You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Priest killing: Ụka Katọlik Enugwu ji ofufe nru pụrụiche ruo uju ụkọchukwu egburu egbu
Mmiri zoro n'Enugwu n'ụtụtụ Sọnde egbochighi ndị Katọliki ijupụta na n'ụlọọka 'Holy Ghost Cathedral' maka ụka iru uju ụkọchukwu Paul Offu ndị ụkọchukwu ndị ọzọ e gburu egbu.
Onyeisi ụka Katọlik n'Enugwu bụ Bishop Callistus Onaga bụ onye doro ụka a pụrụịche.
Ndị a na-eche na ha bụ ndị Fụlanị ọchịehi gbagburu Paul Offu n'ụbọchị Tọọzde nke mere ka ndị ukọchukwu ibe ya mee ngagharị iwe n'ụbọchị Fraidee.
N'okwuchukwu ya, Bishop Onaga gwara ndị ntoroọbịa ka ha bilie ma chekwaa gburugburu ha site n'aka ndị ogbu mmadụ kpọrọ onwe ha ndị ọchịehi.
Onaga gbarụkwara ihu kwuo na onweghi ihe gọọmentị na ndị uweojii na-eme iji kwụsị mkpamkpa a ndị ọchịehi na-akpa na Naịjirịa.
Narị kwụrụ narị ndị mmadụ gbakọrọ n'ụlọụka Holy Ghost Enugwu, jigaasị akwụkwọ e dere ihe na-egosi ka iwe si dị ha n'obi.
Ufọdụ ihe e dere na bekee gunyere" killer herdsmen must go", "our roads are no longer safe", "our villages are no longer safe", "enough is enough", dgz.
Lee foto otu ụka akwa ahụ sị ga:
Cheta na onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Mohammed Adamu nyere ndị otu ya iwu na Satọde, ka ha sie imi n'ala ma chọpụta ndị gburu ụkọchukwu Paul.
N'otu aka ahụ kwa, onyeisiala Muhammadu Buhari katọkwara ogbugbu ụkọchukwu ahụ ma kwee nkwa na ọchịchị ya ga-agba mbọ ịchekwa ndụ na akụnaụba mmadụ niile.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: