Google akwanyerela Keshi ugwu n'ọnwụ
Ebe foto si, Google Africa Twitter
Iji cheta ọmụmụ onye nkuzi bọọlụ Najiria a ma ama bụ Stephen Keshi, Google kwanyere ya ugwu n'ụzọ pụrụiche site na ime ka akara e ji achọta ihe n'igwe intanetị bụrụ ihu ya.
Taa bụ ụbọchị 23 nke ọnwa Jenuwarị 2018, bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ Keshi onye nwụrụ n'afọ 2016 ka ọ gbara afọ 54.
Google Africa kwuru n'igwe okwu Twitter sị: "Taa, anyị na-akwanyere onye egwuregwu bọọlụ a ma ama, Stephen Keshi ugwu. Egwuregwu bọọlụ bugharịrị Keshi ụwa niile dịka onye ọgba bọọlụ na onye nkuzi bọọlụ. Ọnụ ọmụmụ, nna nnukwu!"
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ihe a Google mere, mere ọtụtụ ndị Naijiria obi ụtọ, mekwa ka ha chetakwa ndụ na ike Keshi kpara n'ihe gbasara egwuregwu bọọlụ na Naijiria mgbe ọ dị ndụ:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

End of X post, 3
Ebe foto si, AFP/GETTY IMAGES
Mutiu Adepoju, onye ya na Keshi gbakọrọ Naijiria bọọlụ, gwara BBC na, "Keshi bụ onye hụrụ ndị mmadụ n'anya. Echetara m oge m banyere "National Team" mgbe ahụ ọ bụ onye ndu anyị, ọ bụ ezi onye ndu. Keshi bụ onye a ma ama. Ọ nọzịghị ndụ mana a ga-eji ihe ọma ndị o mere mgbe ọ dị ndụ were na-echeta ya."
Keshi chịrị ndị otu egwuregwu Super Eagles kemgbe afọ 2011 ma durukwa ha gaa asọmpi dị iche iche nke gụnyere; Iko Mba Afrika na 2013 (nke ha bulatara Naịjirịa), iko mpaghara Afrịka dị iche iche na 2013, ma nye aka wetara Naijiria ọnọdụ n'asọmpi Iko Mbaụwa niile na 2014.
Isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available