Ọnụahịa mmanụ ụgbọala arịala ọzọ n'Enugwu steeti

Ebe foto si, Getty Images and BBC

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala arịala ọzọ n'Enugwu steeti dịka a na-ere otu lita mmanụ N1400.

Ndị ọkwọ ụgbọala, ndị njem nakwa ndị ji ya bụ mmanụ arụ ọrụ nọ na-ata ịkikirị eze ugbua.

Ọtụtụ ebe a na-ere mmanụ ụgbọala BBC Igbo gara mee nyocha n'ime Enugwu steeti gosiri na ha na-ere ya N1,400 maka otu lịta.

Ọtụtụ ndị mmadụ na ụgbọala amalitela ịkwụ n'ahịrị n'ihi mbuli ọnụego mmanụ ụgbọala na Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Ndị mmadụ na ụgbọala amalitela ịkwụ n'ahịrị n'ọtụtụ ọdọmmanụ ụgbọala na Naịjirịa dịka a na-ere mmanụ ụgbọala ihe karịrị otu puku naịra kwa otu lita.

Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-achọ ọdọmmanụ ụgbọala ebe a na-ere ya ọnụala.

Ụfọdụ steeti na obodo ebe a ndị mmadụ na ụgbọala na-akwụ n'ahịrị ugbua gụnyere Legọs, Abuja nakwa ebe ndị ọzọ.

Ọtụtụ ebe ndị na-ere mmanụ ụgbọala na-ere malite n'ọnụego narị itoolu na iri ise gafee otu puku naịra.

Ihe butere mbuli ọnụego mmanụ ụgbọala a bụ maka ọgụ na-aga n'ihu n'etiti mba Amerịka/Izrel na mba Ịran.

Nke a mere ka ọnụego mmanụ agbidi n'ụwa gafee dọla iri asatọ ($80) kwa otu barelụ mmanụ.

Ụlọọrụ na-esipụta mmanụ ụgbọala na Naịjirịa bụ Dangote Petroleum Refinery & Petrochemicals nọọrọ n'ụbọchị Tuzde bulie ọnụego ha na-ere mmanụ ụgbọala site na narị naịra asaa na iri asaa na anọ (N774) gawa narị narị naịra asatọ na iri asaa na anọ (N874) kwa otu lita.

Etu agha Amerịka na Izrel na-ebuso Ịran si emetụta ọnụahịa mmanụ ụgbọala na Naịjirịa

Kemgbe mba Amerịka na Izrel bidoro ibuso ndị Ịran agha, akụnaụba mbaụwa bidoro na-agbanwe ọkachasị ọnụahịa mmanụ ụgbọala.

Na Naịjịrịa, ọnụahịa mmanụ ụgbọala bidoro na-arị elu. Nke a bidoro igosipụta n'ihe dịka abalị nke ise maọbụ asaa agha Amerịka na Izrel na-ebuso mba Ịran malitere.

N'ime akụkọ a, ụlọmgbasaozi BBC News Igbo nnyochara ọnụahịa mmanụ ụgbọala na steeti dị iche iche na Naịjirịa ugbu a nakwa etu o si arị elu.

Ọnụahịa mmanụ ụgbọala arịala n'Enugwu mana ọ dịghị ụkọ

N'Enugwu steeti, ọnụahịa a na-ere mmanụ ụgbọala tinyere ego ugbua. Nke a bidoro n'abalị garaaga na mpaghara dị iche iche na steeti ahụ.

BBC News Igbo gara n'ebe a na-ere mmanụ ụgbọala n'ebe Independence layout nakwa Ogui ma chọpụta na ha na-erezị mmanụ ụgbọala narị naịra itoolu na iri asatọ (N980) maọbụ narị naịra itoolu na iri asaaa (N970).

N'oge akụkọ a na-apụta, enweghị ihe dịka ụkọ mmanụ ụgbọala n'Enugwu Steeti.

Ka ọnụahịa mmanụ ụgbọala dị na Riva steeti ugbua

Nnyocha BBC News Igbo mere na Riva steeti gosiri na oge gara aga, na a na-ere mmanụ ụgbọala na steeti ahụ ihe dịka narị naịra asatọ na iri isii na anọ na ụma (N864.9).

Mana ihe a na-ere ya ugbua bụ narị naịra itoolu na iri anọ na itoolu na ụma (N949.9).

Ihe dị iche bụ na ego manyere n'elu ya bụ narị iri asatọ na ise (N85).

Mpaghara ebe anyị mere nnyocha gụnyere n'ebe a na-ere mmanụ ụgbọala na Pọtakọt ọkachasị mpaghara ebe a na-akpọ Station Road.

Ka ọnụahịa mmanụ ụgbọala dị na Kano Steeti

Na Kano steeti, BBC News Igbo chọpụtara na a na-erebu mmanụ ụgbọala ọnụahịa narị naịra asatọ na iri asatọ mana ugbua, a na-erezi ya ọnụahịa narị naịra itoolu na iri asatọ.

Nke a, gosiri na ọnụahịa mmanụ ụgbọala tinyere otu narị naịra na steeti ahụ.