Sowore, Emma Kanu esorola mee ngagharịiwe maka ntọhapụ Nnamdi Kanu n'Aba
End of Ihe i kwesịrị ịma maka Nnamdi Kanu
Ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe n'Aba, Abia steeti na-akpọ oku ka a tọhapụ Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Indigenous People of Biafra (IPOB).
Ha bidoro ngagharịiwe ahụ tupu ọ kụọ elekere itoolu n'ụtụtụ ụbọchị Tọzde, Maachị 12, 2026 ma gwa BBC Igbo ihe ha ji anya ha abụọ hụ n'aka ndị ọrụ nchekwa.
N'ime ndị a maama so mee ngagharịiwe ahụ gunyere Omoyele Sowere na Prince Emmanuel Kalu.
Cheta na ụlọikpe tụrụ Nnamdi Kanu nga mkpụrụọka maka ebubo dị icheiche nke gunyere iyi ọha egwu.
Ihe Omoyele Sowere kwuru maka ngagharịiwe ntọhapụ Nnamdi Kanu
Omoyele Sowore bụ onye so kpọọ ọkụ ka a tọhapụ Nnamdi Kanu kwuru sị "a bụ m eyi Nnamdi Kanu ma bụrụkwa eyi ikpe nkwụmọtọ".
"Anyị niile bịara na-akpọ okụ ka Onyeisiala Bola Tinubu tọhapụ Nnamdi Kanu ugbua".
"Anyị dọrọ ha aka na ntị mgbe tupu ha ejiri ọkaikpe James Omotosho tụọ Nnamdi Kanu nga".
"A bịara m ebe a ka m kwado unu. Anyị niile agaghị akwụsị ruo mgbe a tohapụrụ Onye ndu".
Isi akụkọ
Kọwaara m isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available