You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Yukren, Amerịka bịnyere aka na nkwekọrịta akụ na ụba sitere n'okike maka ịkwụsị mwakpo Rọshịa

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Eprel 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Onye nnọchiteanya Amerịka ekwuola na Afrịka dị Trump mkpa n’agbanyeghị nkwụsị enyemaka

    Nnukwu onye ndụmọdụ mba Amerịka maka okwu ndị metụtara Afrịka bụ Massad Boulos ekwuola na onyeisiala mba ha bụ Donald Trump ji Afrịka kpọrọ ihe dị oke mkpa.

    Ọ sịrị na nke a bụ n’agbanyeghị nkwụsị enyemaka buterela ọnọdụ gbatagbata gburugburu mba Afrịka.

    N’ụbọchị mbụ Trump banyere n’ọkwa n’ọnwa Jenụwarị ka o kwuputara nkwụsị enyemaka ahụ.

    E nweela ụjọ na nkwekọrịta azụmaahịa dị n’etiti Amerịka na Afrịka nwereike ịbịa n’isi njedebe n’ihi ụtụisi Trump tinyere na ngwaahịa na nso nso a.

    Ka o sinadị, Boulos gwara BBC Newsday sị na Afrịka dị Trump “ezigbo mkpa” ma kụsasịa ụfọdụ akụkọ a na-ebugharị na mba Amerịka na-eme atụmatụ imechi ụfọdụ atụmatụ ndị ha nwere n’Afrịka.

    “O ji Afrịka na ụmụafọ mba Afrịka kpọrọ ihe bara uru,” ka Boulos gbakwunyere.

  2. Ihe karịrị mmadụ 20,000 agbakọọla na Vatịkan dịka a malitere ikiri ozu Pope Francis

    E bupula ozu Popu Francis n’ebe obibi ya dị na Vatịkan ma buru ya gawa St Peter’s Basilica maka ịgbatị ya n’akwa ndina.

    Ndị na-eru uju kwụ n’ahịrị ugbua na-agafe akpati ozu ya, bụ nke ga-anọ n’ihu ebe nchụaja Popu n’ime mkpụrụ ụbọchị atọ ọhanaeze ga-eru uju.

    Mmadụ abụọ lụrụ di na nwunye ọhụrụ bụ Luis na Macarena gwara BBC na Popu “ga-esi n’eluigwe gọzie anyị” ebe ndị obodo ahụ nwere olileanya na onye ga-anọchi anya Popu Francis “ga-eso nzọụkwụ ya”.

    Popu Francis nwụrụ n’ụtụtụ ụbọchị Mọnde 21 Eprel ebe akwamozu ya ga-adị n’ụbọchị Satọde 26 Eprel 2025, nke ndị ndu si mpaghara ụwa dị iche iche ga-aga.

  3. Ndị isi mba Amerịka ewepụla onwe ha na mkparịtaụka nkwụsị agha Rọshịa na Yukren na London

    Mkparịtaụka na-eme na London iji nweta nkwekọrịta nkwụsị agha Yukren na Rọshịa agaghịzi agụnye onye odeakwụkwọ nke Amerịka Marco Rubio na onye nnọchiteanya pụrụ iche Steve Witkoff.

    Nzukọ ahụ ga-eme na Wenezde ga-abụ n’etiti ndị isi mba UK, Fransị, Jamini, Amerịka na Yukren ebe odeakwụkwọ UK na-ahụ maka ihe na-eme na mba ofesi David Lammy na onye otu ya nke mba Yukren ga-enwe nzukọ.

    Onye nnochiteanya Onyeisiala Trump na Yukren Gen Keith Kellogg ga-esonye na mkparịtaụka ahụ kama Witkoff na Rubio, kọwaara ya dịka nzukọ ọrụ.

    Kama Odeakwụkwọ mba Amerịka ga-agbado anya na mkparịtaụka nke Rọshịa n’izu a, dịka mba ụwa na-agbasi mbọ ike ka akwụsị agha Yukren.

    Akụkọ na-efegharị na-ekwu na Rọshịa nwereike ikwe ka akwụsị agha iji nwete nnukwu ohere ndị ọzọ.

    N’aka nke ọzọ, Onyeisiala mba Yukren Volodymyr Zelensky kwuru na Yukren agaghị ekwe inye Rọshịa mpaghara Crimea ha weghaara, mgbe akụkọ kwuru na mba Amerịka na Kremlin na-atụle nke ahụ.

    Cheta na Rọshịa na-aga n’ihu na mwakpo Yukren n’ụbọchị Wenezde dịka ha kwụsịtụrụ maka Ista.

    Mmadụ itoolu nwụrụ ebe ọtụtụ mmadụ ọzọ merụrụ ahụ n’ọwụwa anyanwụ obodo Marhanets nke Yukren mgbe duronu Rọshịa tụrụ bọs bu ndị ọrụ.

    Ndị ọchịchị kwuru na e mebiri nkụrụngwa ọkụ eletrik dị na ndịda mpaghara Kherson n’ihi mwakpo mba Rọshịa.

  4. Ndị ojiegbe egbuola ndị njem nleta mmadụ 26 Kashmir nke India

    Ndị ojiegbe egbuola ndị njem nlegharị anya mmadụ iri abụọ na isii (26) na Kashmir nke India na-achị.

    Akụkọ na-egosi na ụfọdụ ndị merụrụ ahụ nọ n'ọnọdụ dị oke egwu nke mere ka ụjọ na iwe na-abawanye ugbua na mba ahụ.

    Mwakpo ahụ mere n’ụbọchị Tuzde 22 Eprel 2025 na Pahalgam, nke obodo Himalayan ama ama maka ndagwurugwu ya dị egwu.

    E nwebeghị ozi ndị ọchịchị wepụtara gbasara ndị mere nwakpo ahụ mana ụfọdụ ụlọ mgbasa ozi kwuru na ọ bụ ndị ha na otu Lashkar-e-Taiba nke dị na Pakistan nwere mmekọ kwuru na ọ bụ ha mere mwakpo ahụ.

    N’ihi nke a, Praịm mịnịsta Narendra Modi akwụsịla nleta ya na Saudi Arabịa ịlaghachita na Delhi nke Indịa.

    Kashmir, nke ndị India na Pakistan na-ekwu na ọ bụ nwe, ahụla ọgbaaghara ndị nnupụisi dị ogologo iri afọ nke na-emegide India - nke a kpatara ọnwụ ọtụtụ puku mmadụ - mana mwakpo nke mbuso ndị njem nlegharị anya agha bụ ihe anaghị emekarị.

    Mịnịsta na-ahụ maka mpaghara ahụ bụ Omar Abdullah kwuru na mwakpo ahụ karịrị mbuso agha ha hụgoro e busoro ndị nkịtị n’afọ ndị adịbeghị anya.

  5. Onyeisiala Gana akwụsịla onyeisi ọka ikpe Gertrude Torkornoo ọrụ

    Onyeisiala mba Gana John Mahama akwụsịla onyeisi ọka ikpe na-ahụ maka ụlọikpe kachasị elu na mba ahụ ọrụ - n'ụzọ na-enwetụbeghị ụdị ya.

    A malitela nnyocha dịka e tinyere akwụkwọ mkpesa atọ a na-akọwaghị onye na-eme ebubo megide Gertrude Torkornoo, na-akpọ oku ka e wepụ ya na-ọkwa.

    Cheta na ndị ọka ikpe na Gana na-enwe nchebe nke oge ọrụ ha – nke a pụtara na ọ bụ n'ihi ihe ole na ole ga-eme ka ewepụ ha n'ọkwa ọchịchị, nke gụnyere enweghị ike na omume ọjọọ.

    Ekwupụtaghị ihe dị n'akwụkwọ mkpesa ahụ n'ihu ọha, mana ọka ikpe ahụ a kabeghịkwa ịza ajụjụ, ebe onye bụbu onye ọkaiwu na mba Gana kwuru na nkwụsiọrụ ya bụ mbọ iji mebie ụlọikpe.

    "Echere m na ọ bụ ime ka a ga-asị zuru oke," Godfred Yeboah Dame gwara BBC.

    Torkornoo bụ nwaanyị nke atọ nwere ọkwa nke onye ọka ikpe na Gana, nke onye bụbu Onyeisiala Gana Nana Akufo-Addo tinyere n’ọkwa n’afọ 2023.

  6. A ga-ebuga Popu Francis na St Peter Basịlịka maka ọha iru uju

    A ga-ebuga ahụ Popu Francis na St Peter Basịlịka taa bụ Wenezde ebe ọ ga-edina ka ndị mmadụ were malite iru uju.

    Dịka etu emume olile Popu ga-esi aga, Kardịnal Kevin Farrell ga-edu n’ekpere tupu e bupụ ahụ Popu ebe ọ dị na Chapel nke Casa Santa Marta, bụ ebe obibi ya.

    Oge ọ kụrụ elekere itoolu nke obodo ahụ, a ga-eburu akpati e tinyere Popu nọ n’ebe obibi ya na Casa Santa Marta gawa na St Peter Basịlịka.

    A ga-eme ngagharị ga-agafe na Piazza Santa Marta na Piazza dei Protomartiri Romani tupu ha abanye na St Peter Basịlịka.

    Kadịnal Farrell ga-ahụ maka usoro ekpere na Okwu Chukwu, nke ga-abụ karị ọtụtụ agụmagụ sitere na Akwụkwọ Nsọ.

    Akpati ozu Popu ga-anọzi ebe ahụ ka ọha mmadụ were nwee ike ịkwanyere ya ugwu ikpeazụ tupu mgbe olili ya n’ụbọchị Satọde 26 Eprel 2025.

  7. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma nụ.

    Nnọọ nụ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde 23 Eprel, 2025.

    Anyị na-asị ya dịkwara nụ mma oo.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga na-ewetere anyị akụkọ ihe na-eme n’ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka nakwa n’ụwa niile.

    Chinonso Ugorji ga-emechaa sonyere anyị n’oge ehihe.

    Ya gazie!

  8. E wepụtala aha ndị ga-aga akwamozu Popu Francis

    A ga-ahazi akwamozu Popu Francis na Vatịkan n’ụtụtụ ụbọchị Satọde 26 Eprel 2025.

    Prince William ga-esonyere ụfọdụ ndị ndu mbaụwa gụnyere onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump, onyeisiala Fransị bụ Emmanuel Macron na onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky n'akwamozu Popu Francis.

    Ọ ga-anọchiteanya Eze Charles III n'akwamozu ahụ.

    N’ụtụtụ taa ka Vatịkan kesara onyonyoo Popu ahụ nwụrụ anwụ ebe o dina n’ime akpati ozu ghe oghe.

    Ha wepụtakwara usoro akwamozu Popu ahụ n’uju.

    N’ụbọchị Wenezde 23 Eprel 2025 ka a ga-eburu ozu Popu Francis gaa St Peter’s Basilica ka ọhanaeze ruo uju ya.

    Ka o sinadị, ndị njem kwere ekwe agaala n’ihu na-enubata na St Peter’s Square.

    Ụmụ mmadụ si akụkụ ụwa dị iche iche agakwaala n’ihu na-ekwuputa ka obi dị ha gbasara ọnwụ Popu.

  9. Popu ọhụrụ o nwereike ịbụ onye Afrịka?

    Dịka ụwa na-eru ụjụ maka ọnwụ Popu Francis, ụka Katọlik amalitela usoro ịhọpụta onye ga-abụ onyeisi ụka ha.

    Kadịnal atọ si Afrịka; otu sị mba Democratic Republic of Kongo, otu si Gana ebe nke atọ si mba Gini (Guinea) so na ndị a na-ele anya ga-eso zọọ ọkwa Popu.

    Ọ pụtara na e nwereike isi n’Afrịka nweta Popu onyeisi ojii mbụ?

    Achịboshọpụ nke Abuja bụ Ignatius Kaigama gwara BBC na olileabnya maka onye ga-abụ popu.

    “A gwara anyi na e nweela Popu onye Afrịka nnukwu afọ gara aga mana n’agba ọhụrụ a, e nwebeghị onye isi ojii bụrụla popu.”

    “Onye Afrịka nwereike ịbụrụ Popu.”

    E nwere ndị Kadinal si Afrịka nwere ohere dịka ndị Kadinal si Yurop na Amerịka inweta ọkwa ahụ.”

    Ọkwa ahụ abụghị maka Popu si Afrịka maọbụ Eshia, maọbụ Amerịka. Ihe a na-ekpe ekpere ya bụ popu bụ ezigbo mmadu ma dị nsọ nke nwereike ịbu onye Afrịka, Eshia maọbụ Amerịka.”

  10. Emume olili ozu Popu Francis ga-abụ n'ụbọchị Satọdee

    N’ụbọchị Satọde ka emume olili ozu Popu Francis ga-ebido dịka ozi si na Vatịkan apụta ugbua.

    A na-atụ anya na ndị isiala na ndị ọchịchị dị icheiche ga-esi na mba ụwa bịa mmeme olili ozu Popu Francis.

    Ugbu, e dosere ozu Popu Francis n’ime akpatị ozu a na-ahụ onye nọ n’ime ya n'ime chapụụ dị na Vatịkan bụ ebe ndị nchekwa na-eche ozu ya ebe ndị kadịna na-ekpe ekpere ya ekpere.

    Ụtụtụ echi ka a ga-eji ozu ya mee ngaharị na St. Pita Basilika bụ ebe ndị mmadụ ga-abịa kirie ya ma hụ ya anya ikpeazụ.

    Ulọ ebe o bi ugbua ka a machiri nke na-egosi na-enweghịzị Popu ugbua, nke pụtara na ohere dị n’oche ya. Ụlọ ahụ ga-adị etu ahụ ruo mgbe a ga-ahọpụta onye ọzọ.

  11. Ndị Kadịnal ga-ezukọ na Vatịkan maka iwepụta ụbọchị olili Popu Francis

    A na-atụ anya na ndị Kadịnal ga-ezukọ na Vatịkan n’ụtụtụ taa iji kwekọrịta maka ụbọchị olili Popu Francis bụ onye nwụrụ n’ụbọchị Mọnde 21 Eprel 2025 oge ọ gbara afọ iri asatọ na asatọ (88).

    Vatịkan kwuru na ọ nwụrụ n'ihi ọrịa strok na nkụda mmụọ nke na-esote ya.

    Ọnwụ Popu ebutela ọtụtụ ozi iru újú sitere n'aka ndị Katọlik n'ofe ụwa gụnyere Saụt Sudan, Argentina, Poland, Philippines na mba ndị ọzọ dị na kọtịnetị ise.

    Mana mba Chaịna ewepụtabeghị ozi gbasara ọnwụ Popu dịka mmekọrịta dị n'etiti Vatịkan na Chaịna adịchaghị mma kemgbe 1951.

    Ọnwụ Popu Francis a kpalitela usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị n’iwepụta onye ga-abụ onyeisi ụka Katọlik na mba ụwa niile bụ nke ga-eme n’izu ndị na-abịa.

    Ọzọ, a ga-amalite iru uju nke ụbọchị itoolu, nke a na-akpọ ‘Novendiales,’ dịka olili ozu na-emekarị n'etiti ụbọchị nke anọ na nke isii ka Popu nwụsịrị.

  12. Ụtụtụ ọma ụnụ, Igbo ndị ọma

    Nnọọ nụ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tuzde 22 Eprel, 2025.

    Anyị na-asị ka ụbọchị taa wetere anyị ihe ọma.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga na-ewetere anyị akụkọ ihe na-eme n’ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka nakwa n’ụwa niile.

    Chinonso Ugorji na Michael Ngene ga-emechaa sonyere anyị n’oge ehihe.

    Ndewo!

  13. Chaịna adọla aka na ntị maka nkwekọrịta azụmaahịa mba ụwa n'Amerịka

    Chaịna adọla aka na nti na ya ga-emesi mba ọbụla ha na Amerịka nwere nkwekọrịta azụmahịa ga-emegide ọchụchọ obi mba Chaịna ike dịka agha azụmaahịa dị n’etiti nnukwu mba abụọ ahụ na-ejikere imetụta mba ndị ọzọ.

    Nke a na-abịa mgbe akụkọ pụtara n’Amerịka na-ezube ịmanye gọọmentị ka ha machibido ịzụ ahịa na Chaịna.

    Ndị ọchịchị Onyeisiala Trump na mba dị iche iche amalitela inwe mkparịtaụka banyere tarifu ọhụrụ dịka ndị nnọchiteanya mba Japan gara Amerịka izu gara aga ebe Saụt Korea ga-amalite mkparịtaụka nke ha n’izu a.

    Kemgbe ọ lọghachiri n’obi ọchịchị Amerịka ‘White House’ n'ọnwa Jenụwarị, Onyeisiala Trump amanyela nnukwu ụtụisi na mbubata ndị Chaịna, ebe mba ndị ọzọ na-atụkwa ụtụisi na ngwaahịa ha.

    "Mkpesa enweghị ike iweta udo, nkwekọrịta enweghịkwa ike inweta nkwanye ugwu," ọnụ na-ekwuchitere Mịnịstrị Azụmahịa Chaịna kwuru.

    O kwuru na Chaịna jụrụ onye ọ bụla na-enwe nkwekọrịta azụmahịa ga-emegide ọdịmma Chaịna. Ọ bụrụ na nke a emee, Chaịna agaghị anabata ya ma ọ ga-emerịrị ihe iji mgbochi ya.

  14. Popu Francis anwụọla n'afọ 88 - Vatican kwuru

    Onyeisi ụka Katọliki n’ụwa niile bụ Popu Francis anwụọla n’afọ iri asatọ na asatọ (88) dịka Vatịkan siri kwuo.

    Vatịkan kwuru na ọ nwụrụ n’ụlọ ya dị na Casa Santa Marta nke Vatịkan.

    Kadịnal Farrell kwuru: "O jiri ndụ ya niile ijere Chukwu na Nzukọ-nsọ ​​ya ozi.

    Ọnwụ ya na-abịa otu ụbọchị ka ọ pụtara n’ogigi St Peter Square ịgwa ọtụtụ puku ndị na-efe ofufe Ista ọma.

    Cheta na N'afọ ole na ole gara aga, Popu Francis nwere nsogbu n'ahụike ya.

  15. Ụtụtụ ọma ụnụ, ndị be anyị

    Nnọọ nụ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Mọnde 21 Eprel, 2025.

    Dịka ụnụ na-eme emume Ista, anyị na-asị ka izu ọhụrụ a mịtara anyị niile mkpụrụ ọma.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga na-ewetere anyị akụkọ ihe na-eme n’ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka nakwa n’ụwa niile. Michael Ngene ga-emechaa sonyere anyị n’oge ehihe.

    Udo dịrị ụnụ.

  16. Zelensky akatọọla okwu Putin dịka Yukren na Rọshịa na-atụ onwe ha aka maka igbochi nkwa 'nkwụsịtụ ọgụ Ista'

    Rọshịa na Yukren na-ebo onwe ha ebubo igbochi mkpebi nkwa 'nkwụsịtụ ọgụ Ista' kwesiri ịnọ awa 30.

    Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky kọwara okwu Onyeisiala Putin na-achị Rọshịa dịka nke uru na-adịghị maka na e nweela mwakpo ruru 46 Rọshịa mere na Yukren kemgbe ụtụtụ a.

    Mana mịnịsta Rọshịa na-ahụ maka nchekwa kwuru na ọ bụ mba Yukren tụrụ ogbunigwe ndí ahụ wakporo Yukren.

    Cheta na Onyeisiala Putin nyere ndịagha ya iwu ka ha "kwụsị ọrụ agha niile" na Yukren maka nkwụsịtụ nwa oge, nke agha Yukren.

    O kwuru nkwụsịtụ agha Yukren nke nwa oge nke awa iri atọ (30) ga-amalite n’awa nke isii na Rọshịa n’ụbọchị Satọde nwere ruu ime abalị ụbọchị Sọnde.

  17. Ule nke afọ 2025 ga-amalite ụbọchị Tọzde Eprel 24 - JAMB

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ule eji abanye mahadum na Naịjirịa bụ ‘Joint Admission and matriculation Board (JAMB)’ ekwuola na ule Unified Tertiary Matriculation Examination (UTME) nke afọ a bụ 2025 ga-amalite n’ụbọchị Tọzde Eprel 24.

    Ozi onye na-ahụ maka mgbasa n’ụlọọrụ ahụ bụ Fabian Benjamin wepụtara n’akara sọshịa midia ndị JAMB, kwuru na mmalite ule ahụ agaghị a bụzi Fraịde Eprel 25 maka ihe ndị ozọ dị mkpa nke ụlọọrụ ahụ na-eme.

    Benjamin gwara ụmụakwụkwọ ndị ga-esonye na-ule ahụ ka ha gaa n’ihu bipụta ‘Slip’ nke nwere ozi dị mkpa gbasara nkọwa ule ha.

    Ọ gụpụtat ozi ndị ahụ dịka ụbọchị ụle ahụ, ebe ọ ga-anọ ele ule, oge na ihe ndị ọzọ dị oke mkpa.

    Ọ gara n’ihu ịdọ ụmụakwụkwọ aka na ntị ka ha jiri n’oge bipụta akwụkwọ ule ha ‘slip’ nke ga-enyere ha aka iji kwado maka ịga ebe ha ga-ele ule ha.

    O kwukwara na ọ dị oke mkpa n’ụmụakwụkwọ gara maara ebe ha ga-anọ ele ule ọbụlagodi otu ụbọchị maọbụ abụọ tupu ụbọchị ule.

    Benjamin kwuru na o nweghị nwa akwụkwọ aga etinye ebe abụghị n’obodo ebe ọ chọrọ ịnọ ele ule ha.

  18. Popu pụtara n'Ista Sọnde mgbe ọrịachara ọrịa siri ike

    Onyeisi ụka Katọlik n’ụwa niile Popu Francis apụtala maka inye ngọzị Ista Sọnde n’ogige St Peter dị na Vatican, ebe a na-akwado maka emume ahụ.

    A maghị ma Popu ahụ dị afọ asatọ na asatọ (88) a ga-esonye ụka ụbọchị Ista n’ihi na ọ hapụrụ ụlọọgwụ n’ọnwa gara aga mgbe ọ nọchara izu ise iji nwete ọgwụgwọ maka ọrịa butere ya oyi baa okpukpu abụọ.

    Oge ahụ, ndị dọkịta kwuru na ọ chọrọ ezumike ọnwa abụọ n’ụlọ ya. Tupuu emume nke ụbọchị Ista, a hụla Popu gburu abụọ n’izu a.

    N’aka nke ọzọ, ọtụtụ puku ndị ụka Katọlik gbakọrọ na Rome maka ụka Ista bụkwa ụbọchị emume ncheta afọ iri abụọ na ise ‘jubilee year’ nke mere ka ọtụtụ nde mmadụ bịa n’obodo ahụ.

    Emume ‘jubilee year’ na-amalite site na Popu imeghe ụzọ dị asọ na St Peter's Basịlịka na 24 Disemba. Ndị ụka Katọlik kwenyere na-ịgafe ụzọ ahụ na-ewete mgbaghara mmeghe.

    Cheta na kemgbe ọ ghọrọ popu n'afọ 2013, nke a bụ mbụ o sonyeghị n’ọtụtụ emume izu ụka dị asọ, gụnyere emume ụka abalị n’Ista Satọde na St Peter Basịlịka, dịka o nyefere ọrụ ya n'aka ndị Kadịnal.

    Mana mgbe ọ pụtara na Basịlịka n’ụbọchị Ista, o kpere ekpere ma nyekwa ụmụaka ihe ụtọ.

  19. DHL akwụsịla nnyefe ihe n’Amerịka maka tarifu ọhụrụ

    DHL Express kwuru na ha kwụsịrị mwegara ihe na mba Amerịka nke na-ewetara ha nnukwu ego n’ihi oke nnyọcha ndị Kọstọm na-egbu oke oge maka tarifu ọhụrụ Onyeisiala Donald Trump.

    Ụlọọrụ ahụ kwuru na ọ ga-akwụsị mbupu sitere n’ụlọọrụ dị na mba ụwa niile na-aga Amerịka na Mọnde.

    Ọ gbakwụnyere na mbupu nke ndị azụmaahịa na-ebugara ndị azụmaahịa nọ n’Amerịka ga-aga n'ihu, "n'agbanyeghị na ha nwekwara ike izute ihe igbu oge".

    Na mbụ, ngwugwu ruru ọnụ egọ puku dọla abụọ na narị ise ($2,500) na-abanye mba Amerịka na-enweghị nsogbu ọbụla mana n’ihi oke nnyocha ndị kọstọm sitere na tarifu ọhụrụ Onyeisiala Trump, ngwaahịa na-egbuzi oke oge ịbanye Amerịka.

  20. Ọtụtụ puku esonyela ngagharịiwe megide Onyeisiala Trump n'ofe Amerịka

    Ọtụtụ puku pụtara n’okporoụzọ n’ofe Amerịka n’ụbọchị Satọde 19 Eprel 2025 isonyere ngagharịiwe iji megide ọchịchị na iwu ọhụrụ nke Onyeisiala Donald Trump.

    Ngagharịiwe ahụ a kpọrọ "50501", nke "50 ngagharịiwe, 50 steeti, otu njem", bụ nke ezubere ka ya na emume ncheta nke afọ 250 nke mmalite agha Amerịka.

    Site na mpụga obi ọchịchị ‘White House’ na ihu ebe a na-ere Tesla ya na-ime ọtụtụ obodo, ndị ngagharịiwe kwupụtara ọtụtụ mkpesa. Ọtụtụ na-akpọ maka nloghachi nke Kilmar Ábrego García, onye a chụpụrụ n’Amerịka ma chụga ya n’el Salvador.

    Ngagharịiwe nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ ihe a na-aghọkarị n’ Amerịka dịka nke a mere n’ọnwa Eprel kpọpụtara iri puku mmadụ n’ofe mba ahụ.

    Ntuliaka ọhụrụ sitere na Gallup na-atụ aro na ihe dịka 45% nke ndị na-atụ vootu na-kwadoro arụmọrụ Onyeisiala Trump na nkeji mbụ nke ọchịchị ya, nke a karịrị 41% ndị kwadoro ọchịchị Trump nke mbụ.

    Ngagharịiwu ahụ ndị Amerịka mere n’ụbọchị Satọde megidere ọtụtụ ọrụ Onyeisiala Trump, gụnyere ihe ngalaba na-ahụ maka ọrụ gọọmentị ne-eme.

    Ha kwuru na iwu Onyeisiala Trump ga-ebute gọọmentị ịchụ ndị mmadụ n’ọrụ yana ibelata mmefu ego gọọmentị - na ekweghị ka nwaamaala El Salvador bụ Ábrego garcía, ịlaghachi azụ.