Ekweremadu: Ike agwụla ndị ụlọ ome iwu
Ebe foto si, @ike_Ekweremadu
Osote onye-isi ndị ome-iwu Naịjirịa bụ Ike Ekweremadu ekwuola na ike agwụla ndị Sịnatị iji otu nkeji darajụụ akwanyere ndị egburu n'ime oke ọgbaghara dị na Naịjirịa oge ọ bula.
Ekweremadu katọrọ mwakpọ na ogbugbu ndị Naịjirịa aka ha dị ọcha nke ndị Fulani na-achị ehi mere, kwuo na ike agwụla ndị ome- iwu ịkwanyere ha ugwu n'otu nkeji'
Cheta n'otu ịzụka gara-aga ka emere akwam ozu mmadụ ruru iri asaa egburu na Local Gọọmenti Logo na Guma nke Benue Steeti, e be ihe kariri mmadụ iri ise ka akụkọ kwuru n'egburu na Taraba Steeti.
Ekweremadu gosiri iwe gbasara ogbugbu ndị mmadụ na nzukọ ndị ome-iwu n'ụbọchị taa, kwuo na Naịjirịa ga-ebu ụzọ nwe udo na nchekwa, tupu e kwuowa okwu iwulite obodo.
Ọ sịrị: "Ndị ome-iwu abụghị sọ ọsọ ndị ihe a metụtara, kama ndị Naịjirịa niile.
'Ike agwụla anyị iji otu nkeji dị jụụ maka nkwanye ugwu. Ihe anyị chọrọ bụ udo na nchekwa tupu echewa echịchị nwuli obodo."
Isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available