Igbo festivals: Iri ji Mbaise agbajuola dọrọ tata

Ebe foto si, Emeka Ihedioha/Facebook

Nkọwa foto, Gọvanọ Emeka Ihedioha nke Imo steeti so waa ji na mmemme iri ji ndị Mbaise mere na nso nso a

Mmemme Iri Ji Mbaise na-akpọtụ ugbua n'ụlọakwụkwọ 'Aboh Mbaise Secondary School' ebe obodo 91 mejupụtara Mbaise na-eri ji ọhụrụ taa bụ Tọzde.

Nkọwa foto, Ji nọ n'ọkụ na-eghe

Iri ji Mbaise bụ nke a na-eme kwa afọ ọbụla ma ọnwa August gbaa iri na ise.

Nkọwa foto, Ndị eze, nze na ọzọ bịara emume Iri Ji Mbaise
Nkọwa foto, Ndị eze, nze na ọzọ bịara emume Iri Ji Mbaise
Nkọwa foto, Gọvanọ Imo steeti bụ Emeka Ihedioha tụrụ 'down' na Iri ji Aboh Mbaise

Mmadụ puku kwụrụ puku zukọtara kemgbe ụtụtụ ụbọchị Tọzde, ebe ndị mbaise na egosi ejiri mara ha.

Nkọwa foto, Ụmụada Mbaise gwunyere n'emume iri ji ahụ
Nkọwa foto, Ndị Eze-ji Mbaise Mbaise na afọ a

Ndị Eze-Ji niile bugasi ji gbara agba si na obaji ha bịa gosi ya ka ụwa kirie.

Nkọwa foto, Ndị Eze-ji Mbaise nọ n'ihu ọba ji egosiputa aka ọrụ ha n'Iri Ji mbaise 2019

Eze-Ji HRH Eze Mike Ndudiri Orji kwuru na obodo Mbaise bụ ndị kasi ibe ha akọpụta ji, nke mere na ha na ebu ụzọ eme mmemme iri ji tupu obodo ndị ọzọ eriwe.

Nkọwa foto, Ndị otu egwu dị icheiche mere ka emume iri ji ahụ kpoo ọkụ

Ihe nkiri omenala juputara na iri ji Mbaise nke afọa gụnyere egwu omenala dị iche iche, ịgba mgba, ekike, ịgosi ọba ji nakwa ihe ndị ọzọ.

Lee ihe nkiri iri iji nke ndị mba ọzọ:

Aha onyonyo, Ndị Abatete n'Anambra steeti mere ihe puruiche na mme mme iri ha
Aha onyonyo, Ihe omimi dị n’emume Ikeji Arọndizuọgụ
Aha onyonyo, Iri Ji ndị Igbo na Sweden

Lee akuko ga-amasị g