City Boy Movement: Ihe anyị ma maka ihe kpọtụrụ n'ọgbakọ ọha otu a hiwere n'Owere
Ebe foto si, Screengrab
Ndị uweojii Imo steeti ekwuola na o nweghị onye merụrụ ahụ n'ọgbaghara dapụtara n'ọgbakọ ọha nke otu 'City Boy Movement' mere n'Owere, isiobodo Imo Steeti.
Otu 'City Boy Movement', bụ otu na-akwado Onyeisiala Bola Tinubu maka ịzọ ọkwa Onyeisiala ọzọ n'afọ 2027, hiwere ọgbakọ ọha n'Owere n’ụbọchị Satode 14 Maachị 2026.
Mana ọgbaghara dapụtara dịka igwe mmadụ wujuru n'ogige 'Ndubuisi Kanu Square' dị n'Owere malitere ịzọ ego na ngwa e ji enyere ndụ aka otu CBM chọrọ ike ndị nkwado ha nke gụnyere akpa osikapa, igwe e ji akwa akwa, igbe njụoyi na ihe dị ọzọ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye gwara BBC Igbo n'ekwentị sị, "O nweghị onye merụrụ ahụ."
"Anyị bụ ndị uweojii Imo Steeti gbaliri kwụsị ọnọdụ ọgbaghara ahụ."
Ọ gara n'ihu kwuo na o nweghị onye ha nwuchiri maka ihe mere n'ọgbakọ ọha ahụ.
Ihe ndị nọ ebe ihe mere kwuru
Ebe foto si, Screengrab
Ndị nọ ebe ihe mere gwara BBC Igbo na ọgbaghara ahụ dapụtara malite ebe elekere abụọ nke ehihie dịka ụfọdụ ndị ntoroọbia bịara ọgbakọ ahụ malitere dọrịtawara ụka onye ga-eketa oke n'ihe a na-ekesa.
Otu onye ntaakụkọ bị n'Owere bụ Obinna Chineke gwara BBC na 'Ụfọdụ ndị ntoroọbịa malitere na-ekwu sị: "Ọ bụ ego Naịjirịa ka e ji zụọ ha, na ha so eketa ya."
"Tupu ị mara ihe na-eme ha bilie malite zọwa ihe a na-eke, ọgụ were daa."
Akụkọ na-efegharị na soshal midịa na-ebo ebubo na ọ bụ ndị otu 'Village Boys' gara bute ọgbaghara n'ọgbakọ ahụ.
"E nweghị otu a na-akpọ Village Boys n'owere. Ọ bụ ndị ntorobia gbakọrọ n'ebe ahụ bụ ndị mere ya. Ọ bụladi ndị yi akwa 'City Boy Movement' so na-azọ ihe.
Ihe City Boy Movement kwuru maka ihe mere
Otu onye otu CBM kọwara na, "Ihe mere gosiri nnabata a nabatara otu 'City Boy Movement."
"Ọgbakọ enyemaka ahụ gara nke ọma . E kesaala ihe karịrị pasent 80 ngwa enyemaka a chọrọ ikesa tupu ndị eketaghị ejiri iwe wakpoo ndị ọrụ nche nọ n'ọnụụzọ e si abata n'ama ahụ."
O kwuru na ha kwadoro ikere mmadụ 5,000 ngwa enyemaka mana mmadụ 30,000 bịara nke mere o jiri sie ike ihe irute onye ọbụla.
"Anyị kwadoro inyere mmadụ 50000 aka. Maka na ọ bụ ọgbakọ iji kwado Onyeisiala, ihe karịrị mmadụ 30,000 si steeti dị iche iche bịara ya ịbịa nọnyere ndị CBM."
"Ka e mechara ọgbakọ ọha ahụ, a tụrụ anya na ndị ọzọ ga-alawa iji nye ohere ka ndị a chọrọ inyere aka nweta oke nkwado mana ọ meghị etu ahụ.
"Ya mere o siri ike ikesara mmadụ 5000 ihe, ebe ihe karịrị mmadụ 25000 ga-agbara aka laa."
Isi akụkọ
Kọwaara m isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available