Iwu Naịjirịa ọ kwadoro mmadụ ịgbanwe ụbọchị a mụrụ ya?
Peter Okoye, onye a maara dịka Mr P bụ otu n'ime ejima ndị a ma ama hiwere otu egwu P-Square pụtara kwuo na ya agbanweela ụbọchị a mụrụ ya na nso nso a.
N'ozi ahụ o bipụtara n'akara ọbaozi Instagram ya, Mr P kwuru na ụbọchị ọmụmụ ya agaghị abụ ụbọchị 18 Nọvemba kama ọ ga-abụzi n'ụbọchị 30 Nọvemba, kwa afọ ọbụla, dịka ọ dọrọ aka na ntị ka mmadụ ọbụla ghara izitere ya ozi maọbụ onyinye n'ụbọchị 18 nke ọnwa Nọvemba.
Dịka nke a na-ewu, ọtụtụ mmadụ malitere ịjụ ma mmadụ o nwereike gbanwee ụbọchị a mụrụ ya. Ọ bụ nke a mere anyị ji kpọtụụrụ ndị Ọkaiwu abụọ iji mara ma iwu Naịjirịa ọ kwadoro mmadụ ịgbanwe ụbọchị a mụrụ ya.
Ọkaiwu Nnennaya Anozie kwuru na kemgbe e hiwere ụlọọrụ National Population Commission, na ọ bụ naanị ụbọchị e dere n'asambodo ọmụmụ ka iwu Naịjirịa nabatara.
N'aka nke ya, Ọkaiwu Obulimba Canice Madukaji kọwara na mmadụ ịgbanwe ụbọchị a mụrụ ya bụ nke megidere iwu Naịjirịa.
O kwuru na ọ bụ mpụ, n'ihi na ọ pụtara mmadụ inyepụ ozi adịgbaroja nakwa ịma ụma ekwupụta ozi ụgha.
Ọkaiwu Madukaji kwukwara na kemgbe afọ 1970, o nweghị onye ga-asị na ya amaghị ụbọchị a mụrụ ya n'ihi na gọọmenti na-edekọta ya ma ọ bụrụ na a mụọ nwa ọhụrụ.
Ugbua, tinye ọnụ n'okwu a ma gwa anyị ihe i chere.



