'Ihe m tinyere Chukwu n'ọbọaka' bụ egwu m tiri n'ihi ọnọdụ m nọ na ya n'oge ahụ - Khenyzee
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Onye dere ya, Anthony Okwudei
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Onye otiegwu na-emelite emelite na nsonso a bụ Ekene Ndukwe a ma ama dịka ‘Khenyzee’ agbaala ama na ihe kpalitere ya mụọ ịgụ egwu ya n’ewu ewu ugbua’Ihe Chukwu m tinyere Chukwu n’ọba aka nke ọ kpọrọ ‘‘Facetime 12’ bụ ọnọdụ ọ na-agabiga oge ya bụ egwu batara n’ime ya.
Na mgbarịtaụka ya na BBC Igbo nwere na nsonso a, gụrụ maka ọrụụgbọ na mahadum ‘University of Port-Harcourt’ kwuru na anya ya na-ahụ ntị ya oge mmụọ ya kpalitere egwu ahụ.
“Ibiri n’obodo Oyibo, o nwere ụtụisi na ụgwọ ị ga-ana-akwụ. Mgbe ahụ o nwere ka o si were ju,ụgwọ e ji eji ka nkụ. Ebe nile kpọchiri akpọchi dịka a ga-asị na o nweghị ihe na-aganụ. Ọ bụ ọnọdụ ahụ ka m nọ egwu ahụ were bata.”
Ọ gara n’ihu kwuo na ugbua, ndụ y atụgharịala.
“Ihe tụgharịrị na ndụ m abụghị otu ihe, ọ bụghị abụọ. Kemgbe egwu ahụ ji pụta, dịka m kwuru na ngwụcha egwu ahụ na m ga-abụ onye a ma ama, abụrula m onye a ma ama.”
“Ndị na-amabughị m na mbụ, na-akpọzi m ọrụ.Ndị nnukwu ụlọọrụ na-achọtazị m, ka mụ na ha jikọ aka mee ihe.”
Onye bụdị Khenyzee?
Ezi aha ya bụ Ekene Wisdom Ndukwe
Ọ bụ onye Alaye dị n’Okpuru Ọchịchị Bende, Abia Steeti mana ọ nọ n’Ọnịcha ,Anambara steeti.
Ọ gara akwụkwọ Praịmarị n’ ụlọakwụkwọ ‘Charles Heary International School’Onicha, maka akwụkwọ Praimarị. Gụọ Sekọndrị na ‘St Charles College’ dịkwa n’Ọnicha.
Nwa amadị ahụ malitere ịgụ egwu na nwata oge ọ dị afọ 12, gụrụ maka ọrụugbo na mahadum. University of Port-Harcourt’
Ọ gụkwara kọmputa na mahadum Tansian University dị n’Anambra steeti.
E wezụga ‘Facetime’, nwaafọ a bi mba Briten,agụọla ọtụtụ egwu ndị ọzọ gụnyere : Bullion Van, Grace wdg.
Kirie n'uju mkparịtaụka ahụ nke Uche Akolisa mere, Anthony Okwudei sere ya, ebe Donald Wogu haziri ya ebe:



