Gọọmenti dutere ndị agha, mechie ụlọakwụkwọ, ụlọọgwu na ahịa obodo anyị - Ndị Amasiri n'Ebonyi

Ebe foto si, BBC/Oko Family
Ndị obodo Amasiri dị n'Okpuru Ọchịchị Afikpo ,Ebonyi steeti etiela mkpu banyere ihe ha kpọrọ 'mkpagbu' nke gọọmentị steeti ahụ dịka ndịagha weghara ọnọdụ n'obodo kemgbe otu ọnwa.
Ọtụtụ mmadụ anwụọla kemgbe ndị ọrụ nchekwa weere ọnọdụ n'obodo Amasiri kemgbe abalị 31 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2026, dịka ndị obodo Amasiri si gwa BBC Igbo.
Ndị nwụrụ gụnyere nwoke gbara afọ 31 a kpọrọ Udechukwu Oko,onye ogbe Amauzu Ezeke Amasiri bụ onye a sị nwụrụ n'aka ndị nchekwa nwụchiri ya na okorobịa abụọ ndị ọzọ, dịka ndị obodo ha si kwuo.
Osote Onyeisi otu Amasịrị Town Union bụ Amadi Njoku gwara BBC Igbo sị, "Ụfọdụ bụ ndị agha tigburu, ụfọdụ bụ ndị a gbagburu, ụfọdụ nwụrụ n'ọrịa n'ihi na e mechiri ụlọọgwụ, ebe ndị amaghị ndị ha bụ tọgburu otu nwoke abalị ole na ole gara agaa. "

Ebe foto si, Screengrab
"Agụụ egbuola ndị mmadụ, ndị mmadụ anaghị aganwu ahịa, ha na-agalị ugbo. "
"Ọ bụ eziokwu na anyị na obodo anyị ịna ha gbara agbataobi nwere esemokwu, mana Gọvanọ mee nnyocha mara ihe mere."
" O nweghị ebe ndị Amasiri gbakọrọ kpebie si gaa gbuo mmad u."
"Ihe na-ewute anyị bụ etu o siri tinye mmachi, mechie ụlọakwụkwọ, ụlọọgwụ mechie ahịa, o nweghị onye na-agagharị kemgbe ihe karịrị otu ọnwa n'obodo anyị ugbua."
Ndị bi nso obodo ahụ na ndị obodo ahụ achọghị ka a kpọọ aha ha gwara BBC Igbo na ndị ntorobia gbara ọsọ n'obodo, ọ fọdụ naani ụmụnwaanyịi, ụmụaka na ndị agadi dịka ndị ọrụ nchekwa weghara ọnọdụ n'Amasịrị kemgbe ngwụcha ọnwa Jenụwarị afọ 2026.

Ebe foto si, BBC/Oko Family
N'abalị 29 nke ọnwa Jenụwarị ndị bu egbe a maghị ndị ha bụ wakporo obodo Oso Edda, dị n'Okpuru ọchịchị Edda, gbuo mmadu ise, tọọrọ ọtụtụ ma gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ.
Gọvanọ Steeti ahụ bụ Francis Nwifuru kwụsịrị ndị jị ọkwa ọchịchị na gọọmentị si Amasiri ọrụ nwa mgbe nta ma nye iwu ka ndị obodo Amasịrị bụ ebe a na-enyo na ndị kpara mkpamkpa ahụ wepụta ndị mere ya bụ ihe.
Mana ndị Amasịrị na-ekwu na Gọvanọ Nwifụrụ mara ha ikpe ma na-ata ha ahụhụ na-emeghị nnyocha zuru oke iji mata ndị mere ya bụ ihe n'ezie.

Ebe foto si, Screengrab
Okwudi Udechukwu Oko, gbara afọ 31,onye ogbe Amauzu Ezeke Amasiri bụ onye nwụrụ n'aka ndị nchekwa nwụchiri ya na okorobịa atọ ndị ọzọ, dịka ndị ezinaụlọ ya si gwaa BBC Igbo.
Nwunye ya bụ Comfort Udechukwu gbara afọ 27 gwara BBC Igbo sị, "N'abalị 19 nke ọnwa gara aga(Febụwarị), ọ nọ n'Ahịa Akaeze oge ndịagha bịara nwuchie ya kpụrụ ha gawa Abakaliki."
"Ka ọ gachara abalị ole na ole, anyị nwetara ozi na e tigburu ya."
Nna Okwudi bụ Ejike Udechukwu gbara afọ 70, tụrụ arịrị na kama ịkpọnye ya nwa ya maọbụ bunye ya ozu ya na ndịagha na ndị uweojii na-atụgharị ya.
."Ndị uweojjii na ndịagha na-adọgharị ya, " Anyị jekwuru ndịagha na Nkwoagu Cantonment dị n'Abakaliki, ha sị anyị na ha ahụghị nwa n nwoke, anyị gaa jụọ ndị uweojii na ha nyefere ndị ha nwuchiri n'aka ndị uweojii."
"Anyị gajụọ ndị uweojii , ha sị na ọ bụ naani mmadụ abụọ ka e nyerefere ha na , na o nweghị nwa m ha ji, anyị ga jụ o ndịagha."
Ihe Gọọmentị Ebonyi steeti kwuru
Gọọmentị Ebonyi Steeti kwuru na ha amaghị maka ndị e kwuru nwụọrọla site na mwakpo ndịagha na ndị ọrụ nchekwa mere n'Amasiri.
Na mkparịtaụka BBC Igbo na Komishona mgbasaozi steeti ahụ bụ Ọkaiwu Ikeuwa Omabe nwere n'ekwenti, o kwuru sị, "Enweghị m ike ikwu maka ihe m na- amaghị ganye na m anụta olu ndị uweojii."
Ọ gara n'ihu kwuo na, "Anyị ejighị nchekwa ndụ na akụnaụba ndị be anyị ewu egwu."
N'okwu mmekpaahụ nile ndị Amasịrị na-eti mkpu ya, ọ sara sị," Nke a bụ gọọmentị na-akwanyere ikike dịịrị onye ugwu."
Ihe ndị uweojii Ebonyi kwuru

Ebe foto si, Screengrab
Ndị uweojii Ebonyi kwuru na ha amaghị maka ọnwụ nwoke ahụ a sị egburu nke ha na-anụ maka nwoke a tọgburu.
Ọnụ na-ekwuru ha bụ DSP Joshua Ukandu gwara BBC Igbo n'ekwentị na "O nweghị onye Amasiri ọbụla nwụrụ n'aka ndị uweojii na nnyocha okwu dapụtara n'etiti ndị Amasiri na ndi Okporojor."































