Gịnị kpatara ngagharịiwe megidere ndị Igbo na Saụt Afrịka

Aha onyonyo, Gịnị kpatara ngagharịiwe megidere ndị Igbo na Saụt Afrịka
Gịnị kpatara ngagharịiwe megidere ndị Igbo na Saụt Afrịka
Ngagharịiwe emere na mba Saụt Afrịka o butere nsogbu?
Nkọwa foto, Ngagharịiwe emere na mba Saụt Afrịka o butere nsogbu?
    • Onye dere ya, Michael Ngene
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist

Akụkọ kwuru na ngagharịiwe dapụtara na mpaghara Eastern Cape mba Saụt Afrịka nke kpatara ka e mebie ọtụtụ ụlọahịa ma zuru ọtụtụ ngwaahịa dị n'ime ya, gbaa ụgbọala iri ọkụ ma mebikwaa ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

Ọtụtụ kwuru na ihe kpatara ngagharịiwe a bụ maka na e chiri Solomon Ogbonna Eziko echichi Igwe Ndigbo Na East London n'ụbọchị Satọde 14 Maachị 2026.

Ndịisi mpaghara ahụ nakwa otu ọdịnala a kpọrọ 'Eastern Cape House of Traditional and Khoi-San Leaders' katọrọ echichi ahụ kwuo na o megidere iwu na-achịkwa omenala ha.

Mana BBC chọpụtara na ọ bụ otu March and Match" nke Jacinta Zuma nọ n'isi ya na-achịkọba ngagharịiwe ahụ kwa ọnwa ọbụla iji kpọọ oku ka ndị ọchịchị lebanye anya n'iwu ọpụpụ na mbata bekee kpọrọ immigration laws mba Saụt Afrịka

Ngagharịiwe ahụ mere ka ọtụtụ ụlọahịa ndị Naịjirịa nakwa ndị si mba ọzọ mechie ogige ahịa ha ebe ndị uweojii ji mgbọ egbe rubber chụsasịa ndị ngagharịiwe ahụ.

Ụlọọrụ nnọchiteanya Naịjirịa na mba Saụt Afrịka katọrọ ngagharịiwe ahụ ma kpọọ oku ka ndị Naịjirịa nọ na Saụt Afrịka kpachara anya ugbua, ghara ịga ebe ọtụtụ mmadụ gbakọrọ, rube isi nye iwu obodo ma nọrọ n'ụlọ ha iji chekwaa onwe ha.

Olaniyi Abodedele bụ onyeisi ndị Naịjirịa bi na Gauteng, kpọrọ oku ka ụmụafọ Naịjirịa ghara itinye aka ha n'ihe ga-ebutere ha nsogbu ma hụ na ha nyeere aka chekwa ndị Naịjirịa ibe ha.

Akụwkwọozi Ọhaneze Ndigbo na mba Saụt Afrịka wepụtara nke onyeisi ha bụ ABC Okokohn binyere aka, kọwara ihe mere ha jiri chie Solomon Ogbonna Eziko "Igwe Ndigbo" na mpaghara ahụ ma kwuo na e nwere ihe dị iche n'echiche "ìgwè ndigbo' ahụ na-ese okwu na "echichi Igwe maọbụ "Eze obodo".

N'okwu ya "Echichi anyị chịrị abụghị eze obodo, kama ọ bụ onye nlekọta ndị Igbo bi na mpaghara ahụ na Saụt Afrịka.

"Enweghị oge anyị ji guzobe obodo, maọbụ wepụta ala ọbụla kpọọ ya 'ala Igbo na mba Saụt Afrịka".

"Anyị bụ ndị ọbịa na Saụt Afrịka. Ala nna anyị bụ ala Igbo, na Naịjirịa".

Ha kwuru na ọrụ Igwe Ndi Igbo ahụ bụ ịhụ maka ịdị n'otu ndị Igbo bi na Saụt Afrịka nakwa inyere aka na-akwalite omenala nakwa ọdịnala Igbo n'ebe ahụ.

Cheta na n'oge gara aga, ndị mba Saụt Afrịka akatọọla ma luso ndị Naịjirịa bi na mba Saụt Afrịka ọgụ ma sị ha hapụrụ ha mba ha.

Ọgụ ahụ nke a kpọrọ xenophobia metụtara ọtụtụ ndị Naịjirịa nakwa ụlọahịa ha ma bụrụkwa nke ọtụtụ mmadụ katọrọ dịka ihe dị njọ.

N'afọ 2025 ndị mba Gana mere ngagharịiwe banyere atụmatụ Eze Chukwudi Jude Ihenetu bụ Eze ndị Igbo na Gana ịrụ obodo ndị Igbo na mpaghara Old Ningo dị na mba ahụ.