megide Ndigbo abalị ole na ole gara aga.

N'ihe Ajibola dere na Facebook n'otu a kpọrọ 'Space for Change', o kwuru na ọ gaara aka mma ma ọ bụrụ na e gbuchara Ndigbo niile n'agha Biafra; na ọ bụrụ na ọ dị etu a, Naijiria gaara aga n'ihu karịa.

Ọ sị na nsogbu agaghị n'ihu Naijiria si n'aka Ndigbo.

N'okwu ya, "Ekwuola m ọtụtụ mgbe na Ndigbo bụ nsogbu ala anyị.

"Ọ bụrụ na e kpochapụrụ ha n'oge agha Biafra, Naịjiria gaara aga n'ihu. Mana oge agabeghị. Ha bụ agbụrụ a kpọrọ asị karịcha n'ụwa niile."

Ebe foto si, Space for Change

Ebe foto si, Space for Change

Ebe foto si, Space for Change

Nkọwa foto, Ihe Alaba Ajibola dere na-apụ ụka

Iwe pụrụ ụmụafọ Igbo

Ahụrụ a Ajibola nyụrụ mere ka obi ọtụtụ ụmụ Igbo na-asụ ka mmiri ọkụ.

Ụfọdụ ha kpọrọ oku ka Mahadum Babcock taa Ajibola ahụhụ maọbụ ha kpọpụcha ụmụakwụkwọ ndị Igbo na-agụ akwụkwọ na mahadum ahụ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip X post, 2

End of X post, 2

Ụfọdụ dịka @Tonydazzling kwuru na mahadum ahụ na-akwado ịkpa oke agbụrụ nke mere na ha were onye na-akpa oke agbụrụ dịka Ajibola n'ọrụ.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Babcock sị na aka ha adịghị ya

Mana Mahadum Babcock agọrọla aka na ụkwụ ha, sị na Ajibola abụghị onyeọrụ ha, nke ha na-akwado okwu ya.

"Nke a bụ iji gwa ọhanaeze na Ajibola a na-ekwu maka ya abụghị onye ọrụ mahadum anyị, nke o ji anọchite anya mahadum a n'ụzọ ọbụla.

"Ajibola bụbu onyeọrụ anyị mana o teela aka anyị na ya anọghịzị.

"O nweghị ihe jikọrọ mahadụm anyị na Ajibola na ihe o kwuru."

Ozi ahụ gara n'ihu kwuo na,"Babcock bụ mahadum mbaụwa maka mmadụ niile, n'agbanyeghị nkwenye, agbụrụ, ofufe na ndọrọndọrọ ọchịchị onye na-akwado."

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Akụkọ ga-amasị gị: