Nwaanyị na-adịghị ime o nwereike inye nwa a mụrụ ọhụrụ mmịrị ara?

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Giulia Granci
    • Ebeg o si, Brazil
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Aline Tavella bụ onye mba Liberịa, na Camila Sosa bụ onye ntaakụkọ bụ dị na nwunye dị n'otu okike. Ha abụọ ebirila n'otu ụlọ ihe ruru afọ iri na atọ ma na-achọ ka ha mụọ nwa.

Aline Tavella tụụrụ ime n'afọ 2022 site n'ọgwụ na enyemaka ndị ụlọọgwụ. N'oge ahụ ka Camila bụ onye chọrọ ka e kee ọrụ ịmụ nwa eke bidoro ịṅụ ọgwụ na-anara ọgwụgwọ ka o nwee ike ime ka ara ya gbapụta mmiri ara ọ ga-enye nwa ahụ.

"Ama m na ọ bụ ihe a ga-emenwuli maka na enyi m emeela ya, mana nke ya apụtaghị ihe, mana a sị m na ebe e kwuru na ọ bụ ihe a ga-emeli, gịnị mere na m agaghị anwale ya".

Ndị maara ihe ekwe na-akụ n'ahụike gwara Camilla na ịṅụ ọgwụ nwereike mee ka ara ya ghara ịgbapụta nnukwu mmiri ara mana nke Tavella ga-agba mmiri karịa mana ọ ka ga-abụ ezigbo mmịrị ara.

Camilla kwuru sị "e bidoro m na-aṅụ ọgwụ ga-enye aka ka ara m gbaa mmiri ara.

Nke ahụ rụrụ ọrọ n'ahụ m nke ọma. Ara m gbara mmiri n'abalị itoolu m bidoro ịṅụ ọgwụ".

Ebe foto si, Getty Images

Kedụ etu e si eme ka ara bido ịgbapụta mmiri ara?

N'oge nwaanyị dị ime, ihe a na-akpọ "hormones estrogen" nakwa nke "progesterone" na-eme ka mmiri ara bido na-apụta tupu nwaanyị ahụ amụọ nwa.

Mana nwaanyị na nwaanyị lụrụ onwe ha dịka di na nwunye nwereike ime ka mmiri ara ha gbaa site n'ịṅụ ọgwụ.

Ọ bụrụ na nwa ahụ ka nwere ọtụtụ ọnwa tupu a mụpụta ya, dọkịta ga-enye gị ndụmọdụ etu ị ga-esi eme ka ara gị gbaa mmiri.

Ọgwụ ndị ahụ ka ọtụtụ ndị nwere ọrịa dị iche iche dịka ọrịa obi, mkpọnwụ ahụ na ndị ọzọ na-agaghị aṅụli.

Dọkịta Honoria de Almeida kọwara na nwaanyị gbanwere etu chi si kee ya nwereike inye nwa ara ma ọ bụrụ na e wepụghị kpamkpam mkpụrụ ara ya dị n'ime ahụ ya bekee kpọrọ "mammary gland" nke na-adị n'ime ara.

"A na-edosa obere mpaghara ara ahụ ka e were ya kpụọ ahụ nwoke. Ọ bụ nke a ga-enyere nwaanyị gbanwere ahụ ya ka ọ bụrụ nwoke aka iche nwata ara".

Kedụ maka nwoke gbanwere onwe ya ma bụrụ nwaanyị?

Ebe foto si, Getty Images

"Ọ ga-abụ ihe raara ezigbote ahụ, onye a mụrụ dịka nwoke mechere bụrụ nwaanyị iche nwata ara mana ọ bụ ihe a ga-emenwu".

"Dọkịta kwuru na ara udiri ndị ahụ na-emecha gbanwe na-arụ ọrụ dịka ara nwaanyị mana ọ bụghị ihe na-eme na ntabi anya"

Mmiri ara onye adịghị ime ọ bụ ezigbo mmiri ara?

Dọkịta Renata Lock sị na "mgbe nwata na-amịta mmiri ara na-enyereaka mee ka ahụ nwaanyị ahụ na-enye ara mara ihe nwata ahụ na-eme. Nke a na-enyereaka ka mmiri ara dị mma na-apụta".

Dọkịta Renata Lock kọwaara na nnyocha e mere ọhụrụ na-egosi na mmiri ara nwaanyị na-adịghị ime na-aka nke nwaanyị dị ime enye ezigbo ihe n'ahụ nwata a mụrụ ọhụrụ.

Ọ sị na mmiri ara nwaanyị na-adịghị ime na-aka nke nwaanyị dị ime mma ma na-enye ihe n'ahụ.

"E nweghi ihe egwu dị na ya"

Ugbua Camila na Aline nwere nwa ọhụrụ dị ọnwa anọ mgbe akụkọ a pụtara. Aha nwa ha bụ Nicola.

Aline nwere obere nsogbu ahụike mgbe ọ na-amụ nwa nke mere na mmiri ara ya adịghị agba nke ọma mana site n'enyemaka ọgwụ, mmiri ara Camila na-agbata nke na-ezuru nwa ha.