Ụbọchị ise kachasị mkpa n'oge obubu ọnụ 'lent' na uru ha bara
Mmemme 'lent' bụ oge ndị ụka Kraist ji ebu ọnụ, na-ekpe ekpere mkpụrụ ụbọchị iri anọ tupu e mee emume 'Easter'.
Ihe mbụ e ji amalite oge 'lent' bụ Ash Wednesday, oge ahụ ka a na-egbu ntụ n’ihu iji cheta na mmadụ bụ aja na ọ bụkwa n'aja ka mmadụ ga-ala.
Malite ụbọchị Ash wednesday rue ụbọchị iri anọ, ka a na-ebu ọnụ na-ekpe ekpere dịka Jịsọs Kraịst siri mee ya n'oge ọ nọ n’ụwa.
Ọ kụrụ ọnụ n'ụbọchị iri anọ, e mee mmemme ụka nkwụ bụ 'Palm Sunday'.
Ụka 'Palm Sunday' bu oge Jisọs Kraịst si n'ọzara banye na Jerusalem, ụmụnwaanyi Izrel na ndị na-eso ụzọ ya jiri ọmụ nkwụ na-atọ n’ala, na-eti "Hossanna kachasị elu”
Nke na-esote ụka nkwụ a bụ izuụka dị nsọ nwere 'Holy Thursday' bụ ụbọchi e ji agọzi mmanụ nsọ 'Chrism', saa ụmụ azị iri na abụọ ukwu ma cherezie nderi uchicho oge ndịagha ga-abịa kpụrụ Kraịst.
Ụbọchị 'Good Friday' dị mkpa nke ukwuu n’ihi na ọ bụ ụbọchi ahụ ka ndị Pharisee na ndị saducee kpara nkata kpụrụ Jịsọs Kraịst ma tinye n'aka Eze Pailate bụ onye mara ya ikpe ọnwụ, e wee kpọgide ya n’obe na Golgota.
Ụbọchị ụka 'Easter Sunday' bụ mmemme mbilite n’ọnwụ Jisọs Kraist. Ndị okpukperechi Kraist na-enwe aṅụri maka na Jisọs Kraịst si n'ọnwụ bilie.
Kirie nkọwa a n'uju: