Amaghị m na m ga-edinwu ọnwụ nwunye m - Cosmas Maduka
- Onye dere ya, Uzoamaka Ewuzie
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Ebeg o si, Legọs
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Ebeg o si, Legọs
Cosmas Maduka bụ onye oji ego achụ nta ego a ma ama na Naịjirịa nwee ụlọọrụ na-azụ ahịa ụgbọala na bụ nke a mara dịka Coscharis Motors.
Maduka bụ onye nwunye ya hapụgoro ụwa kwuru na ngwụcha afọ a ga-eme ya afọ ise nwunye nwụrụ mana ọ lụbeghị nwaanyị ọzọ.
O kwuru na ndị mmadụ ga na-ekwu na ọ gịnị mere na ọ lụbeghị nwaanyị ọzọ.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Ebe foto si, Cosmas Maduka/Instagram
Ebe foto si, Cosmas Maduka/Instagram
Dịka o siri kwuo: "Alụrụ m nwunye m mgbe m dị afọ iri na itoolu na ọnwa itoolu. Aga m eme afọ iri abụọ n'ọnwa Desimba 1978 mana mụ na nwunye m gbara akwụkwọ n'ọnwa Sepụtemba 1978."
Ọ gara n'ihu kwuo na ya: "A matara nwunye m n'ụlọụka. Ọ bụ nwaagbọghọ mara ihe nke ukwuu ma nwee ọgụgụisi. Ọ bụ nwaanyị anaghị atụ egwu. Ị ga-ahụ na obi siri ya ike dịka ọdụm. Mana ọ chịa ọchị, anya ya na-egbuke egbuke. Ị ga-ahụ kpakpando n'anya ya."
Ọ kọwara ihe mere na ọ lụbeghị nwaanyị ọzọ kemgbe nwunye ya nwụrụ.