Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa
Dut Wọọdụe: A gụchala vootu mana e debanyeghị ya n'igwe BVAs
Nkọwa foto, Ndị ọrụ ntuliaka
Dịka a tụcharaa vootu n' Ụlọakwụkwọ 'LEA Primary School Dutse Makaranta, Dutse Wọọdụ dị na Bwari, a grụụ vootu a tụrụ.
A gụchala vootu, debanye ihe a gụtara n'akwụkwọ ndị ọrụ otu pati binyekwara aka n 'akwụkwọ mpụtara ahụ.
Mana e tinyeghị mpụtara hụ n'igwe BVAs.
Oge onye ntaakụkọ anyị jụrụ ndị ọrụ ntuliaka, o kwuru na ọ bụ ha rụe na wọọdụ ebe ha ga-ezute onyeisi nlekọta ha(Supervising officer) ka a ga-eme nke a.
Maka ntuliaka afọ 2027: APC ahaziela ọgbakọ ‘congress’ n’Ebonyi Steeti
Dịka a na-akwado
maka ntuliaka afọ 2027 na Naịjirịa, ngalaba pati All Progressives Congress
(APC) n’Ebonyi Steeti ahaziela ọgbakọ ‘congress’ nke ọchịchị ime obodo, bụ ebe
ha nọọrọ họpụta ndị isi n’okpuru ọchịchị iri na atọ e nwere na steeti ahụ.
Oge onye ntaakụkọ BBC garuru n’okpuru ọchịchị Ọhaukwu, Ọhaọzara na Abakiliki, ndị niile ọ jụrụ ajụjụ gosiri afọ ojuju na ntuliaka ahụ.
Ụfọdụ n’ime ndị ahụ a jụrụ ajụjụ gụnyere onye ji ọkwa Onyeisioche APC n’okpuru ọchịchị Ọhaukwu bụ Ikechukwu Odonoh, onye zọrọ ọkwa onyeisioche n’okpuru ọchịchị Abakiliki bụ Chidiebere Alo, tinyekwara onye nwetara mmeri dịka onyeisioche n’okpuru ọchịchị Ọhaọzara bụ Michael Umahi.
Na mmalite ọgbakọ ahụ ka onyeisioche APC n’Ebonyi Steeti bụ Stanley Okoroemegha kwuru na ndị ndu pati ahụ dị ezi njikere ịhụ na ọgbakọ ahụ gara n’udo.
Abịa steeti ehiwela ụlọ 'Nchedo' maka inye ụmụnwaanyị a wakporo n'ike nleta
Ebe foto si, Priscila Otti
Gọọmenti Abịa Steeti agbapeela ebe nleta pụrụ iche maka ileta ndị e dinara n'ike nakwa mkpagbu ezinaụlọ a kpọrọ 'Nchedo Sexual Assault Referral Centre' n'ogige ụlọọgwụ Aba General Hospital dị n'Aba, Abịa steeti.
Ọrụ ụlọọrụ ahụ gụnyere nleta ahụike, nnyocha miri emi, ntuzaka iwu nakwa ndụmọdụ nye ndị e dinara n'ike maọbụ ndị e mekpara ahụ n'ihi na ha bụ nwaanyị maọbụ nwoke.
Ọ bụ Minista na-ahụ maka ụmụnwaanyị bụ Imaan Sulaiman-Ibrahim bụ onye gbabere ebe nleta ahụ na nsonso a n'emume e mere n'Aba nke Gọvanọ Alex Otti nakwa nwunye ya bụ Priscilla Otti nọ n'isi ya.
N'okwu ya na mmemme ahụ, Gọvanọ Otti katọrọ ndina n'ike, iti ihe, mmegbu ụmụaka nakwa ihe ọjọọ ndị ọzọ yiri ya ma kpọọ oku sị, "o kwesịrị ka anyị rịa n'ezi agwa nke na ọ gaghị adịkwa mkpa ịrụ ụdị ụlọọrụ a."
Ụlọọrụ na-ahụ
maka ibelata ọrịa ndị na-efe efe na Naịjirịa bụ Nigeria Centre for Disease
Control and Prevention (NCDC) ekwuola na mmadụ dị narị atọ na iri na asatọ
ebutela ọrịa Lassa fever na Naịjirịa.
NCDC kwuru na
mmadụ iri asaa anwụọla gburugburu Naịjirịa site n’ọrịa ahụ kemgbe mmalite afọ
2026.
Nnukwu Onyeisi ụlọọrụ
NCDC bụ Dr Jide Idris kpughere nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n’ụbọchị
Fraịde 20 Febụwarị 2026.
Dr Idris kwuru na
e debatala aha mmadụ otu puku narị anọ na iri isii na itoolu dịka ndị a na-enyo
enyo na ha butere ọrịa Lassa fever.
Onyeisi NCDC
kwuru na steeti ise gụnyere Edo, Ondo, Taraba, Bauchi na Ebonyi mejupụtara
pasenti iri itoolu na otu ndị butere ọrịa ahụ.
Iji hụ na a chụrụ ọrịa Lassa fever ọsọ ụkwụ eru ala, NCDC kwuru na ha ezigaala ndị ọrụ gbatagbata National Rapid Response Team na steeti asatọ gụnyere Bauchi, Ondo, Taraba, Edo, Benue, Jigawa na Plateau.
Dr Idris gara n’ihu kwuo na NCDC na-agbakọọrọ gọọmenti steeti dị iche iche aka iji kwalite nnyocha, nlekọta ndị nwere ọrịa ahụ nakwa ịkpọtụrụ ndị obodo.
A ga-ahazi ntuliaka ime obodo n'Abuja, nke mbụ kemgbe e binyere aka n'iwu ntuliaka ọhụrụ
Ebe foto si, Getty Images
A ga-ahazi ntuliaka n'okpuru ọchịchị isii dị n'Abuja n'ụbọchị Satọde 21 Febụwarị, 2026.
Ndị bi n'okpuru ọchịchị ndị a bụ ndị ga-eme ya - Abaji, Abuja Municipal, Bwari, Gwagwalada, Kuje na Kwali - a ga-atụnyere ndị isioche isii na ndị nnọchiteanya 62 nke Bekee kpọrọ councillor n'obodo 68 dị n'Abuja.
Nke a ga-abụ nke mbụ a ga-ahazi ntuliaka kemgbe Onyeisiala Bola Tinubu binyere aka n'iwu ntuliaka ọhụrụ a kpọrọ Electoral Amendment Act n'ụbọchị 17 Febụwarị 2026.
Iwu a kwuru na ọ bụghị sọọsọ igwe ka a ga-eji kesaa mpụtara ntuliaka, iwu a nyere ohere ka e ji aka dee mpụtara ntuliaka site n'ọba ntuliaka n'igwe ebe ndị mmadụ nwereike na-ahụ ya oge ọ na-eme.
Mana ọtụtụ katọrọ nke a maka na ha sị na ọ ga-enye ohere ka e mee nrụrụaka tụmadị ebe ndị na-enweghị ikuku nziritaozi.
Ha sị na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nwereike mee nke a etu ọbụla ọ sọrọ ha ma nyekwa ohere ime nrụrụaka.
Agbanyeghị nke a, ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (INEC) ekwuola na ihe karịrị mmadụ otu nde na ụma ise (1.5m) anatala akwụkwọ ntuliaka ha bụ PVC n'ime otu nde na ụma iri isii na asatọ (1.68m) tinyere akwụkwọ n'Abụja.
“Sọọsọ ndị binyere aka ịtụ vootu ka a ga-ekwe ka ha tụọ vootu n'ụbọchị ntuliaka,” ka ọnụ na-ekwuchitere INEC bụ Mohammed Haruna kwuru.
Ndị ọnụ na-eru n'okwu sị na ntuliaka Abuja a ga-abụ nnwale nye ụlọọrụ INEC, pati All Progressives Congress (APC) na Onyeisiala Tinubu dịka a na-echere ntuliaka na-abịa n'afọ 2027.
N'agbanyeghị na onye ji ọkọlọtọ Labour Party zọọ ọkwa Onyeisiala bụ Peter Obi meriri n'Abuja n'afọ 2023, ọ naghị azọ ntuliaka a.
O weliela aka ndị ji ọkọlọtọ African Democratic Congress (ADC) azọ ọkwa ọchịchị a, bụ ndị e chere na ha so Peter Obi pụta na Labour Party banye ADC.
Ụlọọrụ na-enye akwụkwọ ikikere ịbanye mba Briten ekwuola na ha ga-amalite inye akwụkwọ ikikere dijitalụ maka ndị chọrọ ịbata mba Briten site n'ụbọchị 25 Febụwarị 2026 maka ndị dere ka ha nata akwụkọ ịbata bụ visa, maka na ha ga na-enye sọsọ eVisa.
Ha sị na eVisa a ga-anọchịanya akwụkwọ visa ha na-atapa n'ime passports.
Ụlọikpe Kachasị n'Amerịka akagbuola ụtụ egọ Trump
Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe Kachasị nke mba Amerịka akagbuola ụtụ ego Onyeisiala Donal Trump tụkwasara na ngwaahịa na mba ụwa
N'afọ 2025, Trump tinyere ego ụtụisi a ngwaahịa a na-atụbata n'Amerịka, sị na ọ bụ iji nyere Amerịka aka na mmepụtangwaahịa
Mana kama inweta nkwado ụlọomeiwu c, Trump gbadoro ụkwụ na iwu nke afọ Gbatgbata nke Akụnaụba mba ụwa nke afọ 1977(International Emergency Economic Powers Act. Declaring an emergency 1977) were tinye n'ọrụ ozugbo.
N'ọnwa Ọgọst afọ 2025, Ụlọikpe Mkpegharị nke Amerịka nyere mkpebi na ọtụtụ ụtụego ahụ Trump tinyere megidere iwu mana hapụ ya.
Mana Ụlọikpe Kachasị tinyere aka n'ikpe ahụ dịka Ụlọọrụ Onyeisial (White House rịọrọ ka ọ kagbuo mskpebi nke Ụlọikpe Mkpegharị nyere..
Ụlọikpe Tunisịa atụọla onye omeiwu mkpọrọ maka ịkatọ Onyeisiala Saied na soshal midia
Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe mba
Tunisịa atụọla onye omeiwu mba ahụ mkpọrọ ọnwa asatọ maka ebubo ịkwa Onyeisiala
Kais Saied emo na soshal midịa.
A nwuchiri Ahmed
Saidani na mmalite ọnwa Febúwarí oge o wepụtara ozi na soshal midịa oge Onyeisiala Saied
gara mgbaru n’ogige idemmiri wakporo ma kpọ ya “onye ndu mkpocha akwara mmiri
ozuzu”.
Ọkaiwu
na-anọchiteanya Saidani bụ Houssem Eddine Ben Attia gwara ụlọọrụ AFP na gọọmenti
ji iwu megidere mmetọ mgbasaozi na imeru ndị ọzọ ahụ na soshal midịa, kpagbu Saidani.
Iwu ahụ bụ nke nwere ike ime ka mmadụ nweta ntaramahụhụ mkpọrọ ruru afọ abụọ.
Ọtụtụ ụlọọrụ
na-achekwa ikike mmadụ katọrọ ikpe ahụ a mara Saidani ma kwuo na nke gosiri aka
ike Onyeisiala Saied ji achị mba Tunisịa kemgbe ọ kagburu ụlọomeiwu mba ahụ n’afọ
2021.
Na nso nso
a, Saidani bụbu onye nkwado Onyeisiala Saied, amalitela ikwu ma na-akatọ ọchịchị
ya.
E mechiela ụlọakwụkwọ niile dị n’Abuja n’ihi ntuliaka okpuru ọchịchị
Ebe foto si, Getty Images
E mechiela ụlọakwụkwọ niile dị n’isi obodo Naịjirịa bụ
Abuja dịka a na-akwado ịhazi ntuliaka okpuru ọchịchị n’ụbọchị Satọde 21 Febụwarị
2026.
A hụrụ ka ụmụakwụkwọ na-alaghachi n’ụlọ ha mgbe ọ kụrụ
ihe dịka elekere itoolu nke ụtụtụ, n’ihi ntuziaka e nyere ka e mechie ụlọakwụkwọ
niile maka ntuliaka ahụ.
Ntuziaka ahụ bụ n’ihi atụmatụ e mere iji ọtụtụ ụlọakwụkwọ
ọhanaeze mere ogige ntuliaka nakwa ogige ngụkọ vootu n’ogogo wọọdụ.
Nke a bụ iji hụ
na a haziri ihe niile nke ọma maka ntuliaka ga-adị n’okpuru ọchịchị isii dị n’Abuja.
N’otu aka ahụ, ndị uweojii ekwuola na agaghị eme ngagharị n’Abuja malite n’elekere isii nke ụtụtụ ruo elekere isii nke mgbede n’ụbọchị Satọde 21 Febụwarị 2026.
Kọmịshọna ndị uweojii n’isi obodo bụ Miller G. Dantawaye kwuru na ọnọdụ a ga-emetụta ndị niile bi n’Abuja e wezuga ndị ọrụ ha dị oke mkpa nakwa ndị ọrụ ntuziaka e nyere nkwado.
Otu ndị ọrụ PENGASSAN agwala Onyeisiala Tinubu ka ọ kagbuo iwu ọhụrụ gbasara ego mmanụ
Otu ndị orụ mmanụ agbadị nke Naịjịrịa bụ PENGASSAN agawala Onyeisiala
Bola Tinubu ka ọ kagbuo iwu ‘Executive Order’ nke ikike wepụrụ ụlọọrụ mmanụ ala
nke Naịjịrịa NNPC Limited iwepụ ego mmanụ dịka ụlọmgbasa ozi mpaghara siri kwuo.
Cheta na Onyeisiala Tinubu binyereka n’iwu mmanụ ọhụrụ n’ụbọchị
Wenezde 18 Febụwarị 2026 maka ụlọọrụ FAAC iwepụ ego mmanụ na ‘gas’ ozugbo.
N'okwu ya n'oge mkparịtaụka ndị ntaakụkọ n’ụbọchị Tọzde,
Festus Osifo, onyeisiala mba nke PENGASSAN, kwuru na iwu ahụ bụ "mwakpo”
megide iwu ‘Petroleum Industry Act’.
Osifo kwuru na onyeisiala ejirila iwu ọhụrụ ahụ "wepụ
iwu nke Federal Republic nke Nigeria".
"Anyị chere na onyeisiala kwesịrị ikagbu iwu ahụ ozugbo,
ma leba anya na ya ọzọ, n'ihi na anyị maara na onyeisiala Naịjirịa emeela ihe
niile o kwesịrị ịme iji dọta itinye ego na ụlọọrụ mmanụ na gas nke Naịjirịa,"
ka o kwuru.
Onyeisi otu ndị ọrụ PENGASSAN kwetara na onyeisiala nwere
ikike ime iwu na ọrụ nchekwa nke ụlọọrụ ahụ.
A na-atụ ụjọ na ụfọdụ mmadụ anwụọla dịka otu Lakurawa na-eyi ndụ egwu mere mwakpo na Kebbi Steeti
Ebe foto si, Getty Images
E nwere nnukwu
egwu na ụfọdụ mmadụ anwụọla oge ndị Lakurawa na-eyi ndụ egwu mere mwakpo n’ụfọdụ
obodo dị n’okpuru ọchịchị Arewa na Kebbi Steeti n’ụbọchị Wenezde 19 Febụwarị
2026.
Dịka ụfọdụ ndị
obodo na ndị nchekwa siri kwuo, ndị ojiegbe ahụ wakporo ime obodo ndị nọ n’okeala,
ma malite ịgba ndị mmadụ egbe.
Ndị isi ha pụtara
na njinji ahụ kọwara ya dịka mwakpo a haziri nke ọma nakwa nke na-amaghị nwata
maọbụ okenye.
Ngụkọ ndị nchekwa
wepụtara gosiri na ndị ekperima ahụ gburu mmadụ iri na isii na Mamunu, gbuo
mmadụ ise n’Awashaka, ebe mmadụ abụọ dị iche iche nwụrụ n’ime obodo ise ndị ọzọ.
Mwakpo ahụ butere obi mmapụ, ma manyekwa ndị obodo ịgbahapụ ụlọ ha, dịka ndị ojiegbe ahụ wakporo ụlọ dị iche iche na-agba ndị mmadụ egbe.
E zipụla ndị nchekwa kemgbe ka ha gaa chekwaa obodo ndị ahụ, nyere ndị isi ha pụtara aka, ma mechie ụzọ dị iche iche ndị ahụ mere mwakpo nwereike isi gbaa ọsọ.
Oge ọ na-akọwa nke a dịka eziokwu, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Kebbi Steeti bụ Bashir Usman sịrị na ha ga-ewepụtakwu ozi dịka nnyocha na-aga n’ihu.
Ndị be anyị, ụtụtụ ọma nu!
Nnọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde 20 Febụwarị, 2026.
Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ gbara ọkpụrụkpụ
si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile taa.
Ndị uweojii anwụchiela nwoke a na-enyo maka ntọ, igbu mmadụ n'Anambara
Ebe foto si, Gety images
Ndị uweojii n'Anambara steeti ekwuola na ha anwuchiela nwoke maka ebubo aka ya ịdi na ntọ na igbu mmadụ n'Urum dị n'Okpuru Ọchịchị Awka-North.
N'ozi mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga binyere aka ma wepụta, o kwuru na ọ bụ ndịagha si ogige '302 Artillery Regiment, Nigerian Army Cantonment' dị n'Ọnicha nyere nwoke ahụ n'aka ndị iwun'abalị ise nke ọnwa Febụrarị, afọ 2026.
A na-ebo ebubo na Onyenwe na Felix
Godwin na ndị ọzọ aka na-achọ achọ dunyere ndị ji ngwaọgụ wakpoo ndị madụ n’okporoụzọ
Urum.
Ozi ahụ kwuru na ka a gbara ya ajụjụ, na Onyenwe kwuru na Felix Godwin kwụtara N500,000 ka e were zụta ndị ojiegbe mmadụ anọ si k Ọchịchị Anyamelum
ka ha bịa mee mwakpo ahụ ma nyekwa ya ego dị ₦350,000 maka ịzụta mgbọ egbe.
Ọ gara n’ihu gbaa ama na mmadụ
isii bụ ihe merụ®ụ ahụ site na mgbọ egbe a gbara ha.
A tụọla onye bụbu Onyeisiala Saụt Koria nga mkpụrụọka maka itinye iwu ọnọdụ gbagbata
Ebe foto si, Reuters
A tụọla onye bụbụ onyeisiala mba Saụt Koria bụ bụ Yoon Suk Yeol nga mkpụrụọka maka ibute ọgbaghara na mba ahụ site iti iwu kpọbatara ndịagha.
Yoon gbaghara Iwu mba Saụt Koria, ziga ndịagha mechiri ụlọọmeiwu mba ahụ ma nwụchie ndị ndọrọndọrọ ọchịchị n'abalị atọ nke ọnwa Disemba afọ 2024, dịka ụlọikpe nke Seoul.
Yoon kagburu iwu ọhụrụ ahụ ka ọ gachara ụfọdụ awa, dịka ndịomeiwu ji ike baghachi n'ime Ụlọmeiwu ahụ ma kagbuo iwu ọhụrụ ahụ.
Ihe sochiri ya bụ esemokwu ndọrọndọrọ nakwa nchutu a chuturu ya n'ọkwa n'ike.
Ọkaikpe kpere ikpe ahụ bụ Ji Gwi-yeon kwuru na agwa Yoon kpara mebiri ọchịchị onyekwuoucheya nke mba ahụ n'ebe ọ dị ukwu ma kwesị ezi ntaramahụhụ.
Ndị na-ekpe ya ikpe chọrọ ka a ma ya ikpe ọnwụ
Yoon kwuburu na ihe mere o jiri tinye iwu ahụ bụ iji chekwaa ndị na-akwado mba Nọt Koria mana o teghị anya o doo anya na ọ bụ nsogbu dị n'ụlọ kpaliri ya dịka ndị anaọghị na pati ya karịrị n'ụlọomeiwu nke mere ka ọ bụrụ onyeisiala n'ọnụ, ọzọ bụ na nwunye ya bụ Kim Keon Hee bụ onye eborola ebọtụtụ ebubo nrụrụaka.
Hisbah bụ ndị uweojii okpukperechi alakụba ejidela mmadụ 9 na Kano steeti
Ebe foto si, HIZBA MAGAZINE/FACEBOOK
Hisbah bụ ndị uweojii okpukpere alakụba ejidela mmadụ
itoolu maka ịda iwu adịghị ebu ọnụ n’oge Ramadan.
Ha jidere mmadụ itoolu na-eri nri n’oge ibu ọnụ na Kano
steeti.
Kano bụ otu n’ime steeti dị icheiche na Naịjirịa bụ
ebe e nwere ọtụtụ ndị okpukpere alakụba ma bụrụkwa ebe iwu Sharia na-arụ ọrụ.
Mgbe ọbụla a
na-ebu ọnụ (Ramadan) ndị Hisbah na-agagharị n’ebe niile a na-ere nri na ọtụ ihe
ndị ọzọ na-achọ ndị okpukpere ha na-ada iwu.
N’ime Kano, ọtụtụ
ọlọ oriri na nkwari na-emepe ọkachasị ebe ndị ụka kraist ka n’ọnụ ọgụgụ.
Mujahid
Aminudeen bụ osote onyeisi Hisbah gwara BBC na ndị ha gedere bụ ụmụ nwaanyị abụọ
na ụmụ nwoke asaa.
N’okwu ya “anyị
jidere ha. Ha nọ n’ụlọọrụ anyị ebe anyị ga-akuziri ha uru ọ bara, etu e si ekpe
ekpere ma na-agụ akwụkwọ Quran, nakwa etu onye ezigbo onye alakụba”.
Gọọmenti Etiti emechiela ebe a na-egwupụta ihe ọtụtụ mmadụ nwụrụ na Plateau Steeti
Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị na-eru uju bịara ọlili ozu ndị ọrụ na-egwupụta ihe nwụrụ mgbe ihe mberede ahụ mere
Gọọmenti Etiti Naịjirịa emechiela ebe a na-egwupụta ihe n'ala dị na Plateau steeti dịka mmadụ ruru iri atọ na atọ nwụrụ
n’ụbọchị Wenezde abalị iri na asatọ nke ọnwa Febụwarị n'ihi 'gas' na-ehiehi.
Ihe ọdachi a mere obere
oge tupu anyanwụ apụta ma ọ bụrụ na a hapụchaa mpaghara obodo Wase nke ụlọọrụ na-egwupụta ihe nke
akpọrọ ‘Solid Unity Nigeria Ltd’ na-ahụ maka ya.
Akụkọ kwuru na ‘gas’
na-egbu egbu malitere ihiehi n'ebe ngwupụta ihe n'ime ala nke
mere ndị ọrụ ejighị enwetazi ikuku nke ọma.
E kwuru na saịtị
ahụ dị kilomita narị abụọ na anọ (124 miles) nọ na ndịda ọwụwa anyanwụ nke isi obodo
steeti Jos.
Ka ọ dị ugbua, a malitela ime nnyocha iji mara ihe kpatara ọdachi a mana ndị ọchịchị agabeghị ebe ahụ ileta ọnodụ
nchekwa ebe ahụ nke ndị ekperima na-enye nsogbu na ya.
Otu
onye ọrụ hụrụ ozu ndị otu ya nwụrụ anwụ mgbe ọ malitere ọrụ n'ụtụtụ na-esote abalị ahụ ihe ọdachi ahụ mere, gwara
BBC na e nwere ụfọdụ ndị ọrụ nọ n’ime ala arụ ọrụ ka dị ndụ mana e bugala ha n'ụlọọgwụ dị na
Wase
Safiyanu Haruna kwuru na ndị ọrụ ahụ bụ
ndị okpukperechi alakụba mechara ekpere n’ụtụtụ ma laghachite ịrụchapụ ọrụ ha
tupu ihe ọjọọ ahụ eme.
N’agbanyeghị na gọọmenti
Plateau Steeti kwuru na mmadụ iri atọ na atọ ahụ nwụrụ n’ihi ihe tiwara n'ebe ngwupụta ihe, Haruna kwuru na nke
ahụ abụghị eziokwu kama na “ọ bụ gas na-egbu egbu hiri ehi gburu ha.
Dịka o si kwuo “
enweghị ndị bịara ịzopụta ndị ọrụ ahụ mgbe ahụ maka ndị kwesịrị ịrụ ọrụ n’ụtụtụ
abịabeghị”
Cheta na afọ abụọ gara
aga, ọtụtụ ndị na-egwupụta ọlaedo nwụrụ dịka ha tọrọ n'okpuru ala na Naịja
steeti
Ọdachi a mere ugbua
nwereike imalite okwu gbasara nchekwa na ngalaba ebe ngwupụta ihe.