Lee ihe Onyeisiala Bola Tinubu kwuru na nnukwu ọgbakọ APC
Ebe foto si, Nigeria Presidency
Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu ekwela nkwa ịhụ na gọọmenti rụụrụ ndị Naịjirịa ọrụ ma weta ezi ọganihu nye ụmụafọ Naịjirịa ọbụla.
Onyeisiala Tinubu kwuru nke a na nnukwu ọgbakọ pati ya bụ All Progressives Congress mere n'ogige Eagle Square dị n'Abuja n'ụbọchị Fraịde 27 Maachị, 2026.
O ji ohere ọgbakọ ahụ kpọọ oku ka ndị otu APC jikọọ aka ọnu ma kwalite ebumnobi 'Renewed Hope Agenda' ha iji hụ maka ọdị mma Naịjirịa.
N'okwu ya "Ọchịchị m maara na ọtụtụ ihe adịghị etu o kwesiri ugbua, mana aga m agba mbọ hụ na ntụkwasiobi ụmụafọ Naịjirịa nwere na pati anyị nakwa gọọmenti anyị, abụghị ihe efu".
Onyeisiala Tinubu gara n'ihu rụtụsịa aka n'ihe ụfọdụ nakwa ọtụtụ mbọ ọchịchị ya na-agba ime ka Naịjirịa bụrụ mba e ji ama atụ.
Ebe foto si, Nigeria Presidency
Onyeisiala Bola Tinubu kwuru na ọtụtụ mbọ gọọmenti ya na-agba na-amịta mkpụrụ maka ezi nkwado na ntụkwasị obi ndị Naịjirịa nwere na pati APC
O kwuru na gọọmenti ya nakwa pati ya kwụrụ chịm ibu agha megide ụfọdụ nsogbu na-echere Naịjirịa aka Dịka enweghị ọkụ latrik, enweghị ezi nchekwa nakwa ndị ọzọ dika ibe ya.
Ọ kwukwara na pati APC enweghị atụmatụ imachi pati ndị ọzọ ma kwuo na APC bụ pati nwere ezi nkwenye n'ọchịchị onyekwuouche ya.
Banyere ndị ntorobịa, Onyeisiala Tinubu kwuru na ọchịchị ya bu ndi ntorobịa n'obi maka na ọ bụ ha ka ọganihu Naịjirịa dị n'aka.
A bịa n'akụnaụba obodo, Onyeisiala Tinubu kwuru na ụfọdụ mbọ gọọmenti ya na-agba n'ihe gbasara nrụpụta, idozi ọnọdụ akụnaụba nakwa nnabata ndị ụlọọrụ dị iche iche chọrọ ịzụahịa na Naịjirịa na-amịta ezi mkpụrụ n'agbanyeghị etu ọnọdụ akụnaụba mbaụwa dị ugbua.
O gara n'ihu kwuo na ọchịchị ya ga-enye ụmụnwaanyị ohere isonye n'ihe a na-eme ọkachasị isonye n'ịmepụta iwu.
Ndịisi ọhụrụ APC a họpụtara
Pati APC nọrọ n'ọgbakọ ahụ họpụta ndịiisi otu kọmiiti NWC ha. A họpụtara Nentawe Yilwatda dịka onyeisioche APC ebe a họpụtara Surajudeen Basiru dịka odeakwụkwọ pati ahụ.
Ndị ọzọ a họpụtara bụ Felix Morka dịka ọnụ na-ekwuru APC ebe Dayo Israel bụ onyeisi ndị ntorobịa.
Yilwatda kọwara nhọpụta ya dịka ohere ọzọ iji rụọrọ pati ya ọrụ ma kelekwaa pati APC maka ohere ha nyere ya.
N'okwu ya "Adị m njikere ịrụ ọrụ ịkwalite pati anyị ma bụrụ ezi onyendu".
Ndị a họpụtara gụnyere:
- Ọkammụta Nentawe Yilwatda - Onyeisioche
- Ali Bukar Dalori – Osote onyeisioche Nọt
- Benjamin Obi Nwoye - Osote onyeisioche Saụt
- Sinetọ Surajudeen Ajibola Basiru – Odeakwụkwọ
- Ọkammụta AbdulKarim Abubakar Kana – Osote odeakwụkwọ
- Murtala Aliyu Kankia – Onye ndụmọdụ ikpe
- Uguru Mathew Ofoke – Onye na-ahụ maka ego
- Amb. Haruna Ginsau – Odeakwụkwọ ego
- Muhammad Sulaiman Argungu, OFR – Odeakwụkwọ nhazi
- Ọkaiwu Emeka Okafor – Osote odeakwụkwọ nhazi
- Donatus Enyinnah Nwankpa – Odeakwụkwọ Welfare
- Christopher Michael Akpan – Osote odeakwụkwọ Welfare
- Felix Morka – Onyeisi mgbasaozi
- Meseko Durosinmi Josiah – Osote onyeisi mgbasaozi
- Mary A. Idele – Onyeisi ụmụnwaanyị
- Zainab Abubakar Ibrahim – Osote onyeisi ụmụnwaanyị
- Dayo Israel – Onyeisi ndị ntorobịa
- Aare Durotolu Oyebode Bankole – Onyeisi ndị nwere nkwarụ
- Hammam Adamu Ali Kumo – Osote odeakwụkwọ ego
Ndị ọzọ sonyere n'ọgbakọ ahụ gụnyere osote Onyeisiala bụ Kashim Shettima, Aminu Bello Masari, Benjamin Kalu, ọtụtụ gọvanọ steeti bụ ndị otu APC, Sinetọ Anyim Pius Anyim, ndị ụlọomeiwu nakwa ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na pati APC.
Kedụ uru nnukwu ọgbakọ APC na-ahazi n'Abuja?
Pati All Progressives Congress (APC) ga-anọrọ n'ụbọchị Satọde 28 Maachị, 2026, chịkọba nnukwu ọgbakọ 'National Convention' ha ebe ha ga-anọ họpụta ndịisi dị iche iche ga-ahụ maka ọganihu pati ha n'ọdịnịhu.
Akụkọ kwuru na ndị nnọchiteanya pati APC Bekee kpọrọ 'delegates' ruru 8,433 gụnyere Onyeisiala Bola Tinubu, ndị isi ọrụ na gọvanọ steeti 31, ga-esonye n'ọgbakọ ahụ a ga-eme n'ogige Eagle Square dị n'Abuja.
Ndịisi pati APC ọhụrụ a họpụtara na steeti dị iche iche nakwa n'okpuru ọchịchị ga-esonye n'ọgbakọ ahụ ebe a ga-anọ họpụta ndị isi ọhụrụ nke pati ahụ.
Gịnị ka a ga-eme na nnukwu ọgbakọ a?
Mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi bụ Mohammed Idris gwara ndị ntaakụkọ ihe ụfọdụ a ga-eme n'ọgbakọ ahụ nakwa ihe ndị ọzọ a na-atụ anya ya.
Idris kwuru na dịka onyeisi kọmiiti na-ahụ maka mgbasaozi maka nnukwu ọgbakọ, ihe niile a ga-eji mee ọgbakọ ahụ adịla njikere ma kpọọ oku ka ndị 'delegate' niile ga-esonye n'ọgbakọ ahụ ka ha rụkọọ ọrụ ọnụ iji hụ na ọgbakọ ahụ gara nke ọma.
Ọ kọwara ọgbakọ ahụ dịka ezi ohere nye APC iji wụlite ọnọdụ ha dịka otu ndọrọndọrọ ọchịchị kara aka na Naịjirịa ma kwe nkwa na a ga-eme ọgbakọ ahụ n'ụzọ iwu pati APC kwadoro iji hụ na e nwere ezi agamnihu na pati ha.
Akụkọ kwuru na a ga-eji usoro 'consensus approach' mee nhọpụta ndịisi patị APC n'ọgbakọ ahụ.
Mary Ikoku bụ otu onye so na ndị na-ahazị ọgbakọ ahụ, kwuru na e kpebibeghị etu APC ga-esi họpụta ndị ga-azọ ọkwa dị iche iche na ntuliaka ime ụlọ ha ga-eme ma kọwaa na ihe dị iche nwereike ịdị na ya.
Nnukwu ọgbakọ a bụ ebe pati APC ga-anọ họpụta ndị ga-anọ n'isi pati ha maka ntuliaka a ga-eme n'afọ 2027.
Ọ bụ ndịisi a ga-ahọpụta, ga-ahazi ntuliaka ime ụlọ APC iji họpụta ndị ga-eji ọkọlọtọ APC zọọ ọkwa Onyeisiala, ọkwa Gọvanọ, ọkwa ụlọomeiwu steeti nakwa ọkwa ụlọomeiwu ukwu Sineti nakwa ụlọnnọchiteanya bekee kpọrọ 'House of Representative'.
Nke a bụ ugboro asatọ pati APC na-eme nnukwu ọgbakọ a kemgbe afọ 2013.
Onyeisi na-ahụ maka mgbasaozi pati APC bụ Mallam Bala Ibrahim kwuru na ọgbakọ a ga-elebanye anya na ya gụnyere ilebanye anya n'iwu ha.
"Anyị ga-eme nnyocha iji chọpụta ụfọdụ nsogbu anyị nwere n'oge gara aga nakwa etu anyị ga-esi gbochie ụdịrị nsogbu dị etu a n'ọdịnihu", ka Ibrahim gwara BBC.
O kwukwara na ha ga-elebanyekwa anya na nsogbu ndị ahụ na-echere ha aka ruo ugbua nakwa etu ha ga-esi rụọ ọrụ iji megide ụfọdụ nsogbu na ihe ndị ọzọ na-echere ụmụafọ Naịjirịa aka mgba.
Kedụ ndị na-asọ ọkwa n'ọgbakọ a?
Pati APC ekwuola na ọ bụ onye si mpaghara ndịda Naịjirịa ga-azọrọ ha ọkwa Onyeisiala n'afọ 2027.
Dịka usoro pati ha siri dị, onyeisioche pati ha ga-esi mpaghara ugwu Naịjirịa.
Kọmiiti pati APC na-eme nnyocha enyochaala Yilwatda Nentawe ka ọ zọọ ọkwa onyeisi pati ha.
Akụkọ na-ekwu na odeakwụkwọ gọọmenti Naịjirịa bụ George Akume na Tanko Almakura bụbu Gọvanọ Nasarawa Steeti sokwa na ndị na-azọ ọkwa onyeisioche pati APC.
Onye ọbụla a họpụtara dịka onyeisioche APC, ga-eji ọkwa ahụ ruo afọ anọ ma ọ bụrụ na onye enweghị nsogbu ọbụla dapụtara.
Etu APC si nweta mmeri na ntuliaka 2015
APC bụ otu pati ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa ọnụ siri ike.
Ọ bụ ha ji ọkwa na steeti 32 n'ime steeti 36 dị na Naịjirịa taa.
Ọtụtu Gọvanọ steeti dị iche iche hapụrụ pati ma banye APC n'ime afọ 2025 na 2026.
Gọvanọ ikpeazụ banyere APC bụ Gọvanọ Dauda Lawal na-achị Zamfara steeti. Ọ hapụrụ pati PDP banye APC.
N'aka nke ọzọ, ọtụtụ ndị omeiwu nakwa ndị ụlọ nnoọchiteanya nọkwa na pati APC nke na-enyere ha aka ịhụ na akwụkwọ iwu ọbụla bara n'iwu.
Ndị bụbu ndịisioche pati APC
- Chief Bisi Akande - (2013–2014).
- Chief John Odigie-Oyegun - (2014- 2018)
- Comrade Adams Oshiomhole - (2018 - 2020)
- Mai Mala Buni - (2020-2022)
- Abdullahi Adamu (2022 - 2023)
- Abdullahi Ganduje - (2023 - 2025)
- Professor Yilwatda Nentawe (2025 ruo ugbua)
Isi akụkọ
Kọwaara m isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available