Taa ka a ga-ahazi ntuliaka ime obodo n'Abuja, nke mbụ kemgbe e binyere aka n'iwu ntuliaka ọhụrụ

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'izu a.

Nchịkọta

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa

  1. Dut Wọọdụe: A gụchala vootu mana e debanyeghị ya n'igwe BVAs

    Ndị ọrụ ntuliak
    Nkọwa foto, Ndị ọrụ ntuliaka

    Dịka a tụcharaa vootu n' Ụlọakwụkwọ 'LEA Primary School Dutse Makaranta, Dutse Wọọdụ dị na Bwari, a grụụ vootu a tụrụ.

    A gụchala vootu, debanye ihe a gụtara n'akwụkwọ ndị ọrụ otu pati binyekwara aka n 'akwụkwọ mpụtara ahụ.

    Mana e tinyeghị mpụtara hụ n'igwe BVAs. Oge onye ntaakụkọ anyị jụrụ ndị ọrụ ntuliaka, o kwuru na ọ bụ ha rụe na wọọdụ ebe ha ga-ezute onyeisi nlekọta ha(Supervising officer) ka a ga-eme nke a.

  2. Maka ntuliaka afọ 2027: APC ahaziela ọgbakọ ‘congress’ n’Ebonyi Steeti

    Maka ntuliaka afọ 2027: APC ahaziela ọgbakọ ‘congress’ n’Ebonyi Steeti

    Dịka a na-akwado maka ntuliaka afọ 2027 na Naịjirịa, ngalaba pati All Progressives Congress (APC) n’Ebonyi Steeti ahaziela ọgbakọ ‘congress’ nke ọchịchị ime obodo, bụ ebe ha nọọrọ họpụta ndị isi n’okpuru ọchịchị iri na atọ e nwere na steeti ahụ.

    Maka ntuliaka afọ 2027: APC ahaziela ọgbakọ ‘congress’ n’Ebonyi Steeti

    Oge onye ntaakụkọ BBC garuru n’okpuru ọchịchị Ọhaukwu, Ọhaọzara na Abakiliki, ndị niile ọ jụrụ ajụjụ gosiri afọ ojuju na ntuliaka ahụ.

    Maka ntuliaka afọ 2027: APC ahaziela ọgbakọ ‘congress’ n’Ebonyi Steeti

    Ụfọdụ n’ime ndị ahụ a jụrụ ajụjụ gụnyere onye ji ọkwa Onyeisioche APC n’okpuru ọchịchị Ọhaukwu bụ Ikechukwu Odonoh, onye zọrọ ọkwa onyeisioche n’okpuru ọchịchị Abakiliki bụ Chidiebere Alo, tinyekwara onye nwetara mmeri dịka onyeisioche n’okpuru ọchịchị Ọhaọzara bụ Michael Umahi.

    Maka ntuliaka afọ 2027: APC ahaziela ọgbakọ ‘congress’ n’Ebonyi Steeti

    Na mmalite ọgbakọ ahụ ka onyeisioche APC n’Ebonyi Steeti bụ Stanley Okoroemegha kwuru na ndị ndu pati ahụ dị ezi njikere ịhụ na ọgbakọ ahụ gara n’udo.

    Maka ntuliaka afọ 2027: APC ahaziela ọgbakọ ‘congress’ n’Ebonyi Steeti

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  3. Abịa steeti ehiwela ụlọ 'Nchedo' maka inye ụmụnwaanyị a wakporo n'ike nleta

    Alext Otti

    Ebe foto si, Priscila Otti

    Gọọmenti Abịa Steeti agbapeela ebe nleta pụrụ iche maka ileta ndị e dinara n'ike nakwa mkpagbu ezinaụlọ a kpọrọ 'Nchedo Sexual Assault Referral Centre' n'ogige ụlọọgwụ Aba General Hospital dị n'Aba, Abịa steeti.

    Ọrụ ụlọọrụ ahụ gụnyere nleta ahụike, nnyocha miri emi, ntuzaka iwu nakwa ndụmọdụ nye ndị e dinara n'ike maọbụ ndị e mekpara ahụ n'ihi na ha bụ nwaanyị maọbụ nwoke.

    Ọ bụ Minista na-ahụ maka ụmụnwaanyị bụ Imaan Sulaiman-Ibrahim bụ onye gbabere ebe nleta ahụ na nsonso a n'emume e mere n'Aba nke Gọvanọ Alex Otti nakwa nwunye ya bụ Priscilla Otti nọ n'isi ya.

    N'okwu ya na mmemme ahụ, Gọvanọ Otti katọrọ ndina n'ike, iti ihe, mmegbu ụmụaka nakwa ihe ọjọọ ndị ọzọ yiri ya ma kpọọ oku sị, "o kwesịrị ka anyị rịa n'ezi agwa nke na ọ gaghị adịkwa mkpa ịrụ ụdị ụlọọrụ a."

    Nwunye Gọvanọ Abia steeti bụ Priscila Otti

    Ebe foto si, Priscila Otti/Facebook

    Alex Otti

    Ebe foto si, Priscila Otti

  4. Mmadụ 70 anwụọla n’ime mmadụ 318 butere ọrịa Lassa fever na Naịjirịa - NCDC

    Lassa fever patients secondary contact and family members of Lassa fever victims lie on the floor at the Institute of Lassa Fever Research and Control in Irrua Specialist Teaching Hospital in Irrua, Edo State, midwest Nigeria, on March 6, 2018.

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ibelata ọrịa ndị na-efe efe na Naịjirịa bụ Nigeria Centre for Disease Control and Prevention (NCDC) ekwuola na mmadụ dị narị atọ na iri na asatọ ebutela ọrịa Lassa fever na Naịjirịa.

    NCDC kwuru na mmadụ iri asaa anwụọla gburugburu Naịjirịa site n’ọrịa ahụ kemgbe mmalite afọ 2026.

    Nnukwu Onyeisi ụlọọrụ NCDC bụ Dr Jide Idris kpughere nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n’ụbọchị Fraịde 20 Febụwarị 2026.

    Dr Idris kwuru na e debatala aha mmadụ otu puku narị anọ na iri isii na itoolu dịka ndị a na-enyo enyo na ha butere ọrịa Lassa fever.

    Onyeisi NCDC kwuru na steeti ise gụnyere Edo, Ondo, Taraba, Bauchi na Ebonyi mejupụtara pasenti iri itoolu na otu ndị butere ọrịa ahụ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    Iji hụ na a chụrụ ọrịa Lassa fever ọsọ ụkwụ eru ala, NCDC kwuru na ha ezigaala ndị ọrụ gbatagbata National Rapid Response Team na steeti asatọ gụnyere Bauchi, Ondo, Taraba, Edo, Benue, Jigawa na Plateau.

    Dr Idris gara n’ihu kwuo na NCDC na-agbakọọrọ gọọmenti steeti dị iche iche aka iji kwalite nnyocha, nlekọta ndị nwere ọrịa ahụ nakwa ịkpọtụrụ ndị obodo.

  5. Trump ewebatala ụtụisi 10% ọhụrụ dịka Ụlọikpe Kachasị jụrụ ịnabata ụtụisi mbubata ngwaahịa

    Trump ewebatala ụtụisi 10% ọhụrụ dịka Ụlọikpe Kachasị jụrụ ịnabata ụtụisi mbubata ngwaahịa

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump amanyela ụtụisi pasenti iri (10%) ọhụrụ maka mbaụwa dị iche iche iji dochie anya nke Ụlọikpe Kachasị kachapụrụ.

  6. A ga-ahazi ntuliaka ime obodo n'Abuja, nke mbụ kemgbe e binyere aka n'iwu ntuliaka ọhụrụ

    Onye ọrụ Inec na-ele ngwaọrụ ntuliaka n'afọ 2023

    Ebe foto si, Getty Images

    A ga-ahazi ntuliaka n'okpuru ọchịchị isii dị n'Abuja n'ụbọchị Satọde 21 Febụwarị, 2026.

    Ndị bi n'okpuru ọchịchị ndị a bụ ndị ga-eme ya - Abaji, Abuja Municipal, Bwari, Gwagwalada, Kuje na Kwali - a ga-atụnyere ndị isioche isii na ndị nnọchiteanya 62 nke Bekee kpọrọ councillor n'obodo 68 dị n'Abuja.

    Nke a ga-abụ nke mbụ a ga-ahazi ntuliaka kemgbe Onyeisiala Bola Tinubu binyere aka n'iwu ntuliaka ọhụrụ a kpọrọ Electoral Amendment Act n'ụbọchị 17 Febụwarị 2026.

    Iwu a kwuru na ọ bụghị sọọsọ igwe ka a ga-eji kesaa mpụtara ntuliaka, iwu a nyere ohere ka e ji aka dee mpụtara ntuliaka site n'ọba ntuliaka n'igwe ebe ndị mmadụ nwereike na-ahụ ya oge ọ na-eme.

    Mana ọtụtụ katọrọ nke a maka na ha sị na ọ ga-enye ohere ka e mee nrụrụaka tụmadị ebe ndị na-enweghị ikuku nziritaozi.

    Ha sị na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nwereike mee nke a etu ọbụla ọ sọrọ ha ma nyekwa ohere ime nrụrụaka.

    Agbanyeghị nke a, ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (INEC) ekwuola na ihe karịrị mmadụ otu nde na ụma ise (1.5m) anatala akwụkwọ ntuliaka ha bụ PVC n'ime otu nde na ụma iri isii na asatọ (1.68m) tinyere akwụkwọ n'Abụja.

    “Sọọsọ ndị binyere aka ịtụ vootu ka a ga-ekwe ka ha tụọ vootu n'ụbọchị ntuliaka,” ka ọnụ na-ekwuchitere INEC bụ Mohammed Haruna kwuru.

    Nke a bụ ntuliaka nke abụọ Onyeisioche INEC ọhụrụ bụ Joash Amupitan e nyere ọkwa n'ụbọchị 23 Ọktoba, 2025 na-ahazi.

    Ndị ọnụ na-eru n'okwu sị na ntuliaka Abuja a ga-abụ nnwale nye ụlọọrụ INEC, pati All Progressives Congress (APC) na Onyeisiala Tinubu dịka a na-echere ntuliaka na-abịa n'afọ 2027.

    N'agbanyeghị na onye ji ọkọlọtọ Labour Party zọọ ọkwa Onyeisiala bụ Peter Obi meriri n'Abuja n'afọ 2023, ọ naghị azọ ntuliaka a.

    O weliela aka ndị ji ọkọlọtọ African Democratic Congress (ADC) azọ ọkwa ọchịchị a, bụ ndị e chere na ha so Peter Obi pụta na Labour Party banye ADC.

    Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị * Ụlọikpe Kachasị n'Amerịka akagbuola ụtụegọ Trump

    Kedụ ngụkọ ndị ga-eso tuọ vootu?

    Ndị niile tinyere aha ha ịtụ vootu na ntuliaka Abuja bụ: 1,680,315

    Ndị niile natara akwụkwọ ntuliaka PVC bụ: 1,587,025

    Oche niile a na-azọ: 6

    Ndị niile na-azọ oche councillor: 62

    Otu ndọrọndọrọ ọchịchị ga-eso zọọ ntuliaka dị: 17

  7. Ndị igbo, ụnụ asaala chi eee?, Ọfọ anyị bụ ka ụbọchị taa maara anyị mma ooo

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde 21 Febụwarị, 2026.

    Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ, foto na vidio dị iche iche ga-amasị gị.

    Ya gazie!

  8. Mba Briten ga-amalite inye dijitalụ visa

    Ụlọọrụ na-enye akwụkwọ ikikere ịbanye mba Briten ekwuola na ha ga-amalite inye akwụkwọ ikikere dijitalụ maka ndị chọrọ ịbata mba Briten site n'ụbọchị 25 Febụwarị 2026 maka ndị dere ka ha nata akwụkọ ịbata bụ visa, maka na ha ga na-enye sọsọ eVisa.

    Ha sị na eVisa a ga-anọchịanya akwụkwọ visa ha na-atapa n'ime passports.

  9. Ụlọikpe Kachasị n'Amerịka akagbuola ụtụ egọ Trump

    Donald Trump

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọikpe Kachasị nke mba Amerịka akagbuola ụtụ ego Onyeisiala Donal Trump tụkwasara na ngwaahịa na mba ụwa

    N'afọ 2025, Trump tinyere ego ụtụisi a ngwaahịa a na-atụbata n'Amerịka, sị na ọ bụ iji nyere Amerịka aka na mmepụtangwaahịa

    Mana kama inweta nkwado ụlọomeiwu c, Trump gbadoro ụkwụ na iwu nke afọ Gbatgbata nke Akụnaụba mba ụwa nke afọ 1977(International Emergency Economic Powers Act. Declaring an emergency 1977) were tinye n'ọrụ ozugbo.

    N'ọnwa Ọgọst afọ 2025, Ụlọikpe Mkpegharị nke Amerịka nyere mkpebi na ọtụtụ ụtụego ahụ Trump tinyere megidere iwu mana hapụ ya.

    Mana Ụlọikpe Kachasị tinyere aka n'ikpe ahụ dịka Ụlọọrụ Onyeisial (White House rịọrọ ka ọ kagbuo mskpebi nke Ụlọikpe Mkpegharị nyere..

  10. Ụlọikpe Tunisịa atụọla onye omeiwu mkpọrọ maka ịkatọ Onyeisiala Saied na soshal midia

    Foto Onyeisiala Kais Saied

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọikpe mba Tunisịa atụọla onye omeiwu mba ahụ mkpọrọ ọnwa asatọ maka ebubo ịkwa Onyeisiala Kais Saied emo na soshal midịa.

    A nwuchiri Ahmed Saidani na mmalite ọnwa Febúwarí oge o wepụtara ozi na soshal midịa oge Onyeisiala Saied gara mgbaru n’ogige idemmiri wakporo ma kpọ ya “onye ndu mkpocha akwara mmiri ozuzu”.

    Ọkaiwu na-anọchiteanya Saidani bụ Houssem Eddine Ben Attia gwara ụlọọrụ AFP na gọọmenti ji iwu megidere mmetọ mgbasaozi na imeru ndị ọzọ ahụ na soshal midịa, kpagbu Saidani.

    Iwu ahụ bụ nke nwere ike ime ka mmadụ nweta ntaramahụhụ mkpọrọ ruru afọ abụọ.

    Ọtụtụ ụlọọrụ na-achekwa ikike mmadụ katọrọ ikpe ahụ a mara Saidani ma kwuo na nke gosiri aka ike Onyeisiala Saied ji achị mba Tunisịa kemgbe ọ kagburu ụlọomeiwu mba ahụ n’afọ 2021.

    Na nso nso a, Saidani bụbu onye nkwado Onyeisiala Saied, amalitela ikwu ma na-akatọ ọchịchị ya.

  11. E mechiela ụlọakwụkwọ niile dị n’Abuja n’ihi ntuliaka okpuru ọchịchị

    Onye na-eme ntuliaka na ntuliaka Febụwarị 2023

    Ebe foto si, Getty Images

    E mechiela ụlọakwụkwọ niile dị n’isi obodo Naịjirịa bụ Abuja dịka a na-akwado ịhazi ntuliaka okpuru ọchịchị n’ụbọchị Satọde 21 Febụwarị 2026.

    A hụrụ ka ụmụakwụkwọ na-alaghachi n’ụlọ ha mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere itoolu nke ụtụtụ, n’ihi ntuziaka e nyere ka e mechie ụlọakwụkwọ niile maka ntuliaka ahụ.

    Ntuziaka ahụ bụ n’ihi atụmatụ e mere iji ọtụtụ ụlọakwụkwọ ọhanaeze mere ogige ntuliaka nakwa ogige ngụkọ vootu n’ogogo wọọdụ.

    Nke a bụ iji hụ na a haziri ihe niile nke ọma maka ntuliaka ga-adị n’okpuru ọchịchị isii dị n’Abuja.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    N’otu aka ahụ, ndị uweojii ekwuola na agaghị eme ngagharị n’Abuja malite n’elekere isii nke ụtụtụ ruo elekere isii nke mgbede n’ụbọchị Satọde 21 Febụwarị 2026.

    Kọmịshọna ndị uweojii n’isi obodo bụ Miller G. Dantawaye kwuru na ọnọdụ a ga-emetụta ndị niile bi n’Abuja e wezuga ndị ọrụ ha dị oke mkpa nakwa ndị ọrụ ntuziaka e nyere nkwado.

  12. Otu ndị ọrụ PENGASSAN agwala Onyeisiala Tinubu ka ọ kagbuo iwu ọhụrụ gbasara ego mmanụ

    Onyeisiala Tinubu binyereka n’iwu mmanụ ọhụrụ n’ụbọchị Wenezde 18 Febụwarị 2026 maka ụlọọrụ FAAC iwepụ ego mmanụ na ‘gas’ ozugbo.

    Ebe foto si, PENGASSAN/X

    Nkọwa foto, Onyeisiala Tinubu binyereka n’iwu mmanụ ọhụrụ n’ụbọchị Wenezde 18 Febụwarị 2026 maka ụlọọrụ FAAC iwepụ ego mmanụ na ‘gas’ ozugbo.

    Otu ndị orụ mmanụ agbadị nke Naịjịrịa bụ PENGASSAN agawala Onyeisiala Bola Tinubu ka ọ kagbuo iwu ‘Executive Order’ nke ikike wepụrụ ụlọọrụ mmanụ ala nke Naịjịrịa NNPC Limited iwepụ ego mmanụ dịka ụlọmgbasa ozi mpaghara siri kwuo.

    Cheta na Onyeisiala Tinubu binyereka n’iwu mmanụ ọhụrụ n’ụbọchị Wenezde 18 Febụwarị 2026 maka ụlọọrụ FAAC iwepụ ego mmanụ na ‘gas’ ozugbo.

    N'okwu ya n'oge mkparịtaụka ndị ntaakụkọ n’ụbọchị Tọzde, Festus Osifo, onyeisiala mba nke PENGASSAN, kwuru na iwu ahụ bụ "mwakpo” megide iwu ‘Petroleum Industry Act’.

    Osifo kwuru na onyeisiala ejirila iwu ọhụrụ ahụ "wepụ iwu nke Federal Republic nke Nigeria".

    "Anyị chere na onyeisiala kwesịrị ikagbu iwu ahụ ozugbo, ma leba anya na ya ọzọ, n'ihi na anyị maara na onyeisiala Naịjirịa emeela ihe niile o kwesịrị ịme iji dọta itinye ego na ụlọọrụ mmanụ na gas nke Naịjirịa," ka o kwuru.

    Onyeisi otu ndị ọrụ PENGASSAN kwetara na onyeisiala nwere ikike ime iwu na ọrụ nchekwa nke ụlọọrụ ahụ.

    Lee akụkọ ọzọ ga-amasị gị

  13. A na-atụ ụjọ na ụfọdụ mmadụ anwụọla dịka otu Lakurawa na-eyi ndụ egwu mere mwakpo na Kebbi Steeti

    Musa Sani and Murtala Ibrahim, community guards, pose for a portrait in Baidi, Nigeria on January 26, 2026. Days before, Lakurawa attacked this village and killed several people.

    Ebe foto si, Getty Images

    E nwere nnukwu egwu na ụfọdụ mmadụ anwụọla oge ndị Lakurawa na-eyi ndụ egwu mere mwakpo n’ụfọdụ obodo dị n’okpuru ọchịchị Arewa na Kebbi Steeti n’ụbọchị Wenezde 19 Febụwarị 2026.

    Dịka ụfọdụ ndị obodo na ndị nchekwa siri kwuo, ndị ojiegbe ahụ wakporo ime obodo ndị nọ n’okeala, ma malite ịgba ndị mmadụ egbe.

    Ndị isi ha pụtara na njinji ahụ kọwara ya dịka mwakpo a haziri nke ọma nakwa nke na-amaghị nwata maọbụ okenye.

    Ngụkọ ndị nchekwa wepụtara gosiri na ndị ekperima ahụ gburu mmadụ iri na isii na Mamunu, gbuo mmadụ ise n’Awashaka, ebe mmadụ abụọ dị iche iche nwụrụ n’ime obodo ise ndị ọzọ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    Mwakpo ahụ butere obi mmapụ, ma manyekwa ndị obodo ịgbahapụ ụlọ ha, dịka ndị ojiegbe ahụ wakporo ụlọ dị iche iche na-agba ndị mmadụ egbe.

    E zipụla ndị nchekwa kemgbe ka ha gaa chekwaa obodo ndị ahụ, nyere ndị isi ha pụtara aka, ma mechie ụzọ dị iche iche ndị ahụ mere mwakpo nwereike isi gbaa ọsọ.

    Oge ọ na-akọwa nke a dịka eziokwu, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Kebbi Steeti bụ Bashir Usman sịrị na ha ga-ewepụtakwu ozi dịka nnyocha na-aga n’ihu.

  14. Ndị be anyị, ụtụtụ ọma nu!

    Nnọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde 20 Febụwarị, 2026.

    Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile taa.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ, foto na vidio dị iche iche anyị ji bịa.

    Ya gazie!

  15. Ndị uweojii anwụchiela nwoke a na-enyo maka ntọ, igbu mmadụ n'Anambara

    Ịga

    Ebe foto si, Gety images

    Ndị uweojii n'Anambara steeti ekwuola na ha anwuchiela nwoke maka ebubo aka ya ịdi na ntọ na igbu mmadụ n'Urum dị n'Okpuru Ọchịchị Awka-North.

    N'ozi mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga binyere aka ma wepụta, o kwuru na ọ bụ ndịagha si ogige '302 Artillery Regiment, Nigerian Army Cantonment' dị n'Ọnicha nyere nwoke ahụ n'aka ndị iwun'abalị ise nke ọnwa Febụrarị, afọ 2026.

    A na-ebo ebubo na Onyenwe na Felix Godwin na ndị ọzọ aka na-achọ achọ dunyere ndị ji ngwaọgụ wakpoo ndị madụ n’okporoụzọ Urum.

    Ozi ahụ kwuru na ka a gbara ya ajụjụ, na Onyenwe kwuru na Felix Godwin kwụtara N500,000 ka e were zụta ndị ojiegbe mmadụ anọ si k Ọchịchị Anyamelum ka ha bịa mee mwakpo ahụ ma nyekwa ya ego dị ₦350,000 maka ịzụta mgbọ egbe.

    Ọ gara n’ihu gbaa ama na mmadụ isii bụ ihe merụ®ụ ahụ site na mgbọ egbe a gbara ha.

  16. A tụọla onye bụbu Onyeisiala Saụt Koria nga mkpụrụọka maka itinye iwu ọnọdụ gbagbata

    Yoon Suk Yel

    Ebe foto si, Reuters

    A tụọla onye bụbụ onyeisiala mba Saụt Koria bụ bụ Yoon Suk Yeol nga mkpụrụọka maka ibute ọgbaghara na mba ahụ site iti iwu kpọbatara ndịagha.

    Yoon gbaghara Iwu mba Saụt Koria, ziga ndịagha mechiri ụlọọmeiwu mba ahụ ma nwụchie ndị ndọrọndọrọ ọchịchị n'abalị atọ nke ọnwa Disemba afọ 2024, dịka ụlọikpe nke Seoul.

    Yoon kagburu iwu ọhụrụ ahụ ka ọ gachara ụfọdụ awa, dịka ndịomeiwu ji ike baghachi n'ime Ụlọmeiwu ahụ ma kagbuo iwu ọhụrụ ahụ.

    Ihe sochiri ya bụ esemokwu ndọrọndọrọ nakwa nchutu a chuturu ya n'ọkwa n'ike.

    Ọkaikpe kpere ikpe ahụ bụ Ji Gwi-yeon kwuru na agwa Yoon kpara mebiri ọchịchị onyekwuoucheya nke mba ahụ n'ebe ọ dị ukwu ma kwesị ezi ntaramahụhụ.

    Ndị na-ekpe ya ikpe chọrọ ka a ma ya ikpe ọnwụ

    Yoon kwuburu na ihe mere o jiri tinye iwu ahụ bụ iji chekwaa ndị na-akwado mba Nọt Koria mana o teghị anya o doo anya na ọ bụ nsogbu dị n'ụlọ kpaliri ya dịka ndị anaọghị na pati ya karịrị n'ụlọomeiwu nke mere ka ọ bụrụ onyeisiala n'ọnụ, ọzọ bụ na nwunye ya bụ Kim Keon Hee bụ onye eborola ebọtụtụ ebubo nrụrụaka.

  17. E jidere nwa Robert Mugabe na mba Saụt Afrịka maka ebubo ịchọ igbu mmadụ

    Bellarmine Mugabe.

    Ebe foto si, Anadolu Agency via Getty Images

    Ndị uweojii mba Saụt Afrịka ejidela nwa onye bụbu Onyeisiala mba Zimbabwe nwụrụ anwụ bụ Robert Mugabe maka ebubo ịwale igbu mmadụ.

    E jidere Bellarmine Mugabe dị afọ 28 maka ebubo ịgbalị igbu ọchụ n’ụlọ ebe a gbara egbe na mpaghara Johannesburg.

    Ndị uweojii kpụrụ Bellarmine Mugabe dịka a gbachara otu nwoke gbara afọ 23 e chere na ọ bụ onye ọrụ ugbo flawa egbe, merụọ ya ahụ.

    Onye uweojii mere nnyocha n’ụlọ ahụ bụ ebe nwa Mugabe bi, hụrụ mkpọ egbe.

    Bellarmine Mugabe bụ otu n’ime ụmụaka nwunye Mugabe nke abụọ a na-akpọ Grace Mugabe mụrụ.

    Robert Mugabe, bụ onye nwụrụ n’afọ 2019, chịrị mba Zimbabwe afọ 37 tupu e wepụ ya n’ọkwa ọchịchị mgbe ọ gbara afọ 93 n’afọ 2017.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Dimakatso Nevhuhulwi kwuru na e jidekwara out nwoke ọzọ.

    Gụọ akụkọ anyị ndị ọzọ n'ebe a:

  18. Hisbah bụ ndị uweojii okpukperechi alakụba ejidela mmadụ 9 na Kano steeti

    Hisbah

    Ebe foto si, HIZBA MAGAZINE/FACEBOOK

    Hisbah bụ ndị uweojii okpukpere alakụba ejidela mmadụ itoolu maka ịda iwu adịghị ebu ọnụ n’oge Ramadan.

    Ha jidere mmadụ itoolu na-eri nri n’oge ibu ọnụ na Kano steeti.

    Kano bụ otu n’ime steeti dị icheiche na Naịjirịa bụ ebe e nwere ọtụtụ ndị okpukpere alakụba ma bụrụkwa ebe iwu Sharia na-arụ ọrụ.

    Mgbe ọbụla a na-ebu ọnụ (Ramadan) ndị Hisbah na-agagharị n’ebe niile a na-ere nri na ọtụ ihe ndị ọzọ na-achọ ndị okpukpere ha na-ada iwu.

    N’ime Kano, ọtụtụ ọlọ oriri na nkwari na-emepe ọkachasị ebe ndị ụka kraist ka n’ọnụ ọgụgụ.

    Mujahid Aminudeen bụ osote onyeisi Hisbah gwara BBC na ndị ha gedere bụ ụmụ nwaanyị abụọ na ụmụ nwoke asaa.

    N’okwu ya “anyị jidere ha. Ha nọ n’ụlọọrụ anyị ebe anyị ga-akuziri ha uru ọ bara, etu e si ekpe ekpere ma na-agụ akwụkwọ Quran, nakwa etu onye ezigbo onye alakụba”.

    Gụọ akụkọ anyị ndị ọzọ n'ebe a:

  19. Ndị omeiwu na Rịvas steeti akwụsịla atụmatụ iwepu Gọvanọ Fubara n’ọchịchị

    Gọvanọ Sim Fubara na-achị Rịvas steeti.

    Ebe foto si, RSGH Media

    Nkọwa foto, Gọvanọ Sim Fubara

    Ndị omeiwu na Rịvas steeti akwụsịla atụmatụ n'usoro iwu ha chọrọ iji nwepụ Gọvanọ Sim Fubara na osote ya bụ Ngozi Odu n’ọkwa.

    Nke a na-eme dịka Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu gbatara ma kwụsị atụmatụ ndị ụlọ omeiwu nwere iwepụ Fubara n’ọkwa.

    Ọ bụ n’ọgbakọ ndị omeiwu mere n’ụbọchị Tọzde na Pọtakọt ka ha nọ kwụsị usoro iwepụta Fubara n’ọchịchị.

    Cheta na kamgbe afọ a na ndị omeiwu na Rịvas steeti na Gọvanọ steeti ahụ bụ Sim Fubara na-enwe nnukwu nghọtafe.

    Otu n’ime ihe na-esere ha okwu gunyere ebubo ndị omeiwu na-ebo gọvanọ Fubara maka etu ọrụ gọọmenti si aga na steeti ahụ.

    Gụọ akụkọ anyị ndị ọzọ n'ebe a:

  20. Gọọmenti Etiti emechiela ebe a na-egwupụta ihe ọtụtụ mmadụ nwụrụ na Plateau Steeti

    Ọtụtụ ndị na-eru uju bịara ọlili ozu ndị ọrụ na-egwupụta ihe nwụrụ mgbe ihe mberede ahụ mere
    Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị na-eru uju bịara ọlili ozu ndị ọrụ na-egwupụta ihe nwụrụ mgbe ihe mberede ahụ mere

    Gọọmenti Etiti Naịjirịa emechiela ebe a na-egwupụta ihe n'ala dị na Plateau steeti dịka mmadụ ruru iri atọ na atọ nwụrụ n’ụbọchị Wenezde abalị iri na asatọ nke ọnwa Febụwarị n'ihi 'gas' na-ehiehi.

    Ihe ọdachi a mere obere oge tupu anyanwụ apụta ma ọ bụrụ na a hapụchaa mpaghara obodo Wase nke ụlọọrụ na-egwupụta ihe nke akpọrọ ‘Solid Unity Nigeria Ltd’ na-ahụ maka ya.

    Akụkọ kwuru na ‘gas’ na-egbu egbu malitere ihiehi n'ebe ngwupụta ihe n'ime ala nke mere ndị ọrụ ejighị enwetazi ikuku nke ọma.

    E kwuru na saịtị ahụ dị kilomita narị abụọ na anọ (124 miles) nọ na ndịda ọwụwa anyanwụ nke isi obodo steeti Jos.

    Ka ọ dị ugbua, a malitela ime nnyocha iji mara ihe kpatara ọdachi a mana ndị ọchịchị agabeghị ebe ahụ ileta ọnodụ nchekwa ebe ahụ nke ndị ekperima na-enye nsogbu na ya.

    Otu onye ọrụ hụrụ ozu ndị otu ya nwụrụ anwụ mgbe ọ malitere ọrụ n'ụtụtụ na-esote abalị ahụ ihe ọdachi ahụ mere, gwara BBC na e nwere ụfọdụ ndị ọrụ nọ n’ime ala arụ ọrụ ka dị ndụ mana e bugala ha n'ụlọọgwụ dị na Wase

    Safiyanu Haruna kwuru na ndị ọrụ ahụ bụ ndị okpukperechi alakụba mechara ekpere n’ụtụtụ ma laghachite ịrụchapụ ọrụ ha tupu ihe ọjọọ ahụ eme.

    N’agbanyeghị na gọọmenti Plateau Steeti kwuru na mmadụ iri atọ na atọ ahụ nwụrụ n’ihi ihe tiwara n'ebe ngwupụta ihe, Haruna kwuru na nke ahụ abụghị eziokwu kama na “ọ bụ gas na-egbu egbu hiri ehi gburu ha.

    Dịka o si kwuo “ enweghị ndị bịara ịzopụta ndị ọrụ ahụ mgbe ahụ maka ndị kwesịrị ịrụ ọrụ n’ụtụtụ abịabeghị”

    Cheta na afọ abụọ gara aga, ọtụtụ ndị na-egwupụta ọlaedo nwụrụ dịka ha tọrọ n'okpuru ala na Naịja steeti

    Ọdachi a mere ugbua nwereike imalite okwu gbasara nchekwa na ngalaba ebe ngwupụta ihe.

    Gụọ akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a: