E gburu Somtochukwu Maduagwu egbu, ekweghị m na nwa m si ụlọelu wutuo- Nna ya

Aha onyonyo, Lee ihe Ifeanyi Maduagwu, Nna Somtochukwu Maduagwu gwara BBC Igbo maka ọnwụ nwa ya.
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6
Injinia Ifeanyi Maduagwu na nwa ya nwaanyị bụ Somtochukwu Maduagwu, onye ntaakụkọ Arise TV

Ebe foto si, BBC/Arise News TV

Nna Somtochukkwu Maduagwu, onye ntaakụkọ Arise TV nwụrụ dịka ndị ekperima wakporo ebe o bi bụ Injinịa Ifeanyi Maduagwu akpọọla ndị uweojii na ndị ọrụnchekwa ka ha nyọch ọnọdụ nwa ya si nwụọ ,sị akụkọ banyere etụ sị nwụọ akwụghị ọtọ.

Somtochukwu nwụrụ n'abalị 29 nke ọnwa Septemba dịka ndị ojiegbe wakporo ebe obi na Katampe dị n'Abuja, isiobodo Naijiria.

Dịka ọ nwụrụ, akụkọ dị iche iche fegharịrị gụnyere nke na-ebo ebubo na ndịori gbagburu ya, ebe ụfọdụ na-ekwu na nwaada ahụ bụ onye Agulu, Anambara steeti si n'ụlọelu ogogo ato wụtụọ dịka ọ na-agba ọsọ ndụ ịgbalahụ ndịori ,merụọ nnukwu ahụ butere ọnwụ ya.

Mana na mkparịtaụka nna ya na BBC Igbo nwere na Pọtakọt na nsonso a, nna ya bụ Iginia Maduagwu kwuru na akukọ ahụ abụghị eziokwu.

"Ihe m ma bụ na ada m nwaanyị bụ Sommie Tochukwu Christelle Maduagwu m mụrụ agaghị esi n'ụlọelu mapụ."

Nna Somtochukwu bụ Ifeanyi Maduagwu na ụmụnne ya

"Ekwenyere m na e gburu nwa m nwaanyị egbu."

Inginịa Maduagwu kọwara nwa ya nwaanyị dịka onye nwere ọgụgụ isi, onye ndụ na-atọ ụtọ nakwa onye nwere egwu ebe dị elu(height).

Ọ tụrụ arịrị na nwa ya enwetaghị enyemaka zuru oge tupu ọ nwụọ.

Ọ sịrị, "Etu e si kwuo na mgbe ihe mere, na a kpọrọ mana enyemaka abịghị n'oge.

"Ọ bụladị mgbe e bugara ya ụlọọgwụ, ndị ga-eleta ya eletaghị ya maka ha na-ajụ maka akwụkwọ njirimara. Ụmụ ihe nile ndị a gbara m obi njọ."

'Somtochukwu bụ mmadụ ọha'

Nne Somtochukwu,Oriakụ  na nwanne ya nwoke
Nkọwa foto, Nne Somtochukwu,Oriakụ Maduagwu na nwanne ya nwoke(oge kpu ugegbe anya) n'ụlọụka Corpus Christi Cathedral' Pọtakọt dịka e mere ya mmemme abụ ọnwụ

N'okwu nkata ikpazụ ya na Somtochukwu kpara, nna ya sịrị, "Ihe anyị kpara erika mana nke m ga-asị mekarịrị m obi ụtọ bụ otu si kwuo na ya adịla nkwadebe ịchịba ụkwụ n'ụlọ."

Maazị Maduagwu kọwakwara nwa ya dịka onye ọdịmma ndị ọzọ dị oke mkpa.

Ọ gara n'ihu kwuo sị, " Ya bụ nwa bụ Somtochukwu bụ mmadụ ọha. Ọ rahụ ura teta, ihe ọ na-eche bụ etu ọ ga-esi mee ka ihe dịrị ndị a mma." "Ihe o bu na obi bụ na ya ga-emenwụ ka a gbanwe etu e si eme ihe n'obodo anyị bụ Naijiria. Na ya ga-aba ndọrọndọrọ ọchịchị.Na ọ ga-amasị ya ịrị rue ọkwa Senetọ."

Sommie bụ onye bụ ọ bata, ị mara na mmadụ batara-Nwanne ya nwoke

Nwanne Somtochukwu Maduagwu

Nwanne Somtochukwu bụkwa dịọkpara kọwakwara ụdị mmadụ nanne ya nwaanyị bụ.

Nwa amadi ahụ bụ onye n'ofesi bụ ebe ọ nọnweta ozi ọnwụ ya dịka ọ nọ n'ụlọọrụ kwuru sị, "Sommie bụ Sommie. Na-agbanyeghị na o toghị ogologo, ọ bata ị mara na mmadụ batara, ya bụ etu m ga-esi akọwa ụdị mmadụ ya-

" O ji obi ya eme ihe nile, nwee obiọma, o tinye obi ya ime ihe o meeruo ya n'isi mabụrụkwa onye na-agba mbo."

"Ọ sị na ya chọrọ ka ya kwụdosịa ike,na mbụ ka ọ mara ihe ọ chọrọ ịbụ.

"Nwayọọ nwayọọ ihe ndị ọ na-atụ anya ime na-abịa na mmezu."

"Anyị na ya rụkọrọ nwa mgbe nta mana n'ime oge ahụ, o gosipụtara ihe were anya.

Ụmụ Naijiria na ndị nọ mba ofesi maara na o nwere onye dịka ya rụrụ ebe a."

Kirie ihe o kwuru n'uju n'ihe onyonyo so akụkọ a:

Ihe ndị Somtochukwu na-ele anya ime

Ihe ọzọ ọ rụtụrụ aka bụ "na ya chọrọ kama ị na-akwụ ụgwọ ụlọ etu a, na ya chọrọ ibido'mortgage' na-akwụzị ụgwọ obere obere, nwee ọnụụlọ nke aka ya."

Somtochukwu Maduagwu, onye ntaakụkọ 'Arịse TV' amalitela njem ikpeazu ya
Nna Somtochukwu, bụ Engr Ifeanyi Maduagwu, nne, ya Nwanne ya nwoke nakwa nwanne ya nwaanyị n'ụka ọnwụ e hiwere ya na nnukwu ụlọụka 'Corpus Christi Cathedral, Pọtakọt  ụbọchị Wenezde, abalị 15 nke ọnwa Oktọba afọ 2025
Nkọwa foto, Nna Somtochukwu, bụ Engr Ifeanyi Maduagwu, nne, ya Nwanne ya nwoke nakwa nwanne ya nwaanyị n'ụka ọnwụ e hiwere ya na nnukwu ụlọụka 'Corpus Christi Cathedral, Pọtakọt ụbọchị Wenezde, abalị 15 nke ọnwa Oktọba afọ 2025

A ghaa ọka, o koro n'elu dịka igwe mmadụ dịka igwurube si ebe dị iche iche gbakọrọ n'ụlọụka Corpus Christi Cathedral dị na Pọtakọt na mgbede taa bụ Wenezde maka ụka abụ iji kwanyere onye ntaakụkọ Arise TV lara mụọ na nsonso a bụ Somtochulwu Maduagwụ ugwu ikpeazu.

Nwada Maduagwu nwụrụ na mberede n'abalị nke ọnwa September dịka ndị ekperima wakporo ebe o bi n'Abuja.

N'ozi ya n'emume ahụ, ụkọchukwu duru n'ofufe nro ahụ bụ Rev Fr Charles Ezeunara, gbadoro ụkwụ n'Akwụkwọ Nso; Timothy 67 na Mathew 16:26, jụọ ndị gbakọrọ ihe mere na agbanyeghị na ndị mmadụ ma maka ọnwụ, ha na-etinye uche rinne n'akụ nke ụwa.

"Na-agbanyeghị na m ahụbeghị ọnwụ. Amaghị m ma ọ dị mma maọbụ ọ dị njọ. Otu ihe were m anya bụ na onye ọbụla ga-anwụ anwụ."

Igwe mmadụ bịara ụka ọnwụ Sommie Maduagwu na Pọtakọt 15/10/2025
Nkọwa foto, Igwe mmadụ bịara ụka ọnwụ Sommie Maduagwu na Pọtakọt 15/10/2025
Igwe mmadụ bịara ụka ọnwụ Sommie Maduagwu na Pọtakọt 15/10/2025

Kedụ onye bụ Somtochukwu mmaduagwu?

Somtochukwu Maduagwu

Ebe foto si, Arise TV

Onye bụ Somtochukwu Maduagwu?

Somtochukwu bụ onye ntaakụkọ n'ụlọọrụ mgbasaozi 'Arise TV.

A mụrụ ya na mba Briten mana ọ gara akwụkwọ Praịmarị na Sekọndịrị ya na Pọtakọt bụ ebe ọ nọrọ too.

Ọ gara mahadum na mba Briten bụ ebe ọ gụrụ agụmagụ iwu.

Ọ laghachitere na Naijiria bịa fee ala nna ya n'atụmatụ NYSC.

N'afọ 2023, o sonyere n'asọmpi elelewe eje ọrụ n'okwu njem nlegharịanya nke Bekee kpọrọ 'Miss Tourism' bụ ebe o nwetara nzere Osote onye mbụ.

Ọ rụrụ ọrụ dịka ọkaiwu nwa mgbe nta tupu ọ rụwa ọrụ dịka onye mgbasaozi na n'ụlọrụ ntakụkọ Arise TV bụ ebe ọ na-arụ tupu ọ nwụọ n'abalị 29 nke ọnwa Septemba afọ 2025.