Etu mmefu ego Naịjirịa si rịaelu kemgbe ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu

Etu mmefu ego Naịjirịa si rịaelu kemgbe ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu

Kemgbe Onyeisiala Bola Tinubu banyere n'ọchịchị, lee etu mmefu ego nke afọ ọbụla si rịa-elu nakwa ihe atọ Naịjirịa kachasị mefuo ego na ya:

N'afọ 2023, Onyeisiala Tinubu tinyere mmefu ego mgbakwụnye ruru puku ijeri naịra abụọ na ụma (₦2.17 trillion).

Ihe atọ a kacha mefuo ego n'afọ ahụ gunyere:

* Nchekwa obodo

* Ego iti aka n'obi e kere ndị ihe na-esiriike

* Ịrụ ụzọ na akwammiri.

Na mmefu ego afọ 2024 ha kpọrọ mmefu ego nke nchekwube ọzọ ruru Puku ijeri naịra iri abụọ na asatọ na ụma (₦28.7).

Ihe atọ a kacha mefuo ego n'afọ ahụ gunyere:

* Nchekwa obodo

* Ọrụ mmepe obodo dịka ụzọ ụgbọoloko si Legọs gaa Kano steeti.

* Nakwa akụnụba.

N'afọ 2025 ka mmefu gbagoro Puku ijeri naịra iri ise na anọ na ụma (₦54.99 trillion).

Nchekwa, akụnụba na ọrụ mmepe obodo bụ ngalaba atọ kacha nwete ego n'afọ ahụ.

Mmefu ego Naịjirịa nke afọ 2026 bụbu puku ijieri naịra iri ise na asatọ na ụma (₦58.18 trillion) ka Onyeisiala Tinubu natara ikike ịgbakwụnye ego ọzọ ruru Puku ijeri naịra itoolu (N9 trillion naira) ka ọ bụrụ puku ijeri naịra iri isii na asatọ na ụma (N68.3 trillion).

Ajụjụ anyị bụ, kedụ ebe Onyeisiala Tinubu ga-esi enweta ego ndịa ọ chọrọ imefu nakwa etu ọ ga-esi emetụta onye ọbụla?

Onye ma nke ekwe na-akụ n'ihe gbasara akụnụba bụ Desmond Echeta, ọkammụta akụnaụba kwuru na onyeisiala Bola Tinubu nwereike inwete ego site n'ụzọ abụọ:

* Nke mbụ bụ ịgbazite ego

* Maọbụ n'ego na-amanye n'ego ole a na-ere mmanụ agbịdị ugbua bụ nke karịrị ego atụrụ n'uche n'akwụkwọ mmefu na mkpata nke afọ 2026.