A ga-ahazi ntuliaka n'okpuru ọchịchị isii dị n'Abuja n'ụbọchị Satọde 21 Febụwarị, 2026.
Ndị bi n'okpuru ọchịchị ndị a bụ ndị ga-eme ya - Abaji, Abuja Municipal, Bwari, Gwagwalada, Kuje na Kwali - a ga-atụnyere ndị isioche isii na ndị nnọchiteanya 62 nke Bekee kpọrọ councillor n'obodo 68 dị n'Abuja.
Nke a ga-abụ nke mbụ a ga-ahazi ntuliaka kemgbe Onyeisiala Bola Tinubu binyere aka n'iwu ntuliaka ọhụrụ a kpọrọ Electoral Amendment Act n'ụbọchị 17 Febụwarị 2026.
Iwu a kwuru na ọ bụghị sọọsọ igwe ka a ga-eji kesaa mpụtara ntuliaka, iwu a nyere ohere ka e ji aka dee mpụtara ntuliaka site n'ọba ntuliaka n'igwe ebe ndị mmadụ nwereike na-ahụ ya oge ọ na-eme.
Mana ọtụtụ katọrọ nke a maka na ha sị na ọ ga-enye ohere ka e mee nrụrụaka tụmadị ebe ndị na-enweghị ikuku nziritaozi.
Ha sị na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nwereike mee nke a etu ọbụla ọ sọrọ ha ma nyekwa ohere ime nrụrụaka.
Agbanyeghị nke a, ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (INEC) ekwuola na ihe karịrị mmadụ otu nde na ụma ise (1.5m) anatala akwụkwọ ntuliaka ha bụ PVC n'ime otu nde na ụma iri isii na asatọ (1.68m) tinyere akwụkwọ n'Abụja.
“Sọọsọ ndị binyere aka ịtụ vootu ka a ga-ekwe ka ha tụọ vootu n'ụbọchị ntuliaka,” ka ọnụ na-ekwuchitere INEC bụ Mohammed Haruna kwuru.
Ndị ọnụ na-eru n'okwu sị na ntuliaka Abuja a ga-abụ nnwale nye ụlọọrụ INEC, pati All Progressives Congress (APC) na Onyeisiala Tinubu dịka a na-echere ntuliaka na-abịa n'afọ 2027.
N'agbanyeghị na onye ji ọkọlọtọ Labour Party zọọ ọkwa Onyeisiala bụ Peter Obi meriri n'Abuja n'afọ 2023, ọ naghị azọ ntuliaka a.
O weliela aka ndị ji ọkọlọtọ African Democratic Congress (ADC) azọ ọkwa ọchịchị a, bụ ndị e chere na ha so Peter Obi pụta na Labour Party banye ADC.
Kedụ ngụkọ ndị ga-eso tuọ vootu?
Ndị niile tinyere aha ha ịtụ vootu na ntuliaka Abuja bụ: 1,680,315
Ndị niile natara akwụkwọ ntuliaka PVC bụ: 1,587,025
Ndị niile na-azọ oche councillor: 62
Otu ndọrọndọrọ ọchịchị ga-eso zọọ ntuliaka dị: 17