"Ngwaaghịa m gbara ọkụ n'Onitsha Headbridge karịrị nde naịra iri abụọ na ise"
Ndị na-ere ahịa n'ọdọahịa akụrụngwa 'plumbing' dị n'Onitsha Headbridge Anambra Steeti akọwaala etu ngwaahịa ha siri laa n'iyi.
N'oge BBC Igbo gara n'ahịa ahụ, ndị a gwara arịrị etu ọkụ ahụ si metụta ha. Ha kwuru na ọ malitere ịgba n'oge ha niile emechichaala ahịa ma laa n'ụlọ ha n'abalị bọtara Satọde 21 Maachị 2026.
Otu onye kwuru na ngwaahịa ya karịrị nde naịra iri abụọ na ise gbara ọkụ, ebe onye ọzọ kwuru na ọ gaghị ekwuputanwu ego ole ya lara n'ọkụ ahụ.
Dịka ọ dị ugbua, amabeghi kpọmkwem ihe kpatara ọkụ ahụ mana Kọmishọna uweojii n'Anambra Steeti kwuru na ha na-eche na ọ bụ nnukwu okpomọkụ dị n'ebe e dosara akụrụngwa ndị nwere ikike ịbanye ọkụ a kpọrọ 'Inflamable materials' na Bekee.
Ndị a nwee ngwaahịa rịọrọ ka gọọmentị na ndị mmadụ gbatara ha ọsọ enyemaka.





