Mmụọ Mmiri Afulanya: Ihe ndị omenala kwuru maka nwuchi dibia a a sị ya kpọkuo chi ọ na-efe
Ọtụtụ ndị na-eme omenala Igbo agbarụọla ihu n'etu ndị ọrụ nchekwa Agunaechemba nke gọọmentị Anambra Steeti si nwuchie dibia Mmụọ Mmiri Afulanya ma sị ya kpọkuo chi ọ na-efe.
Otu onye na-eme omenala bụ Nze Duru Agwu gwara BBC Igbo na ihe gọọmenti Anambra bụ ihe mkparị na mmetọ nye ikike okpukperechi dịịrị mmadụ.
O kwuru na onweghi onye okpukperechi ọbụla maọbụ nke Kraịst, Aka ji ọfọ, Ụka mbịarambịa nke a ga-asị kpọpụta chi ha ya ekwe ha omume.
Duru Agwu gara n'ihu kwuo na ọ na-adị mma ihe e mere onye sị ka e meere ya ibe ya maka na ọ hụtụbeghi ebe a sị ka a kpọchie onye ụkọchukwu maka na o kwuru na Jesus ba-abịa, kama na ọ bụ naanị ndị dibia ka a na-ahụta na-eme ihe ọjọọ.
Cheta na gọọmenti Anambra steeti mere iwu ha kpọrọ 'Homeland Security law' n’ọwa Jenuwarị 2025, megide ịgwọ ọgwụ okeite, ịchụ aja na mmiri nakwa ihe ndị ọzọ bụ nke ha sị na Mmụọ Mmiri Afụlunya dara iwu a.
Mana nwaamadi a arịọala ka a gbahara ya, na ọ maghị etu iwu ahụ si arụ ọrụ, mana ugbua ọ matara na ọ gaghị achụ aja na mmiri ọzọ.
Kirie ihe dị n'akụkọ a n'uju;






