Sinatọ Nwaoboshi agaala mkpọrọ Ikoyi
Ebe foto si, EFCC
Ngalaba na-ahụ maka mpu na aghụghọ akpọrọ Economic and Financial Crimes Commision na bekee akpeela ome iwu Peter Nwaoboshi n'ụlọ ikpe dị na lagos steeti taa.
Ha na-ebo Nwaoboshi ebubo gbasara mpu ego.
Onye okaiwu ya bụ Valerie Azinge rịọ ụlọikpe a ka ha ji ego gbapụta ya.
Mana okaikpe Mohammed Idris kwuru ya ga-eme mkpebi ikpe a n'ụbọchị iri abụọ na asaa, n'ime ọnwa a.
Ebe foto si, Peter Nwaoboshi/Facebook
O kwukwara na ha ga-eji Nwaoboshi na mkporo Ikoyi n'ime Lagos steeti ruo oge ahụ.
Nwaoboshi na otu ụlọọrụ akpọrọ Golden Touch Construction Project Limited na Suiming Electricals Limited ka ha na-ebo ebubo a.
EFCC kwuru na Nwaoboshi na ndị ụlọọrụ a ji nde naira 805 zuru otu ụlọ akpọrọ ụlọ-Guinea n'Apapa n'ime Lagos.
Akụkọ ga-amasị gị:
Isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available