Ọ bụ mmadụ iri na asatọ ga-achịpụ ya n'ịzọ ọkwa onyeisiala a na ntuliaka a ga-eme n'ụbọchị 25 Febụwarị 2023.
Mmadụ anọ ndị a (na-esoghi usoro ọbụla) bụ ndị kachasị gbapụta ihe na ya bụ ndọrọndọrọ, dịka ngụkọ dị icheiche e merela na Naịjirịa n'ọdị nso a si gosipụta.
Ha bụ: Bola Ahmed Tinubu nke 'All Progressives Congress' (APC); Atiku Abubakar nke 'Peoples Democratic Party' (PDP); Peter Obi nke 'Labour Party' (LP); na Rabiu Kwankwaso nke 'New Nigerian Peoples Party (NNPP).
Pịa aka n'ihe ngosi a ka ị mata ihe niile dị mkpa gbasara mmadụ anọ a n'otu n'otu nakwa nkwa ha na-ekwe Naịjirịa ma ọ bụrụ na ha merie ntuliaka ọkwa Onyeisiala.
Kedụ ndị nọ n'ọsọ ịchị Naịjirịa
Chọpụtakwuo ihe banyere ndị na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa
Họrọ otu onye ka ị mata maka ya
Bola Tinubu
All Progressives Congress (APC)
Afọ ole ọ dị: 70
Ọ gụrụ maka mgbakọ (Accounting) na mahadum Chicago
Ọ chịrị Legọs Steeti ugboro abụọ site na 1999 ruo 2007
Ọ nọchiri Legọs Westị n'ụlọomeiwu Sineti site n'afọ 1992-1993
Ọ gbara ezi mgbọrọgwụ na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa, nke a bụ mbụ ọ na-azọ ọkwa onyeisiala.
O so buo agha megide ọchịchị ndịagha.
O wulitere akụnaụba Legọs steeti ihe karịrị ugboro anọ site na N22.2b n'afọ 1999 gaa N220.0b n'afọ 2007.
Ọ rụrụ dịka onye nyocha ego a kpọrọ 'auditor' nakwa onye oji ego ụlọọrụ Mobil Producing Nigerian, otu n'ime ụlọọrụ na-emepụta mmanụ agbidi na Naịjirịa.
Ọ kwalitere mbupu ngwa ahịa na Naịjirịa ma belata ndabere na ntụbata ngwa ahịa.
O belatara enweghi ọrụ ndị ntoroọbịa n'ọkara n'ime afọ anọ ma kewapụta ọrụ ruru otu nde na ngalaba teknụzụ n'afọ abụọ.
O meziri ngala ikpe na Naịjirịa ma tinye uchu n'igbochi mpu ma kwalite ntukwasị obi ndị mmadụ n'ebe ndị ọrụ nchekwa nọ.
Atiku Abubakar
Peoples Democratic Party (PDP)
Afọ ole: 76
Osote Onyeisiala Naịjirịa site n'afọ 1999 ruo 2007
O nwere asambodo 'masters' na ngalaba 'International relations' site na mahadum Anglia Ruskin dị na Briten.
Ọ bụbụ onye ọrụ Kọstọm batara na ndọrọndọrọ ọchịchị na mbido afọ ndị 1980.
Ọ zọọla ọkwa onyeisiala ugboro ise ma o nwetaghi ya n'afọ 1993, 2007, 2011, 2015 na 2019.
Ọ hiwere 'American University' nke Naịjirịa bụ nke nyere ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị Chibok a tọhapụrụ agụmakwụkwọ n'efu.
Onye ojiegoachụntaego tinyere aka n'ahịa mmanụ agbidi, ọrụ ugbo, ụlọakụ na ngalaba mmepụta ọgwụ e ji agwọ ọrịa.
Nghọtaghie dị na etu o siri nyefee ụfọdụ ụlọọrụ gọọmentị n'aka ndị nkịtị.
Nye ndị nkịtị na-azụ ahịa ohere n'ime ọba azụmahịa nakwa akụnaụba Naịjirịa.
Kwalite ịdịnotu Naịjirịa site na inye mmadụ niile nọ Naịjirịa ohere nakwa ikpe kwụọtọ.
Hazigharịa etu e si kee ọchịchị na Naịjirịa.
Peter obi
Labour Party (LP)
Afọ ole: 60
Ọ chịrị dịka Gọvanọ Anambra Steetị ugboro abụọ site n'afọ 2007 ruo 2014.
Ọ zọrọ dịka osote Onyeisiala na ntuliaka afọ 2019.
Onye ojiegoachụntaego, gụrụ maka 'philosophy' na mahadum Naịjirịa dị na Nsukka.
Ọ hapụrụ iteego gbara ọkpụrụ nke ruru nde dọla 156 ($156m) n'ụlọụka oge ọ chịchara dịka gọvanọ.
O buuru Anambra site n'ogogo 26 gaa na mbụ kachasị eme ọfụma n'ule NECO nakwa WAEC na Naịjirịa.
O nwere ọtụtụ ụlọahịa bụ nke nyerela ọtụtụ puku mmadụ ọrụ.
Ịgba mbọ hụụ na eziokwu dị n'ọchịchị ya ma buokwa agha megide mpụ na nrụrụaka.
Ịkpọrọ Naịjirịa si na ndị oriri na mbubata ngwa ahịa gaa ndị na-emepụta ihe.
Wulite ma kwalite ndụ ndị mmadụ site n'itinye ego n'agụmakwụkwọ STEM, ahụike nakwa iwulite akụrụngwa e ji enyere ndụ aka.
Rabiu Kwankwaso
New Nigeria Peoples Party (NNPP)
Afọ ole: 66
Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa site n'afọ 2003 ruo 2007.
Gọvanọ chịrị Kano Steeti site n'afọ 1999 ruo 2003 nakwa na 2011 ruo 2015.
Ọ nọchitereanya ndị Madobi n'ụlọomeiwu nta n'afọ 1992 nakwa Sịnetọ nọchitereanya Kano Central site n'afọ 2015 ruo 2019.
Ọ bụ Dkt. na ngalaba civil engineering na mahadum Sharda dị n'India.
Ọ na-enye agụmakwụkwọ n'efu nakwara inyere ndụ ndị mmadụ aka.
Ọ kwalitere ọnụọgụgụ ụmụakwụkwọ nọ n'ogogo praịmarị site n'otu nde n'afọ 2011 ruo ihe karịrị nde atọ n'afọ 2015 oge ọ chịchara.
Nyere ndị gọọmentị steeti na okpuruọchịchị aka ịrụpụta ụlọọgwụ mbugharị iji hụ na onye niile bi n'ime kilomita atọ maọbụ ebe e ji ụkwụ aga nwereike inweta ọgwụgwọ.
Kwalite mmepụta ọgwụ dị icheicche na ọgwụ mgbchi na Naịjirịa.
Nchekwa
Mezie ma kwalite ụgwọọrụ ndị ọrụ nchekwa ma mepụta atụmatụ pụrụ iche maka inyere ezianaụlọ ndị agha meruru ahụ aka.
Kwalite ngwaagha, ngwaọrụ mgbasaozi na ngwa njem ndị agha.
Nye ọrụ, nye ọzụzụ ma kwalite ndị agha, ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ.
Kwụsị mwakpo ụlọọrụ gọọmentị kpam kpam.
Agụmakwụkwọ
Mepụta usoro nyocha ọhụrụ maka ikwalite ogo agụmakwụkwọ na nkuzi n'ụlọ agụmakwụkwọ dị icheiche malite na praịmarị ruo na mahadum.
Malite atụmatụ inye ụmụakwukwọ ego mbite.
Malite akpa ego maka agụmakwụkwọ nke ego gọọmetị etiti agaghị adaba n'ime ya.
Malite atụmatụ ga-ebute mmekọ na etiti anyị na ndị agbataobi anyị iji chekwa oke ala Naịjirịa dị na mpaghara Westị Afrịka nakwa nke etiti nakwa atụmadị na Nije, Chad na Kameruun.
Tinye ndị mmadụ n'ọrụ nchekwa gụnyere ndị agha, ndị uweojii na ọrụ nchekwa ndị ọọ ma zụọ, kwado ma tinye ego na ngalaba ahụ iji nyere ha aka ịrụ ọrụ ha ọsịsọ.
Agụmakwụkwọ
Tinye ego na ikwalite ọzụzụ maka akaọrụ, egwuregwu, azụmahịa, teknụzụ dị icheiche malite n'ụlọakwụkwọ praịmarị ruo na sekọndịrị.
Atụmatụ agụmakwụkwọ nke a kpọrọ "e nweghi nwata a ga-ahapụ"
Kwere ka ụlọọrụ ndị buru ibu jiri iịkwado ụlọakwụkwọ na-akwụ ụtụ isi ha ebe gọọmentị ga-enwe ụlọakwụkwọ ndị ahụ, na-ewepụta usoro agụmakwụkwọ ma na-ahazi ihe ndị ọzọ.
Were pasentị 14 ego dị na bọjetị tinye n'agụmakwụkwọ.
Mpụ
Rubere iwu gbasara mmefu ego isi.
Tinye ngalaba gọọmentị niile n'ime usoro nyocha kwamgbe kwamgbe
Kwụsi ebe niile ego si eripu na gọọmentị ma kwụsị ịkwụ ụgwọ mbelata ego mmanụ ụgbọala.
Kwụba aka ọtọ ma gosi ọha etu e si emefu ego gọọmentị.
New Nigeria People's Party
Isi sekpu ntị
Mepụa ọrụ site na itinye ego n'ọrụ ugbo
Kwụsị nsogbu nchekwa
Kwanyere iwu ugwu ma soro ụzọ dị siri werere
Akanaụba obodo
Buso mpụ agha na ngalaba gọọmentị niile ma bulite ebe e si enweta ego
Gbanwe usoro mkpata ego ma mee ka ọ bawanye ụba ma bụrụ ụzọ ga na-amụta ọtụtụ ego n'ọdịnihu.
Chuso usoro doro anya ma kwusie ike iji hazie ego a na-ere ego Bekee
Inye ọrụ
Belata enweghi ọrụ gaa otu dijit
Kwado ndị ntoroọbịa ka ha were ọru n'ọrụ ugbo
Kwado ndị nkịtị ka ha tinye ego na ihazigharị nri iji kepụta ọrụ
Ahụike
Gbanwee atụmatụ chekwa ahụike nke adịghị ama ama
Belata njem ofesi maka ahụike site na ịkwalite ụlọọgwụ, kwalite etu ndị ọtụ i eleta ndị ọrịa, ọzụzụ ndị ọrụ ahụike nakwa teknụzụ.
Welite ego a na-etinye n'ahụike na bọjetị
Nchekwa
Kwalite ngwaagha e ji eme nyocha achopụta nsogbu iji wulite ezi nchekwa
Gbasoo udo, mkpezi na idi na otu na Naịjirịa niile
Kwụba aka ọcha nye ndị ọha
Agụmakwụkwọ
Tinye ego zuru oke na ngalaba agụmakwụkwọ
Kwalite mahadum ndị dị ugbua tupe e kewapụta ndị ọhụrụ
Gbaa mbọ rụpụta ụlọ maka ụmụaka na-anaghị aga akwụkwọ ruru nde 20 na-akpagharị n'ogbe ugbua
Mpụ
Hazie ma kwalite ngalaba ndị na-ebuso mpụ agha
Chịa ọchịchị kwubara aka ọtọ ma gosi ọha ihe ha na-eme
Jiri teknụzụ gbochi mpụ
People's Democratic Party
Isi sekpu ntị
Nye ndị oji ego achụ ego ohere n'ime akụnaụba obodo
Chuso idi na otu site na nhọpụta gọọmentị ga-eme na mpaghara dị icheiche iji hụ na a gụnyere onye niile