Etu ị ga-esi gbanarị ịzụta 'sim card' nwereike ịkpọga gị nga

Aha onyonyo, Etu ị ga-esi gbanarị ịzụta 'sim card' nwereike ịkpọga gị nga
Etu ị ga-esi gbanarị ịzụta 'sim card' nwereike ịkpọga gị nga
Nwaada Titilayo na mkpịsịaka abụọ ji akara ekwentị 'sim card'

Akụkọ fegharịrị na soshal midịa na nso nso a kwuru na otu nwaada aha ya bụ Titilayo Ibrahim dabara na nnukwu nsogbu dịka ndị uweojii nwuchiri ya ma taa ya ahụhụ n'ihi na e boro ya ebubo na 'sim card' ọ zụrụ n'afọ 2025 bụ nke ndị ntọrị ji tọrọ mmadụ ma nara onye ahụ ego.

E kwuru na ọ bụ n'afọ 2024 ka ndị ntọrị tọọrọ onye ahụ mana Titilayo zụụrụ 'Sim card' ahụ n'afọ 2025 na-amaghị na mmadụ ejirila ya mee ihe oge gara aga.

Nke a mwere ka ụlọmgbasaozi BBC News Igbo jiri kpọtụrụ onye ọkachamara n'ihe gbasara nziritaozi bụ Bashir ka ọ kọwara anyị etu mmadụ nwereike isi mata na 'sim card' ọ chọrọ ịzụ ọ bụ nke onye ọzọ jirila mee ihe n'oge gara aga.

Bashir kọwara na 'sim card' dị ụzọ abụọ. Nke ọhụrụ na-enwebeghị onye jiiri ya mee ihe nakwa nke mmadụ jirila mee ihe oge gara aga nke ụlọọrụ nwe 'sim card' ahụ napụrụ onye ahụ n'ihi na onye ahụ anaghịzikwa eji ya eme ihe nke ha ga-atụgharị ka ọ bụrụ nke ọhụrụ.

Ọ si na ya bụrụ na mmadụ chọrọ ịzụ 'sim card' na-aka ndị na-ere ya n'okporoụzọ tinye n'ekwentị maobụ akụrụngwa ịntaneti, onye ahụ ga-agba mbọ hụ na ọ bụ asambodo ya ka a ga-eji debanye aha na 'sim card' ahụ, mana ya bụrụ na ọ bụ nke e ji aha onye ọzọ debanye tupu onye ahụ abịa ịzụrụ ya.

O kwuru na onye chọrọ ịzụ 'sim card' ahụ kwesịrị ịchọpụta mgbe onye jiri ya mee ihe oge gara aga ji ya mee ihe nakwa mgbe ọ kwụsịrị iji ya mee ihe nakwa mgbe ụlọọrụ nwe 'sim card' ahụ tụgharịrị ya ka ọ bụrụ nke ọhụrụ.

N'agbanyeghị nchọpụta a, Bashir kwuru na ọ bụ ọrụ ụlọọrụ nwe 'sim card' ihichapụ ihe ọbụla gbasara onye jibu 'sim card' ahụ mee ihe oge gara aga tupu ha atụgharịa ya ka ọ bụrụ nke ọhụrụ ma depụta oge ha kagburu aha onye ahụ, iji hu na onye zụrụ ya adabaghị na nsogbu ma ọ bụrụ na onye ji ya mee ihe oge gara aga ji ya mee ihe ọjọọ.

Tupu itinye 'sim card' ahụ n'ekwentị gị, chọpụta ma o nwere onye jibu ya mee ihe oge mbụ iji gbanarị nsogbu.