Etu olili ozu Rev. Uma Ukpai si aga n'obodo ya bụ Asaga Ohafia dị n'Abia Steeti
A malitela olili ozu Ụkọchukwu na onye mgbasaozi a ma ama bụ Uma Ukpai n'obodo ya bụ Asaga Ohafia nke Abia Steeti.
E bulara ozu ya n'obodo ya n'ụbochị Tọzde dịka Gọọmenti Abia kwanyechaara ugwu ikpeazụ n'isiobodo Umuahia.
Ndị ụkọchukwu, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị enyi na ezinaụlọ gbakọtara n'ama ezumezu Ochendo International Conference Center maka nkwanye ugwu ahụ.
Cheta na UKpai nwụrụ n'ụbọchị isii nke ọnwa Ọktoba afọ 2025 dịka ọ rịachara obere ọrịa.
Etu gọọmenti Abia Steeti si kwanyere ya ugwu ikpeazụ n'Umuahia
Gọọmenti Abia Steeti amalitela ịkwanyere ozu ụkọchukwu na onye mgbasaozi ọma a ma ama bụ Reverend Uma Ukpai ugwu nke ikpeazụ tupu e lie ya.
Nke a na-eme n'ama ezumezu Ochendo International Conference Center dị n'Umuahia bụ isiobodo Steeti ahụ n'ụbọchị Tọzde 26 Maachị, 2026.
Ọtụtụ ndị a ma ama na ndị ọnụ na-eru n'okwu na-agbakọta n'ama ezumezu ahụ, ndị a gụnyere ndị ụkọchukwu dị iche iche, ndị ndu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ebe a na-atụ anya na Gọvanọ Alex Otti na ndị ọrụ gọọmenti ọzọ ga-awuchi ebe ahụ.
A ga-eli ozu ụkọchukwu a n'ụbọchị Fraịde 27 Maachị n'obodo ya bụ Asaga dị n'okpuruọchị Ohafia nke Abia Steeti.
Cheta na Reverend Uma UKpai nwụrụ n'ụbọchị isii nke ọnwa Ọktoba afọ 2025 dịka ọ rịachara obere ọrịa.
Nwamadị a bụ nwafọ obodo Asaga Ohafia dị n'Abia Steeti nwụrụ dị ka ọ gbachara afọ iri asatọ (80years).
Ihe i kwesịrị ịma maka Uma Ukpai
- Ọ bụ onye Asaga dị n'Ohafia, Abia Steeti, a murụ Uma Ukpai n'abalị asaa nke ọnwa Jenụwarị afọ 1945.
- Ọ bụ ya hiwere otu mgbasa oziọma a kpọrọ, 'Uma Ukpai Evangelistic Association (UUEA), bụ nke isiụlọọrụ ha dị n' Uyo, Akwa Ibom Steeti.
- Ọ nọ n'isi na nhibere otu jikọro ndị ụka Kraisti agba ọhụrụ a kpọrọ "Pentecostal Fellowship of Nigeria', PFN bụ nke bụ mkpụrụ ọgbakọ oziọma o hiwere na Legọs n'afọ 1985 mịtara.
- Ebe ndị ọzọ o hiwerela ọgbakọ ozioọma nke kpọtụrụ akpọtụ ma dọta igwe ndị mmadụ gụnyere; Ibadan n'afọ1982(Greater Ibadan for Christ) , Nsuka n'afọ 2012 wgz.
- E wezuga ịdọtara Kraistị mkpuruobi, nke ọ na-eme site na ọgbakọ oziọma dị iche iche o merela, Ukpai bụ onye nleta ahụike ndị mmadụ na-aụ ọkụ n'obi.
- Ọ bụ onyeicioche Uma Ukpai Eye Centre, nakwa ụlọgwụ 'King of Kings Hospital, dị N'Abia steeti
- Ọ bụ ya hiwere ụlọakwụkwọ Uma Ukpai Polytechnic Asaga.
- Ukpai bụkwa onye nwe Uma Ukpai School of Theology and Biblical Studies, dị n'Uyo,Akwaa-Ibom Steeti.
- Onye ọrụ ebere, Ụkpai nwere ụlọọrụ o ji enyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka 'Uma Ukpai Scholarship Foundation bụ nke o ji enye ohere agụmakwụkwọ n'efu.
Isi akụkọ
Kọwaara m isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available