Pine forest na waterfall dị na Ngwo Enugwu Steeti
- Onye dere ya, Ebere Ekeopara
- Ndị mere akụkọ a, Reporter
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Ọ bụrụ na gị bata Enugwu Steeti ma ị gabeghị Ngwo Waterfall maọbụ Pine Forest, ị mara na ị ga-alaghachi azụ maka na ọ bụ ọ gbara Igbo gharịị.
Ọ bụ otu n'ime ebe kachasị mma i kwesịrị ịhụ ma gị bata n'Enugwu Steeti. Ị bata n'ebe a na-akpọ Miliki Hill, ị gbagoo Ngwo.
Ị gafee Enugwu Ngwo, gafee Etiti wee rute ebe a na-akpọ Ụkaka. Ị bata ebe ahụ, ihe mbụ ị ga-ahụ bụ ukwu osisi mara mma nke ukwuu, ya ka a na-akpọ 'pine trees'.
Ha kwụ n'ahịrị n'ahịrị dịka ndị ọcha siri kụọ ha n'oge ochie. Anyị chọpụtara na ọ bụ ndị ọcha bịara igwu koolu n'Enugwu kụrụ osisi ndị ahụ.
Ị bata na pine forest ahụ ugbua, ị ga-ahụ ndị ntoroọbịa obodo nọ ebe ahụ. Ị ga-aga debanye aha gị ma gwa ha ihe ị bịara ebe ahụ ime.
Ọ bụ ha ga-enye gị ikike ịgbada ebe a na-akpọ 'waterfall'. Ije a abụghịkwa obere ihe.
Ọ ga-abụ ịgakata, ukwu na ụkwụ amalite igbu gị mgbu, mana anyị na-aga maka na anyị chọrọ ịhụ mmiri ahụ.
Anyị gagidere wee gbadata. Ugbua, lezie ebe ahụ a na-akpọ 'waterfall' Ngwo Waterfall.
End of Akụkọ ndị ọzọ yiri nke a
Ebe nke a amaka ooo. Gị lee anya, ị hụ na ọtụtụ mmadụ abịala ebe a. Leenụ ebe ndị mmadụ debanyere aha ha.
Onye bata, o dee aha ya n'ahụ aja ebe a ka a mraa na ọ zọbatara ụkwụ ebe a. Anyị edebanyela aha anyị ebe a ka a mara na BBC Igbo rutere erute.
Anyị esila ebe ahụ wee kuru mmiri ahụ a na-aṅụ aṅụ a sị na ọ bụ mmiri ngọzi ma ṅụọ ka anyị onwe anyị nwetakwa ngọzi ahụ.
Dịka ha siri kwuo, o nweghị onye ma ebe mmiri ahụ si agbadata. A chọọla ebe isi mmiri ahụ nọ, mana ọ bụ ọ gbara Igbo gharịị.
Ọ dị ka chi si kee ya. Ka anyị hụchara ya, anyị si ebe ahụ, dịka anyị ṅụchara mmiri ahụ, kwọọ ya n'ahụ, lelie anya elu, kpee ekpere ibe anyị na-ekpe ma pụta.
Anyị agachaala Ngwo pine forest na Ngwo Waterfall. Ọ dị mkpa na ọ bụrụ na gị rute Enugwu, aghakwala ịbịa legharịa anya ebe a maka na Enugwu nwere ebe dị mma. Ngwo nwere ihe ọma. Ndeewonụ.